2017
Ọchị Nwere-ike Megharịa ihe nịịle.
January 2017


Ntorobia

Ọchị Nwere-ike Megharịa ihe niile.

Onye-isi-nduzi Uchtdorf chọpụtara ihe abụọ anyị kwesịrị ịnwe maka omume anyị niile: hụ Chineke n’anya na hụ mmadụ ibe anyị n’anya. Kama mgbe-ụfọdụ ọ naghị adịcha mfe ị hụ ndị-ọzọ n’anya. N’ime ndụ gị, enwere ike nwe ụfọdụ oge mgbe ọ n’esiri gị ike mmekọrịta gị na ndị-ọzọ—ikekwe otu-onye emerugo gị ahụ ma-ọbụ ị maghị ịkparịta-ụka ma-ọbụ ị ghọta ndị mmadụ. Mgbe ndị a, gbalia cheta ụdị ịhụn’anya ị nwetarala site n’aka ndị enyi, ezi-na-ụlọ, Nna nke Elu-igwe, na Jisus Kraịst. Cheta ọńụ ị nwere n’oge ndị ahụ ma gbalia tụgharịa-uche ma ọbụrụ na onye-ọbụla nwere ohere ịnweta ụdị ịhụn’anya ahụ. Cheta na onye-ọbụla bụ nwa-nwanyị ma-ọbụ nwa-nwoke nke Chineke ma kwesịrị ịnweta ịhụn’anya Ya na nke gị.

Chee-echiche nke otu-onye n’ime ndụ gị onye nke ihe adabaraghị gị na ya. Tinye ha n’ime ekpere gị ma kpọkuo Nna nke Elu-igwe ka O mepee obi gị ebe ha nọ. Ị ga-ebido mgbe adịghị anya n’ahụ ha dịka Ya: dịka otu na ime ụmụ Ya kwesịrị ịhụ n’anya.

Mgbe ị kpechara-ekpere, mere ha ihe dị nma! Ị nwere-ike kpọọ ha isoro na emume ọha ma-ọbụ isoro ndị-enyi pụọ. Kwado ịnye-aka ịrụ ọrụ onwere ịrụ n’ụlọ. Nanị kwuo “ndewo” ma chịara ha ọchị. Ihe nta ndị a nwere ike ịgbanwe ihe dị ukwu … n’ime ndụ niile unu!

Bipụta