2017
Ndụ Ndị na Eso-ụzọ Jịsọs Karịst
August 2017


Ozi nke otu Ndi isi Nduzi Mbụ, ọnwa Asatọ, 2017

Ndụ Ndị na Eso-ụzọ Jisọs Kraịst

Afọ iri atọ gara-aga na Ghana, otu nwa akwụkwọ ana akpọ Doe banyere n’ime ụlọ-uka ndị LDS na nke mbụ ya. Otu enyị ya kpọkuru ya ka ya o soro bịa, mana Doe chọsiri ike imata otu Nzukọ-nsọ dị.

Ndị mmadụ niile nọ na ebe ahụ nabatara ya nke ọma nke mere na ọ hapụghi itule uche, “Kedu ụdị Nzukọ-nsọ nke dị otua?”

Ọ masiri Doe nke ukwuu, nke na o kpebiri ịmata ihe gbasara Nzukọ-nsọ a, na ndị ọgbakọ ya, ndị juputara na oke ọńụ. Mana ngwa-ngwa ọ malitere ime nke-a, ndị ezi-na-ụlọ na enyị ya malitere imegide ya. Ha kwuru ọtụtụ ihe ọjọọ gbasara Nzukọ-nsọ-a ma nye ndụmọdụ niile ha nwere ike inye iji wezuga ihu ya.

Mana Doe anataworịị ọgbụgba-ama.

Ọ nwere okwukwe, na ọ hụkwara ozi-ọma nke-a na anya, nke na eme ka ọńụ juputa na ndụ ya. Ya mere, ọ banyere na mmiri baptizim.

Mgbe nke-a mechara, ọ tinyere onwe ya na ọmụmụ-ihe na ekpere. Ọ buru-ọnụ ma chọọkwa onyinye nke Mụọ-nsọ na ndụ ya. Site na nke-a, ọgbụgba-ama na okwukwe Doe bawanyere ma siek-wa ike. Mgbe emechara ọ kpebiri ije-ozi mgbasa ozi-ọma nye Onye-nwe anyị.

Mgbe ọlọtara njem ije-ozi mgbasa ozi-ọma, ọ nyiri ma lụọ onye mgbasa ozi-ọma ọzọ lọtara—onye nke ahụ mere ya baptizim ọtụtụ afọ gara-aga—na kwa arachiri ha na Johannesburg Ndịda Africa Tempụl.

Ọtụtụ afọ agacha-la site na mgbe Doe Kaku nwere ọńụ nke ozi-ọma nke Jisọs Kraịst na mbụ. Na oge mgbe ahụ, onweghi ihe ọńụ dị na ndụ ya. O nweela ihe mgbu nke obi-mgbawa na obi ịda-mba, tinyere ụmụ ya abụọ nwuru-anwu—obi ya ka dịkwa aró site na ihe ariri nke ahụmihe ndị-a.

Mana ya na di ya Anthony, agbawo mbọ inọnyere onwe ha na ezi Nna nke Elu-igwe, onye nke ha ji obi ha niile hụ na anya.

Taa, afọ iri-atọ site na mgbe ọ banyere na mmiri nke baptizim, Nwanne nwanyị Kaku na nso-nso gazuru njem mgbasa ozi-ọma—na oge ugbua na akụkụ dị ya, onye nke bụ onye isi nduzi mission na Nigeria.

Ndị niile ma Nwanne nwanyị Kaku na asi na enwere ihe pụrụ-iche na ndụ ya. Ọ na amuke-amuke. Mgbe ọbụla ịnọ-nyeere ya ighaghi inwe obi ụtọ na onwe gị.

Ọgbụgba-ama bụ ihe doro-anya: “A maaram na Onye nzọpụta na ahụtam dịka nwa Ya nwanyị na enyị Ya (lee Mosai 5:7; Ita 3:14),” ọ siri. “Ma a nam agbali ịmụta otu m ga esi abụ-kwa enyị Ya—ọ bụghi nani site na ihe m na ekwu mana site na ihe ndị m na-eme.

Anyị Bụ Ndị na Eso-ụzọ

Akụkọ Nwanne nwanyị Kaku dịka ka nke ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ nwere mmasi ịmata ezi-okwu, ọ mere ihe okwesiri ime iji nweta ihé nke mụọ-nsọ, ọ gosipụtara ihụnanya nke onwere ebe Chineke na mmadụ ibe ya nọ, na ịme nkea ọ hụtara ihe isike na iri-uju.

Na-agbanyeghị ihe megide niile, na agbanyeghị iri-uju niile, ọ gakwara na ihu na okwukwe. Na dịka osiri dị mkpa, ọ nwegidere ọńụ ya Ọ chọtara ụzọ, ọbụghi nani nke ịnagide ihe isike ndịa niile kama ịna eme nke ọma na agbanyeghị ihe niile.

Akụkọ ya dị ka nke mụ na gị.

Njem anyị anaghi adịcha were-were ma ọbụ enweghi ihe mnwale.

Anyị niile nwere isi-owuwa anyị, ihe ngharipụ anyị na ihe iri-uju anyị.

Anyị nwere ike nwee mmetuta ume-ngwụ na mgbe ufụdọ, ihe nrịkpọ-do.

Mana ndị niile na ebi ndụ onye na eso-ụzọ—onye na anọgide na okwukwe ma were okwukwe na aga; onye tukwasiri obi na Chineke na edebe-kwa iwu Ya niile;1 onye na ebi ndụ ozi-ọma ụbọchị niile na awa-na-awa; onye na ejere ndị ọzọ ozi dịka Kraịst—otuu ezi-omume na otu oge— bụ ha bụ ndị omume ntakiri ha na apụta ihe dị-iche.

Ndị ahụ niile na eme obi-ọma, na agbaghara, nwee mụọ ime ebere, ha bụ ndị ebere ga enweta ebere.2 Ndị na eme ka ụwa-a dị mma, onye na akpa agwa gosiri ihụnanya oge ọbụla, onye na agba mbọ na ebi ndụ afọ ojuju na udo agoziri dịka onye na eso-ụzọ Jisọs Kraịst, bụ ha bụ ndị ga-emecha nweta ọńụ.

Ha ga amata na “ihụnanya nke Chineke, nke juru ebe niile na obi ụmụ ndị mmadụ … bụ ihe kachasi mkpa inweta … ma bụ kwa ọńụ kachasi na mkpụrụ-obi.”3

Bipụta