2017
Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn
May 2017


Ozi Nkuzi nke Otu-nleta, Onwa ise 2017

Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn

Foto, oyiyi
Onye Isi Nduzi Thomas S. Mọnson

Ana m arịọ onye ọbụla n’ime anyị ka anyị jiri ekpere na-amụ ma na-atụgharị uche na Akwụkwọ nke Mọmọn kwa ụbọchị.

Ezi ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyi, obi m juputara n’ekele ebe anyi gbakọ kwara ọzọ na nnukwu ọgbakọ zuru ọha nke Nzukọ nso nke Jisọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. tutu mụ ebido ozi m nke taa, ọ ga-amasị m ima-ọkwa maka temple ọhụrụ ise ndị nke a ga-arụ n’ebe ndịa niile: Brasilia, Brazil; greater Manila, mpaghara, Philippines; Nairobi, Kenya; Pocatello, Idaho, USA; na Saratoga Springs, Utah, USA.

Na ụtụtụ a ana m ekwu okwu gbasara ike Akwụkwọ nke Mọmọn na mkpa ọ dịịrị anyị dika ndi otu Nzukọ nsọ a ị mụ ihe banyere ya, ịtugharị uche na itinye nkuzi ya niile n’ime ndụ anyị. Uru inwe ezi ọgbugba ama Akwụkwọ nke Mọmọn kwụ chịm abụghi ihe a pụrụ ịkọwacha akọwacha.

Anyị nọ n’oge ụwa juputara n’oke nsogbu na ajọọ omume. Ọ bụ giniga-ekpuchite anyị site na mmehie na ihe ọjọọ juru n’uwa taa? Ana m ekwuputa naọgbụgba ama siri ike nke Onye Nzopụta anyi, Jisọs Kraịst na kwa ozi ọma Ya ga-enyeaka duba anyi na nchekwa. Ọbụrụ na ị naghị agụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbochi ọbụla, bikobido gụwa ụbọchị niile. Obụrụ na ịga-eji ekpere agụ ya na ezi mmasị ịmata eziokwu,Mmuo Nsọ ga-eme ka eziokwu ya pụta íhé n’ime gị. Ọbụrụ eziokwu—ma ana m agba ama naọ bụ ezịokwụ —na Josef Smit bụụrụ onye amụma nke hụrụ Chineke Nna na Okpara Ya,Jisọs Kraịst.

N’ihi na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu, Nzukọ nsọ nke Jisọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a bụ Nzukọ nke Onye-nwe-anyi n’elu ụwa, ma eweghachitawo ọkwa-nchụ-aja nke Chineke dị nsọ maka ọdịmma na ngọzi nke ụmụ Ya.

Ọbụrụ na inweghị ọgbugba ama kwụ chim banyere ịhe ndi a, mee ihe i kwesịrị ime ka i nweta otu. Ọ dị mkpa gị inweta ọgbugba ama nke gi n’oge ihe i si ike ndi a, n’ihi na ọgbugba ama nke ndi ọzọ agaghị edute gị anya. Kaosiladi, ozugbo enwetara ya, ọgbụgba ama bụ ihe e kwesiri iruwe nkọ site na ịganịịhu n’erube isi n’iwu nsọ niile nke Chineke nakwa site n’ịdị na-ekpe ekpere kwa ụbochị ma na-amụ akwụkwọ nsọ.

Ezi ndi ọrụ nke Onye-nwe-anyị, ana m arịọ onye ọbụla n’ime anyị ka anyị jiri ekpere na-amụ ma na-atụgharị uche na Akwụkwọ nke Mọmọn kwa ụbọchị. Mgbe anyị mere otu a, anyi ga-adị na-ọnọdụ ịnụta olu nke Mmụọ Nsọ, ịgbanarị ọnwụnwa, imeri ụjọ na obi abụọ, na ịnata enyem aka nke eluigwe n’ime ndụ anyị. Eji m obi m niile ekwupụta nke a, n’aha nke Jisọs Kraịst, amen.

Bipụta