2017
Onye mgbasa-ozi n’ejighị tag.
June 2017


Ntorobia

Onye mgbasa-ozi n’ejighị tag.

N’ebe ụlọ-akwụkwọ enwere m otu onye-nkuzi onye nwere ụdịrị agwa ga-enwe ike itinye ụjọ n’ime mmadụ site n’ikwupụta nghọtaghe gbasara isi-okwu. Otu ụbọchi anyị bidoro ikparita isi-okwu gbasara Ndi-mgbasa ozi-ọma Ndi-nsọ Ụbọchi Ikpeazu-a. A maara m na m nwere ike izata ajụjụ ya niile, mana ọmetụrụ m dịka m ekwesighi. Ya mere mụ ekwuo nanị nke ga-ezuru ya n’oge ahụ.

N’ime izu-ụka ole ma ole bịara okweghị m nkwụsi iche gbasara mkparita ụka anyị. Na-ngwụcha, enwetere m uche inye ya Akwụkwọ nke Mọmọn nke m kanyere akara n’okwu ndị gbasara ọrụ mgbasa ozi-ọma. Uche ahụ yirim egwu, mana ọ nọgidere. A maara m na ọ bụ mmetụta nke m ga-eji mee ihe.

Ruo mgbe ọnwa abụọ gachara, mụ ahazie Akwụkwọ nke Mọmọn. N’ogologo ụbọchi ahụ ọ dịịrịm ka akwụkwọ ahụ na-amụnye ọkụ n’ime akpa m. N’ime ọkara atọ o weere m inyefe ya akwụkwọ ahụ mgbe m na-apụ maka winta bụụrụ oge egwu jiri m karichaa na ndụ m.

N’ụbọchi nke mbụ m laghachiri, agafere m kalasi ya mana ụjọ ekweghị m banye. Mgbe ahụ mụ anụta ka ọ na-akpọ m, ma o nyere mmpempe akwụkwọ. Agụrụm ya n’ime ụzọ ime họl. O dere na ya agụọla “ihe buru ibu” ebe niile m kaworo akara, ma ọ bịara na-ahụta ụfọdụ ebumnuche dị n’ime okwukwe m.

Ana m enwe obi anụrị ikesa ozi-ọma ugbua, ma a na m enwe obi anụrị karịri akari ijere Nna m bi n’Eluigwe ozi mgbasa ozi-ọma n’oge n’adịghị anya.

Bipụta