2017
Ọkpụkpọ-oku Ịrụ-ọrụ
June 2017


Ozi nke Otu Ndị-Ịsi Nduzi Mbụ, Ọnwa Ịsịị 2016

Ọkpụkpọ-oku Ịrụ-ọrụ

Foto, oyiyi
Onye Isi Nduzi Thomas S. Monson

Mgbe Onye-amụma Joseph Smith kpọrọ Okenye Heber C. Kimball (1801–68) “imepe ụzọ nke nzọpụta” dịka onye mgbasa ozi-ọma nye England, Okenye Kimball jupụtara na mmetụta adịghị-ike.

“O, Onye-nwe,” ka o dere, “A bụ m mmadụ okwu ntabi-ure, ma n’ezia ezughi-oke maka ụdị ọrụ a.”

Okenye Kimball kwetere ọkpụkpọ-oku ahụ n’agbanyeghị, gbakwunyere: “Ntulee niile ndịa emeghị ka m dapụ n’ụzọ ọrụ; otu aka ahụ m ghọtara uche nke Nna m nke Eluigwe, enwetara m mmetụta agbam ume ịga n’ebe niile n’adighị mfe, kwenye na Ọ ga-etinyere m aka site na ike Ya kacha dị elu, ma nyekwasi m nghọta niile nke m ga-eji arụ ọrụ.”1

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị n’etolite etolite ndị akpọrọ-oku iga ọrụ-mgbasa-ozi n’uju-oge, akpọwo gị n’ọrụ n’ihi gị, dịka Okenye Kimball, “nwere mmasi ijere Chineke Ozi” (O&O 4:3) na n’ihi I dị na njikere ma tozuokwa oke.

Ndị di na nwunye agadi, akpọwo unu oku ịrụ-ọrụ n’ihi ụdị ebomn’uche ahụ. Gị, otu-o-sila dị, wetere ọbụghị nanị mmasi ije-ozi kama akọnuche iritere site n’oge niile nke ichu-aja, ịhụnaanya, na uche in wetere n’ọrụ nke Nna gị nke Eluigwe nwere ike iji metụ mkpụrụ obi niile nke ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị ndị na-achọ eziokwu. N’enweghị obi abụọ ị mụtala na anyị enweghị ike n’eziokwu inwe ịhụnaanya n’Onye-nwe-anyị tutu mgbe anyị jewooro Ya ozi site n’ijere ndị ọzọ ozi.

Nye mmasi unu ije-ozi dịka ndị mgbasa-ozi ọma, I ga-agbakwunye okwukwe na mgbasi-ike, mgbam-ume na ezi ntụkwasi obi, nwee mkpebi ma kwuru-chim na oke ahụhụ, kpebie ma nyefee n’aka Chukwu. Ndị mgbasa-ozi-ọma kwuru chim nwere ike iwete ọrụ-ebube n’ime ebe mgbasa-ozi-ọma.

Onye-isi-nduzi John Taylor (1808-87) kwupụtachara ejirimara dị mkpa nke ndị mgbasa-ozi-ọma n’ụzọ a: Ụdịrị nwoke [na nwanyị na di na nwunye] anyị chọrọ dịka ndị n’ebukwasi onwe ha ozi nke oziọma bụ mmadụ ndị nwere okwukwe n’ime Chineke; mmadụ ndị nwere okwukwe n’ime okpukpere-chi; mmadụ ndị na-akwanyere ọkwa-nchu-aja ha ugwu; mmadụ n’ime ha … Chineke nwere ezi ntụkwasi obi. … Anyị chọrọ mmadụ jupụtara na Mmụọ Nsọ na ike nke Chineke[,] … mmadụ nwere nnukwu ugwu, izu-oke, ezigbo omume na idi-ọcha.”2

Onye-nwe-anyị amaala ọkwa:

N’ihi na lee ụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe-ihe-ụbị; ma hụrụ, onye tụbara mma iwe ihe-ụbị n’ike ya, onye ahụ na-akpadokọta ka ọ ghara ịla-n’iyi, mana weta nzọpụta nye mkpụrụ-obi ya;

Ma okwukwe, olile-anya, afọ-ọma na ịhụnanya, jiri anya lekwasị nanị n’otuto nke Chineke, na-eme ka o tozuo ịrụ ọrụ ahụ. (O&O 4:4–5)

Ọkpụkpọ-oku gị abịawo site na mkwalite nke mmụọ. Ana m agba ama na onye nke Chineke kpọrọ oku, Chineke n’azụpụta. I ga-anata enyem aka sitere n’igwe dịka I na-arụ ọrụ na-njupụta n’ekpere n’ime ubi nke Onye-nwe-anyị.

Nkwa ahụ mara mma nke Onye-nwe-anyị nyere ndi mgbasa-ozi-ọma na mbido ọgbọ nke a, dịka edere n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile, ga-abụ nke gị: “A ga m aga n’ihu gị. Aga m anọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, ma Mụọ nke m ga-anọ n’obi unu niile, ma ndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ikwalite unu” (O&O 84:88).

Dịka ị na-eje ozi, ị ga-ewulite enyị na ncheta ebighị-ebi bara ụba. Amaghịm maka ebe mgbasa ozi nke na-amụpụta karịa owuwe obi-ụtọ dị ukwuu karịa ebe mgbasa ozi-ọma.

Ugbua, otu okwu nye ndị mgbasa ozi-ọma ụmụnne ndị nwoke ahụ, ụmụnne nwanyị, na di na nwunye ndị, n’ihi ebumnuche ọbụla, n’enweghị ike inọcha oge ha n’ime ebe mgbasa ozi-ọma: Onye-nwe-anyị hụrụ gị n’anya. Ọ nabatara ichu-aja gị. Ọ maara enwetaghị ebumnuche gị. Marakwa na O ka nwere ọrụ ị ga-arụ. Ekwekwala ka Ekwensu gwa gị ihe ọzọ. Agbadatakwala ala; ume agwukwala gị; adakwala mba.

Dịka m matara na ọgbakọ zuruọha nwa obere oge mgbe akpọsiri idu Nzukọ-nsọ: “Atụla-egwu. Nwee ihu-ọchi. Ọganiihu chapụrụ dịka okwukwe gị.”3 Nkwa ahụ nọsikwara gị ike. Ya mere adapụkwala n’okwukwe gị, n’ihi Onye-nwe-anyị aghaghị inwe okwukwe n’ime gị. Debe ọgbụgba-ndụ gị niile ma gaa n’ihu.

Ụwa nwere mkpa ozi-ọma nke Jisọs Kraịst. Ka Onye-nwe-anyị n’eji mkpụrụ-obi mgbasa ozi-ọma agọzie Ndị-nsọ Ya niile—na-agbanyeghị ebe ha n’eje ozi.

Huba ama

  1. Heber C. Kimball, n’ime Orson F. Whitney, Ndụ nke Heber C. Kimball,3rd ed. (1967), 104

  2. Nkuzi nile nke ndị isi nduzi nzụkọ a: John Taylor (2001), 73.

  3. Thomas S. Monson, “Nọrọ na n’Ezigbo Ọńụ,” Liahona, Ọnwa Ise 2009, 92.

Bipụta