2017
ịtụba na-etiti
January 2017


Ozi nke Otu Ndi-Ịsi Nduzi Mbụ, nke ọnwa January 2017

Ịtụba na-etiti

Oge-adịghị-anya, elere m ebe otu nke ndị-mmadụ n’amụ ịkwa-nka nke ịgba-ụta. Nanị site na-ileanya, odoro m anya na ọbụrụ na ịchọrọ ịmụta akụ na ụta nke-ọma, ọ n’ewere oge na omume.

Echeghị m na inwere ike ịbụ onye-ama-ama maka ịgba akụ na ụta site na-ịgba akụ ebe onweghị ihe nọ na ya ma mgbe ahụ seebe ihe niile gburu-gburu akụ niile. Ị ga-amụta omume nke ịchọta ihe ịga-agba ma gbata ya.

Isepụta ihe ndị ịchọrọ ịgbata

I buru-ụzọ gbaa ma bido isee ihe ịchọrọ ịgba nwere ike ịbụ iberibe, kama mgbe ụfọdụ anyị n’onwe anyị n’akpa ụdị agwa ahụ n’ime ọnọdụ dị iche-iche ndị-ọzọ nke ndụ.

Dịka ndị-otu Nzukọ-nsọ, anyị nwere ọchịchọ nke itinye onwe-anyị n’ime usoro-atụmatụ niile ozi-ọma, okwu niile, na ozizi niile dị mmasị, mkpa, ma-ọbụ nwee ọńụ nye anyị. Anyị n’enwe ọnwụnwa isee ihe niile gburu-gburu ha, n’eme ka anyị kwere na anyị n’atụba n’etiti nke oziọma.

Nke a dị mfe imee.

N’ime oge niile anyị anata ndụmọdụ na nkwalite mụọ dị oke-mma site na ndị-amụma nke Chineke. Anyị na-anata kwa ntụzi-aka na ịdo-anya site na mbipụta niile, akwụkwọ-aka niile, na akwụkwọ niile dị iche-iche nke Nzukọ-nsọ. Anyị nwere-ike họrọ n’egbughị-oge isi-okwu ozi-ọma anyị chọrọ, see ihe gburu-gburu ya, ma kweta na anyị achọtala etiti nke ozi-ọma.

Onye-nzọpụta n’edo anya

Nke a abụghị nsogbu dị na nanị ụbọchị nke anyị. Mgbe ochie, ndị ndu okpukpe-chi tufuru ezi oge ịdekọta, ịnye-ọkwa, na ịrụrịta-ụka iwu-nsọ kachasị mkpa n’ime imerime iwu-nsọ niile.

Otu ụbọchị otu nke ndị-ọmụmụ okpukpe-chi gbalịrị ịdọbata Onye-nzọpụta n’ime ogologo-arụmarụ-ụka ahụ. Ha gwara Ya ka Ọ bata n’ime okwu ọtụtụ ekwekọtaghị.

“Onye-nwe-anyị, “ha jụrụ ya, “olee iwu-nsọ kachasị n’ime iwu?”

“Ị ga-ewere obi gị niile, werekwa mkpụrụ obi gi niile, werekwa uche gị niile hụ Onye nwe gị Chineke gị n’anya.

“ Nke a bụ ịhe ukwu na ịhe mbụ enyere n’iwu.

Ịhe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dịka onwe gị”

“N’elu iwu-nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị-amụma niile bekwasịrị”1

Biko detuo okwu ikpeazụ: “N’elu iwu-nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị-amụma niile bekwasịrị.”

Onye-nzọpụta ezighị anyị nanị ihe anyị chọrọ ịgbata, kama O gosịkwara ebe akụ kwesịrị ịda.

Inweta ihe anyị chọrọ igbata

Dịka ndị-otu nke Nzukọ-nsọ, anyị gbara-ndụ iwekwasị onwe-anyị aha nke Jisus Kraịst. Ihe ọgbụgba-ndụ ahụ pụtara bụ ịghọta na anyị ga-agbalị ịmụta ihe gbasara Chineke, hụ Ya n’anya, mụba okwukwe anyị n’ime Ya, kwanyere Ya ugwu, ga ije n’ime ụzọ Ya, ma kwụrụsie-ike dịka ndị-aka-ebe nke Ya.

Ka anyị n’amụta karịa gbasara Chineke ma nwe mmetụta ịhụn’anya Ya nye anyị, anyị n’aghọta karịa na ịchụ-aja enweghị ọgwụgwụ nke Jisus Kraịst bụ onyinye ịgba-afa nke Chineke. Ma ịhụn’anya nke Chineke n’akwalite mụọ anyị isoro ụzọ nke ezi nchegharị, nke ga-eduba na ọrụ-ebube nke mgbaghara. Usoro nke a n’eme anyị ịnwe ịhụnanya na ọmiko karịa maka ndị gbara anyị gburu-gburu. Anyị ga-amụta ịhụ karịa ihe niile esere-ese. Anyị ga-eguzogide ọnwụnwa ahụ ịbo-ebubo-ihe-ọjọọ ma-ọbụ ịkpee ndị-ọzọ ikpe site na mmehie ha niile, amaghị-eme niile, mgbawa niile, ọnọdụ nzọrọ-nzọrọ niile, nkwere okpukpe-chi niile, ndị obodo niile, ma-ọbụ agwa anụ-arụ.

Anyị g’ahụ onye-ọbụla anyị zutere dịka nwa nke Nna anyị nke Elu-igwe— nwanne anyị nwoke ma-ọbụ nwanne anyị nwanyị.

Anyị ga-emeso ndị-ọzọ omume n’ime nghọta na ịhụn’anya—ọbụnadịghị ndị adịghị mfe ịhụ n’anya. Anyị g’esoro ndị na-eri-uju rie uju ma kasie ndị chọrọ nkasi-obi obi.2

Ma anyị g’achọpụta na ọdị mkpa ka anyị nwe oke-mgbu gbasara ezi oziọma ebu n’obi.

Iwu-nsọ abụọ ahụ dị ukwu bụ ihe ebu n’obi. N’elu iwu-nsọ abụọ ndị a ka iwu niile na ndị-amụma niile dabere.3 Dịka anyị nabatara nke a, ihe ọma ndị-ọzọ g’adaba nke ọma.

Ọ bụrụ na isi olile-anya anyị ,echiche niile, na mgbalị niile bụ ka anyị melie ịhụn’anya anyị maka Chineke nke Pụrụ-Ime Ihe niile ma nye ndị-ọzọ obi anyị, anyị nwere ike mara na anyị achọtala ezi ihe ebu n’obi ma n’achọ ịgbata ihe achọrọ—ịbụ ezi ndị na-eso-ụzọ nke Jisus Kraịst.

Bipụta