2017
E bu m n’obi nke Otu Enyem-aka
January 2017


Ozi nke Nkuzi ndi nleta ndinyom, Onwa Mbụ 2017

E bu m n’obi nke Otu Enyem-aka

Mụọ akwụkwọ ọzizi a site n’ekpere ma chọpụta ihe ị ga-akuzi.

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

E bu m n’obi Otu Enyem-aka bụ “ịkwado ndị-nwanyị maka ngọzi niile nke ndụ ebigh-ebi,” Linda K.Burton kwuru, Onye-isi-nduzi Zuru-ọha Otu Enyem-aka.1 Ọ bụ site na okwukwe, ezi-na-ụlọ, na enyem-aka ka anyị n’esoro eme “oke dị mkpa n’ime ọrụ ahụ.”2

Otu Enyem-aka “bụ ọrụ nke-anụ-arụ na nke mụọ,” Carole M.Stephens kwuru, Onye-ndụmọdụ mbụ n’ime Otu ndị-isi-nduzi Zuru-ọha nke Otu Enyem-aka. “Nke ahụ bụ ihe ndị-nwanyị mere n’ime oge nke Onye-nzọpụta,” ma nke ahụ bụ ihe anyị ga n’eme.”3

Dịka anyị n’ele nwanyị Samerịa na-ebe well, onye hapụrụ ite-mmiri ya wee gbapụ-ọsọ ịgwa ndị-ọzọ na Jisus bụ onye-amụma (lee Jọn 4:6-42), ma-ọbụ Phebe, onye nke jiri ọńụ gara ndị-ọzọ ozi n’ime ndụ ya niile (lee Ndi Rom 16:1-2), anyị n’ahụ atụ niile nke ndị-nwanyị n’ime ụbọchị nke Onye-nzọpụta ndị rụrụ ezi-ọrụ ịbikwute Kraịst. Ọ bụ Ya na-emepe ụzọ anyị nye ndụ ebigh-ebi (lee Jọn 3:16).

Dịka anyị n’ele ndị-mmalite ụmụnne anyị nwanyị n’ime Nauvoo, Illinois, ndị zukọtara n’ime ebe-obibi nke Sarah Kimball n’ime afọ 1842 ikee otu nke ha, anyị n’ahụ atụmatụ nke Chineke maka ịweta Otu Enyem-aka ma soro kwa ọkwa-nchụ-aja. Mgbe Eliza R. Snow dechara akwụkwọ-iwu, Onye-amụma Josef Smit nyochara ya. Ọ chọpụtara na Nzukọ-nsọ ezubeghị oke ma ọbụghị na ahaziri ndị-nwanyị. Ọ sịrị na Onye-nwe-anyị nabatara onyinye ha kama na-enwere ihe ka nma. “A ga m ahazi ndị-nwanyị na okpuru ọkwa-nchụ-aja na ụdị ihe-nlere-anya nke ọkwa-nchụ-aja,” o kwuru.4

“Otu Enyem-aka abụghị nanị otu nke ndị-nwanyị ọzọ n’agbalị ime ihe ọma n’ime ụwa. Ọ pụrụ iche. Ọ bụrụ ‘ihe ka nma’ maka ahaziri ya site na ikike ọkwa-nchụ-aja. Nhazi ya bụ nzọ-ụkwụ dị mkpa n’ime mkpughe nke ọrụ nke Chineke n’elu ụwa.”5

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere na Ozi

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:2-3, 10; 88:73; reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. Linda K.Burton, n’ime Sarah Jane Weaver,”Otu Enyem-aka n’enwe ańụrị ọmụmụ ha na ihe ndị-ọzọ ọnwa atọ17, “Akụkọ Nzukọ-nsọ, Ọnwa atọ, 13,2015, news.lds.org

  2. Linda K.Burton, n’ime Weaver,”Otu Enyem-aka nenwe ańụrị maka ọmụmụ ha.”

  3. Carole M.Stephens, n’ime Weaver, “Otu Enyem-aka n’enweańụrị maka ọmụmụ ha.”

  4. Josef Fielding Smith, n’ime Daughters in My Kingdom: Akụkọ ochie na ọrụ nke otu-Enyem-aka (2011), 11–12.

  5. Ụmụ Ada na Alaeze M 16.

Bipụta