2017
Ịhụn’anya Zuruoke Na-achụpụ Egwu
May 2017


Ozi nke Otu Ndi-Isi Ndụzi Mbụ, Ọnwa ise 2016

Ịhụn’anya Zuruoke Na-achụpụ Egwu

Ka anyị leghara egwu anyị niile anya ma jiri ọńụ, ịdị umeala, olile-anya, na ezi-ntụkwasi-obi n’enweghị egwu bie ndụ na Onye-nwe-anyị nọnyeere anyị.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ n’anya, ezi-enyi niile, ụdị oghere-ọma na ọńụ ka ọ bụ izute dịka Nzukọ-nsọ gburu gburu ụwa jikọtara-ọnụ n’ime okwukwe anyị na ịhụnaanya nye Chineke na ụmụ Ya.

Ejupụtara m n’obi ekele pụrụ iche n’ihi onye-amụma anyị hụrụ n’anya, Thomas S. Monson nonyere anyị. Onye-isi-nduzi, anyị oge niile ga etinye n’ime obi anyị okwu gị niile nke nduzi, ndụmọdụ, na akọ-na-uche. Anyị hụrụ gị n’anya, Onye-isi-nduzi Monson ma anyị n’ekpere gị ekpere oge niile.

Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe nọọrọ na-eje ozi dịka onye-isi-nduzi stek dị n’ime Frankfurt, Germany, otu ezigbo nwanne nwanyị n’enweghị ańụrị bịakwutere m mgbe otu nzukọ nke stek anyị gwụchara.

“Ọ bụ na ọdịghị oke njọ?” ka o kwuru. “A ga-enwerịrị mmadụ anọ ma ọ bụ ise nọọrọ na ezigbo ụra mgbe ị naara enye okwu gị!”

Echere echiche n’ime nwa oge ma zaghachi, “O kwere m nghọta na ụra n’ime nzukọ-nsọ bụ otu n’ime ụra ndị kacha enye ihe na-ahụ”

Ezigbo nwunye m, Harriet, getere mkparịta ụka nkea ma emesia o siri na nke ahụ bụụrụ otu n’ime aziza kacha mma nke m nyeworo.

Nnukwu Mkpọte-n’ụra Ahụ

Afọ narị ole gara aga n’ime Elu-elu Amerika, iga-ije akpọrọ “Nnukwu Mkpọte n’ụra Ahụ” gbasara gafe n’akụkụ niile nke mba ahụ. Otu n’ime ihe ndị dị mkpa ejiri mee ya bụ ịkpọte n’ụra ndị mmadụ ndị dịrị ka ha na-arahụ ụra n’ihe gbasara okwu Chineke.

Ntoroọbịa Josef Smit nwetere mmetụta site n’ihe niile ọ nụtara n’aka ndị n’ekwusa ozi-ọma ndi bụụrụ ndị otu n’ime mkpọte n’ụra okpukpere-chi nkea. Ọ bụ otu n’ime ihe kpatara o jiri chọsie ike uche nke Onye-nwe-anyị n’ekpere nke onwe.

Ndị nkwusa ozi-ọma ndịa nwebuuru ụdị ngosipụta, agwa nkwusa ozi-ọma na-emetụ n’obi, ozi-ọma niile nke amaara maka ịdị arọ nke imesi-okwu ike ha maka iyi-egwu n’enwu-ọkụ nke ọkụ-ala-mụọ nke na-echere onye mmehie.1 Okwu ndịa niile anaghi atụ ndi mmadụ ụra—mana e nwere ike ha akpatala rịị nrọ na-eyi-egwu ole na ole. Ebumnuche na usoro ha dịịrị ka ọ bụ iyi ndi mmadụ egwu ibanye nzukọ-nsọ.

Egwu dịka Mmegharịanya

Site n’akụkọ ihe mere n’oge garaaga, egwu ka e jirila mee ihe ugboro ugboro dịka ụzọ ijị nweta ndi mmadu ka ha mee ihe. Ndi nne na nna ejịriwo ya mee ihe n’ebe ụmụ ha nọ, ndi isi ọrụ n’ebe ndi-ọrụ nọ, na ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ebe ndi na abianyere ha aka nọ.

Ndi ọkachamara n’ire ahịa ghọtara ike dị n’iyị egwu ma na-eji ya eme ihe ugboro ugboro. Nke a bu ihe mere na ụfọdụ ime-ka-ọha-mara dịka ha na ebu ozi enweghị obi abụọ nke na ọbụrụ na anyị jụ izụrụ nri ụtụtụ ma ọ bụ enweteghị egwuregwu video ọhụụ ma ọ bụ ekwe ntị fone, anyị ga-adaba n’ihe egwu nke ibi ndụ nke ọnọdụ nhuju-anya na-anwụ nanị onye na enweghị obi-ụtọ.

Anyị na-amụrị amụ na nke a ma na-eche na ọdịghị mgbe anyị ga-ada maka ụdị mmegharị-anya ahụ mana mgbe ụfọdụ anyị na-ada. Nke ka njọ oge ụfọdụ anyị na-eji usoro yiri ya na-eme ka ndi ọzọ mee ihe anyị chọrọ.

Ozi m nwere ebumn’uche abụọ taa: Nke mbụ bụ ịgba anyị ume icheba echiche ma tulee oke nke anyị ga-eji were iyi-egwu kwalite ndi ọzọ tinyekwara anyị n’onwe anyị. Nke abụọ bụ ịtụnye aro ụzọ ka mma.

Nsogbu dị n’iyi Egwu

Nke mbụ, ka anyi kwuo ihe gbasara nsogbu dị n’iyi-egwu. Emesia ihe niile, onye n’ime anyị n’ihi egwu enwebeghị mgbe o riri nrị dị mma, kedo eriri nchekwa dị n’oche, na-emegharị-ahụ karịa, chekwaa ego, ma ọbụ obụna chegharia na mmehie?

Ọ bụ ezi-okwu na egwu nwere ike nwee mmetụta siri ike n’ebe ihe niile anyi na-eme na akparam-agwa dị. Mana mmetụta ahụ na-adị nwa-oge ma ọ naghi emi-emi. Egwu anaghị enwekarị ike ịgbanwe obi anyi niile ma ọdịghị mgbe ọ ga-enwogharị anyi ịbụ ndi hụrụ ihe ziri ezi n’anya na ndi chọrọ irubere Nna nke Elu-igwe isi.

Ndi na-atụ egwu nwere ike ikwu na ime ihe ziri-ezi, mana ha anaghi enwe mmetụta ihe niile ziri ezi. Ha na-enwe mmetụta oge ụfọdụ enweghi enyem aka na enweghị obi-ụtọ, ọbụna iwe iwe Ka oge na-aga mmetụta niile ndia na eduba n’enweghi ntukwasị obi, ịgba-isi-akwara, ọbụladị nnupụ-isi.

N’enweghị ohere-oma, ụzọ ndụ na idu-odudu nke nduhie nkea abụghị nani ndi nke ụwa ka ọ dịịrị. Ọ na-ewute m ịnụ maka ndi-otu Nzukọ-nsọ nke na-eji ọchịchị nanị ga-ekwu na-eme ihe—ma ọ bụ n’ebe-obibi ha niile, n’ime okpụkpọ-oku ha na nzuko-nso niile n’ebe a na-arụ ọrụ, ma ọbụ na mmekọrịta ha na ndi ọzọ kwa ụbọchị.

Oge ụfọdụ, ndi mmadụ nwere ike kwutọọ ndi ji ike ha na-emegide ndi ha ka nke dị n’ime ndi ọzọ, mana ha enweghi ike ịhụ ya n’ime onwe ha niile. Ha na-achọ nkwekọrịta na iwu nke onwe ha, mana mgbe ndi ọzọ na esoghị iwu ndi ahụ na enweghị usoro, ụdị ndi na-abara ha mba n’okwu-ọnụ, mmeghị usoro, ha na-abara ha mba n’okwu-ọnụ, mmegide n’ime mụọ, ma mgbe ụfọdụ ọbụna n’anụ-ahụ.

Onye-nwe-anyị ekwuwo na “mgbe anyị … na-achị ọchịchị ntụzi-aka ma ọbụ ọchịchị nanị m ga-ekwu ma ọbụ a ga-emerịrị na mkpụrụ-obị nile nke ụmụ ụmụ mmadụ, n’ogo ọbụla nke n’ezighị ezi, … elu-igwe niile n’esere aka ha [ma] Mụọ nke Onye-nwe-anyị na-enwe mwute.”2

E nwere ike nwe oge ụfọdụ mgbe a ga-anwa anyị iche na ihe niile anyị na-eme dị mma site n’ikwere na nsọtụ ya ga-eme ka otu e siri mee bụrụ ihe ziri-ezi. Anyị nwere ike na-eche na ọbụna ịdị na-atụzi-aka, imegharị anya, na iji olu-ike ga-abụ maka ọdimma nke ndi ọzọ. Ọbụghị otu ahụ, n’ihi na Onye-nwe-anyi emewo ka ọ doo anya na “mkpụrụ nke Mụọ bụ ịhụn’anya, anurị, udo, ogologo ntachi-obi, ịdị nwayọ, ịdị mma, okwukwe, irube-isi n’ịdị nwayọ [na] imeru ihe n’oke.”3

Ụzọ ka Mma

Ka m na-abịa amata Nna m nke Eluigwe karịa, ana m ahụta otu o si na-akpalite mụọ ma na-edu ụmụ Ya. Iwe anaghị ewe Ya, Ọ naghị abọ-ọbọ, ma ọ bụ lụghachi ọgụ.4 Ebumnuche Ya dị mkpa—ọrụ Ya na otuto Ya—bụ idu anyị, ibuli anyị elu, ma duru anyị ruo n’uju Ya.5

Chineke kọwara onwe Ya nye Moses dịka “onye obi-ebere na onye-amara, ogologo ntachi obi, na uju nke ịdị mma na ezi-okwu.”6

Ịhụnaanya Nna anyị nke bi n’Eluigwe nwere n’ebe anyị bụ ụmụ nọ, karịrị n’ezie ihe anyị nwere ike ịghọta.7

Nke a ọ pụtara na Chineke na-akwado ma ọbụ na-elefere anya n’omume niile nke megidere iwu Ya niile? Ọdịghị, na-enweghị obi abụọ ọ dịghị otu ahụ!

Mana Ọ chọrọ ịgbanwe ihe karịrị nanị akparam agwa anyị niile. Ọ chọrọ ịgbanwe ọdịdị anyị niile. Ọ chọrọ ịgbanwe obi anyị niile.

Ọ chọrọ ka anyị setịpụ aka ma jidesie okporo-igwe ahụ ike, che ịtụ egwu anyị niile ọgụ, ma na-atụghị ụjọ gaa n’ihu ma galite elu n’ụzọ ahụ dị wara wara ma dị mkpafa. Ọ chọrọ nke a maka anyị n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya, na n’ihi na nke a bụ ụzọ e si enwe obi-ụtọ.

Ya mere, olee otu Chineke si na-akpalite ụmụ Ya isoro Ya n’ụbọchi nke anyị?

O Zitere Nwa Ya Nwoke

Chineke zitere Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst, igosi anyị ụzọ ziri-ezi.

Chineke n’akpali mụọ anyị site n’ịrịọ arịọ, ogologo ntachi-obi, emesighị ike, ịdị nwayọ, na ịhụnaanya na-enweghị aghụghọ.8 Chineke nọ n’akụkụ anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, ma mgbe anyị na-akpọburu, Ọ na-achọ ka anyị bilite ọtọ, gbalị kwa ọzọ, ma sizie ike karịa.

Ọ bụ onye-nlere-anaya anyị.

Ọ bụ nnukwu olile-anya nchekwa anyị.

Ọ tụkwasiri obi na anyị ga-amụta site na nzọgheri ụkwụ anyị niile ma mee nhọrọ ziri ezi.

Nkea bụ ụzọ kacha mma!

Nkea bụ ụzọ kacha mma!9

Olee maka ihe-ọjọọ niile nke Ụwa?

Otu n’ụzọ niile Setan chọrọ ka anyị ji na-emegharị ndi ọzọ anya bụ site n’inogide n’elu na ọbụna ịkọlite akụkọ n’imeto ihe ọjọọ n’ime ụwa.

N’ezi-okwu ụwa anyị anọwo rịị oge niile, ma ga-aganiihu na-anọ n’ezughi-oke. Ọtụtụ ndi na-enweghị ụta na-ata ahụhụ n’ihi otu ihe niile siri dapụta nke okike dị kwa ka site na-agwa mmadụ enweghị obi ebere. Ire-ure na agwa-ọjọọ dị n’ụbọchị anyị pụrụ-iche ma na-akpọ mkpu.

Mana na-agbanyeghị ihe niile a, agaghị m agbanwe ibi n’oge a na oge ọzọ n’akụkọ nke ụwa. Agọziri anyị otu a na-enweghị ike igụta-ọnụ ibi ndụ n’ụbọchị nke ọganihu, mmepe-anya, na uru a na ametụbeghị mbụ. Nke kachasị nke, agọziri anyị inwe uju nke ozi-ọma nke Jisọs Kraịst, nke na-enye anyị iji uche hụ ihe pụrụ iche n’ihe egwu niile nke ụwa ma na-egosi anyị otu anyị ga-esi zere ihe egwu ndịa ma ọbụ mee ha.

Mgbe m na-eche maka ngọzi niile ndi a, Achọrọ m isekpu n’ikpere m ma welite olu m n’otuto nye Nna nke Bi n’Eluigwe n’ihi ịhụnaanya Ya na-adịghị mgbe ọ ga-ebi n’ebe ụmụ Ya niile nọ.

Ekweghị m na Chineke chọrọ ka ụmụ Ya na-atụ egwu ma ọbụ biri n’ihe ọjọọ nile nke ụwa. “N’ihi na Chineke enyebeghị anyị mụọ nke ịtụ egwu; kama nke ike, na nke ịhụnanya, na nke echiche zuru-oke.”10

O nyewo anyị imeri-ime ihe kpatara anyị ga-eji na-ańụrị ọnụ. Anyị kwesiri nnọọ ịchọta na ịkọta ha. Onye-nwe-anyị ugboro ugboro ka ọ na-echetara anyị ka anyị “ghara ịtụ-egwu,” na ka anyi nọrọ “n’ezigbo ịńụrị-ọnụ”11 ka ụjọ atụla anyị, obere igwe-atụrụ.”12

Onye-nwe-anyị Ga Alụrụ Anyị Ọgụ niile

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị bụ “ụmụ atụrụ” nke Onye-nwe-anyị. Anyị bụ Ndi-nsọ ahụ nke Ụbọchị Ikpeazụ a. N’ime aha anyị ka inwe mkpebi ilepụ anya n’ihu maka mbịaghachi nke Onye-nzọpụta ahụ ma kwado onwe anyị niile na ụwa ịnabata Ya. Ya mere, ka anyị jeere Chineke ozi ma nwee ịhụnaanya n’ebe mmadụ ibe anyị nọ. Ka anyị jiri ntụkwasi-obi dị mfe, ya na obi-ume-ala mee nke a, na eledaghị anya okpukperechi ọbụla ma ọbụ ndị otu mmadụ. Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, e nyere anyị iwu ịmụ okwu nke Chineke na ịńa-ntị n’olu nke Mụọ ahụ, ka anyị wee “mata ihe nhụba-ama niile nke oge niile ahụ, na ihe nhụba-ama niile nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ.”13

Ya mere, anyị anọghị, na-adịghị nke anyị ma maka aka-mgba niile nke ụwa, ọbụghị na anyị amaghị ihe isi ike niile nke oge anyị niile. Mana nke a apụtaghị na anyị kwesịrị ibo onwe anyị ibu-arọ ma ọbụ ndi ọzọ n’ịtụ-egwu oge niile. Kama ibigide n’ịdị ukwuu nke aka-mgba anyị niile, ọ bụ na ọ gaghị aka mma ilekwasị anya n’idi-ukwuu, ịdị-mma, na ike zuru-oke nke Chineke anyị, na-atụkwasi obi na Ya, ma jiri obi jupụtara na ọńụ na-akwado maka mbịaghachi nke Jisọs Kraịst?

Dịka ndi ọgbụgba-ndụ Ya, ahụ ekwesighị ịkpọnwụ anyị site n’egwu n’ihi ihe ọjọọ nwere ike ime. Kama, anyị nwere ike na-aga n’ihu n’okwukwe, mgbam-ume, inwe mkpebi, na ịtụkwasị obi na Chineke dịka anyị na-abịakwuru aka-mgba niile na ohere-ọma niile ahụ dị n’ihu.14

Anyị anaghị aga n’ụzọ ndi-na-eso ụzọ nanị anyị. “Onye-nwe-anyị Chineke unu … so unu na-aga; o gaghị agharịpụ unu, ma ọbụ hapụ unu.”15

“Onye-nwe-anyị ga-alụrụ unu ọgụ, ma unu ga-ejide udo unu.”16

N’ihu egwu, ka anyị chọta agbam-ume anyị, jidesie okwukwe anyị ike, ma nwee atụghị-ụjọ n’obi-siri-ike na nkwa nke na “ọdịghị ngwa-agha e mere imegide gị ga-adị ire.”17

Anyị na-ebi ndụ n’oge ihe-ngabiga dị egwu na ọgbaghara? N’ezie anyị nwere ike.

Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-merie-la m ụwa”18

Anyị nwere ike inwe okwukwe ikwere na ime dịka e siri kwuo? Anyị nwere ike ibi ndụ ruo nkwa anyị kwere na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anyị mere? Anyị nwere ike idebe iwu nsọ niile nke Chineke ọbụladị nime ọnọdụ na-ama anyị aka? N’ezie anyị nwere ike!

Anyị nwere ike n’ihi Chineke ekweela nkwa, “Ihe niile ga-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma [anyị], ma ọbụrụ na [anyị] na-aga ije n’ụzọ ziri-ezi.”19 Ya mere ka anyị leghara egwu anyị niile anya ma jiri ọńụ, ịdị umeala, olile-anya, na ezi-ntụkwasi-obi n’enweghị egwu bie ndụ na Onye-nwe-anyị nọnyeere anyị.

Ịhụn’anya Zuruoke Na-achụpụ Egwu

Ndi enyi m hụrụ n’anya, ezigbo ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị n’ime Kraịst, ọbụrụ na anyị chọta onwe anyị ka Ị na-ebi ndụ n’ịtụ-egwu ma ọbụ na nchekasị-ahụ, ma ọbụ ọbụrụ na anyị chọpụta na okwu nke onwe anyị niile, akparam-agwa gị niile, ma ọbụ omume gị niile na-akpara ndi ọzọ ịtụ-egwu, a na m eji ike dị na mkpụrụ-obi m niile n’ekpe ekpere ka anyị nwee ike bụrụ ndị atọghapụrụ site na ụjọ nkea site ihe-mmejụ-ọgwụ nke a dị nsọ a họpụtara maka ịtụ egwụ: ịhụn’anya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ, n’ihi na “ịhụn’anya zuru-oke na-achụpụ egwu.”20

Ịhụn’anya zuru-oke nke Kraịst n’emeri ọnwụnwa niile nke imerụ-ahụ, ịmaja, iji ike mekpa ndi Ị ka-ike ahụ, ma ọbụ imegide.

Ịhụn’anya zuru-oke nke Kraịst na-enye anyị ohere ịga-ije n’ume-ala, nkwanye-ugwu, obisiike na-atụghị egwu dịka ndi na-nsiso nke Onye-nzọpụta anyị hụrụ n’anya. Ịhụn’anya zuru-oke nke Kraịst na-enye anyị obisiike ịkwaghe gafere egwu anyị niile ma debe ntụkwasị-obi anyị niile n’ike na ịdị-mma nke Nna anyị nke Elu-igwe na nke Ọkpara Ya, Jisọs Kraịst.

N’ebe-obibi anyị niile, n’ebe niile anyị na-azụ ahịa, na ọkpụkpọ-oku anyị niile n’ụlọ Nzukọ-nso anyị, n’ime obi anyị niile, ka anyị jiri ịhụn’anya zuru-oke nke Kraist dochie egwu. Ịhụnaanya nke Kraịst ga eji okwukwe dochie egwu!

Ịhụnaanya ya ga-enyere anyị aka ịmata, tụkwasi-obi, ma nwee okwukwe n’ime ịdị-mma nke Nna nke Elu-igwe, atụmatụ Ya dị nsọ, ozi-ọma Ya, na iwu-nso ya niile.21 Ịhụnaanya n’ebe Chineke na mmadụ ibe anyị nọ ga atụgharịa irube-isi anyị n’ebe iwu-nso niile nke Chineke nọ ka ọ ghọọ ngọzi karịa ibu-arọ. Ịhụnaanya nke Kraịst ga-enyere anyị aka ịdị obi ebere, nwee mgbaghara karịa, nwee obi nchekwa, ma dịrị uchu karịa nye ọrụ Ya.

Dịka anyị na emejupụta obi anyị n’ịhụnanya nke Kraịst, anyị ga-akpọte ịdị-ụcha nke ime mụọ gbanweworo ma anyị ga-aga ije ọńụ jupụtara, siri obi ike, teta n’ụra, ma dịrị ndụ na ihé na otuto nke Onye-nzọpụta anyị hụrụ n’anya, Jisọs Kraịst.

Eso m Onye-ozi Jọn na-agba-ama, “Enweghị egwu dị n’ịhụnanya nke [Kraịst].”22 Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ezi enyị, Chineke matara gị n’ozuzu-oke. Ọ hụrụ gị na anya n’ozuzu-oke. Ọ matara ihe dị n’ọdịnihu gị. Ọ chọrọ ka gị “atụla egwu, nanị kwere”23 ma “nọrọ n’ịhụnanya ya [zuru-oke],”24 Nkea bụ ekpere ume-ala m n’aha Jisọs Kraịst, amen.

Huba ama

  1. George Whitefield na Jonathan Edwards bụ ndị ọmụmatụ abụọ amaara nke ọma maka ụdị nkuzi ọzị Chineke nkea.

  2. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:37.

  3. Ndị Galetia 5:22-23.

  4. Notu mgbe, Onye-nzọpụta chọburu ibanye ime obodo nke ndị Sameria, ma ndị obodo ahụ anabataghị Jisọs ma ekweghị anabata Ya n’ime obodo ha. Ndị na-eso ụzọ Ya abụọ nwere oke mwute site nan kea ma jụọ si, “Onye-nwe-anyị, I na-achọ ka anyị si ọku site n’elu-igwe da ma rechapụ ha?” Jisọs jiri ntụkpa-ahụ nkea zaghachi: “Unu amataghi ụdị mmụọ dị n’ime unu. N’ihi na Nwa nke mmadụ abịaghị ila mmadụ n’iyi, kama ka o we zọpụta ha. (Lee Luk 9:51-56, King James vashion Ọhụụ [1982]).

  5. Lee Moses 1:39; Lee-kwa Ndị Efesọs 3:19.

  6. Ọpupu 34:6

  7. Lee Ndị Efesọs 3:19.

  8. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 121:41 Nezie ọbụrụ na Chineke na-achọ ka anyị, ụmụ Ya nke anụ-ahụ, ịkpasiri onwe anyị agwa n’ụzọ dị otu a, Ya—onye zuru oke nwere agwa ọma niile—ga-abụ onye nlere-anya maka ụdị akparama agwa a.

  9. Nzukọ nke emere neluigwe tupu ndụ anụ-ahụ bụ ihe ọmụmụ pụrụ iche nke negosipụta agwa nke Chineke. N’ebe ahụ Nna anyị nke Eluigwe gosiri atụmatụ Ya maka ọganiihụ ebigh-ebi nke anyị. Ụmụ ihe ndị dị oke mkpa nke atụmatụ ahụ gunyekọtara nhọrọ onwe, nrube-isi, na nzọpụta site na Aja-mgbaghara-mmehie nke Kraịst. Ekwensu, n’otu aka ahụ, wepụtara ụzọ dị iche. Ọ kwere nkwa na onye niile ga-erube isi—enweghị onye ga-efu efu. Nanị ụzọ esi enwete nkea bụ site na mmegbu na mmanye. Ma Nna anyị nke Eluigwe nwere ịhụnaanya agaghị ekwe ka ụdị atụmatụ ahụ dị ire Ọ ji nhọrọ onwe nke ụmụ Ya kpọrọ ihe. Ọ maara na anyị ga-adariri mba n’ụzọ ọbụrụ na anyị chọrọ ịmụta n’ezie. Ma nke a bụ ihe kpatara O ji nye anyị Onye-nzọpụta, onye aja ebigh-ebi ya nwere ike isapụ njọ anyị ma kwe ka anyị baghachi n’ime ala-eze nke Chineke.

    Mgbe Nna anyị nke Eluigwe hụrụ na ọtụtụ nime ụmụ Ya Ọ hụrụ nanya ka Ekwensu dughere, ọ bịara manye ha isoro atụmatụ nke Ya? Ọ megidere ha ka o tinyere egwu nime ndị niile ahụ nọọrọ na-ahọrọ ụzọ ọjọọ ahụ? Mba. Chineke anyị nwere ike niile nwekwara ike iji kwụsi ụdị nnupụ-isi nkea. O nwekwara ike nnọọ imanye uche Ya na ndị ahụ nupụrụ-isi ma mee ha ekwere. Ma kama, O hapụrụ ka ụmụ Ya họrọ n’aka onwe ha.

  10. 2 Timotị 1:7

  11. Lee, n’ọmụmatụ, Jọshụa 1:9; Aịzaịah 41:13; Luk 12:32; Jọn 16:33; 1 Pita 3:14; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36; 50:41; 61:36; 78:18.

  12. Luk 12:32

  13. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 68:11

  14. Ndụmọdụ Moses nye ndị mmadụ nke ụbọchi ya dịịrị kwara anyị: “Atụla egwu. … Lee nzọpụta nke Onye-nwe-anyị, nke Ọ ga-enwetere unu taa” ( Ọpụpụ 14:13, King James vashion ọhụụ).

  15. Ditoronọmị 31:6

  16. Ọpụpụ 14:14, King James vashiọn ọhụụ.

  17. Aịzaịah 54:17

  18. Jọn16:33

  19. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 90:24; lee also 2 Ndị Kọrịnt 2:14; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 105:14.

  20. 1 Jọn 4:18

  21. Ka any] cheta na Onye-nzọpụta abịaghị nime ụwa imegide ụwa; kama ka enwee ike zọpụta ụwa site na ya”(Jọn 3:17). N’ezie, “Ọ naghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ ga-abara ụwa uru; n’ihi na ọ hụrụ ụwa n’anya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ nke ya ka o wee kpọta mmadụ nile n’ebe ọ nọ” (2 Nifaị 26:24).

  22. 1 Jọn 4:18; lee kwa 1 Jọn 4:16.

  23. Mak 5:36

  24. Jọn 15:10