2017
Ike Ọkwa-nchu-aja site na Idebe Ọgbụgba-ndụ niile.
June 2017


Ozi nke Nkuzị ndị nleta ụmụnwanyị, Ọnwa ịshịị 2017

Ike Ọkwa-nchu-aja site na Idebe Ọgbụgba-ndụ niile.

Were ekpere mụọ akwụkwọ ọziza ma chọpụta ịhe mmetụta imata ihe ịga-akuzi Kedu otu ịghọta ebum n’uche nke ndị Otu Enye-m aka ga esi kwadoo ụmụ-ada nke Chineke maka ngozi nke ndụ ebigh-ebi.

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“Ozi m nye … onye niile bụ na anyị ga-ebi ndụ n’oge awa niile ‘na-ngọzi site n’ume nke ike ọkwa-nchụ-aja,’ ihe ọbụla bụ ọnọdụ anyị,” ka Okenye Neil L. Andersen nke Kworum Ndi-ozi Iri-na-abụọ kwuru.

“… Dịka I na-esoro na ntozu-oke n’emume nsọ niile nke ọkwa-nchụ-aja, Onye-nwe-anyị ga-enye gị ume karịa, udo, na uche nke ebigh-ebi. Ihe ọbụla bụ ọnọdụ gị, ebe obibi gị ‘ka aga agozi site n’ume nke ike ọkwa nchụ-aja.’”1

Olee otu anyị ga-esi akpọbata ike ọkwa-nchụ-aja n’ime ndụ anyị niile? Okenye M. Russell Ballard nke Kworum Ndi-Ozi Iri-na-abụọ n’echetere anyị na “ndi ahụ banyeworo n’ime mmiri nke baptism ma gaa n’iru inata onyinye dị nsọ n’ime ụlọ nke Onye-nwe-anyị bụ ndị tozuru maka ngọzi niile bara ụba ma dị ịtụn’anya. Onyinye nsọ bụ onyinye nke ike … [ma] Nna anyị Bi N’igwe na-emepụ aka n’ihe gbasara ike Ya.” Ọ na-echetere anyị ma nwoke na nwanyị “ka enyere onyinye nsọ nwere ụdị ike ahụ” n’ime tempụl, “nke site na nkọwa bụ ike ọkwa-nchụ-aja.”2

Linda K. Burton, Onye-isi-nduzi Zuruọha Otu Enyem-aka, kwuru: “Ebe ike ọkwa-nchụ-aja bụ ihe anyị niile nwere mmasi inata n’ime ezi-na-ụlọ na ebe-obibi anyị, kedụ ihe anyị kwesiri ime iji kpọbata ike ahụ n’ime ndụ anyị niile? Ezi-omume nke onwe bụ ihe dị oke mkpa eji anata ike ọkwa-nchụ-aja.”3

Ọbụrụ na anyị ga-egosi onwe anyị n’obi ume-ala n’ihu Onye-nwe-anyị ma rịọ ka Ọ kuziere anyị, Ọ ga-egosi anyị otu esi abawanye ụzọ anyị sị anata ike Ya,” ka Onye-isi-nduzi Russell M. Nelson, Onye-isi-nduzi nke Kworum Ndị-ozi Iri-na-abụọ kwuru.4

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere na Ozi

1 Nifaị 14:14; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 132:20; reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. Neil L. Andersen, “Ike n’ime Ọkwa-nchụ-aja,” Liahona, Ọnwa iri na otu 2013, 92, 95.

  2. M. Russell Ballard , Ndị nwoke na Ndị nwanyị na Ike Ọkwa-nchu-aja,” Liahona, Ọnwa Itolu. 2014,36.

  3. Linda K. Burton, “Ike Ọkwa nchụ aja— Nọ na nrute nye Onye niile,” Liahona, Ọnwa Isii 2014, 21.

  4. Russell M. Nelson, Ọnụ-ahịa nke Ike Ọkwa-nchụ-aja,” Liahona, Ọnwa Ise 2016, 69.

Bipụta