2017
Ibi ndụ Edoro Nsọ
August 2017


Ozi nke Nkuzi ndi Nleta, Ọnwa Asatọ 2014

Ibi ndụ Edoro Nsọ

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“Ido-nsọ bụ iwezuga ma ọbụ inye-fe ihe dị-nsọ maka nzube dị nsọ,” ka Okenye D. Todd Christofferson nke ndị Ozi Iri na abụọ kwuru. “Ezigbo ọga n’ihu na ndụ nke-a na abia site na iwere ndụ anyị—ya bụ, oge anyị na ihe ndị anyị chọrọ—nyefe maka nzube Chineke.”1

Okenye Neal A. Maxwell (1926–2004) nke Otu ndị Ozi Iri na abụọ siri, “Anyị na eche na ido-nsọ bụ nani inyefe ihe ndị anyị nwere dịka atụrụ-anya na aka anyị. Mana nyefe nke kachasi bụ nyefe nke onwe nye Chineke.”2

Dịka anyị na enyefe nd ụanyị maka nzube nke Chineke, okwukwe anyị na Jisọs Kraịst na Aja-mgbaghara mmehie Ya ga abawanye. Dịka anyị na enyefe ndụ anyị, enwere ike ime ka anyị dị nsọ site na ihe ndị anyị na eme.

Carole M. Stephens, Onye ndụmọdụ nke Mbụ na Ndi Isi Nduzi nke ndị Otu Enyem aka, siri: “Okenye Robert D. Hales kuziri na mgbe anyị na agba-ndụ na erube isi na iwu ọgbụgba ndụ anyị, anyị na arapụ ụwa ma na aba n’ime ala eze Chineke

Agbanworo anyị Anyị pụrụ-iche, na akpakwa agwa dị-iche. Ihe ndị anyị na ege-nti ma na agụ dị-iche, na ihe ndị anyị na eyi dị-iche maka na anyị bu ụmụ-ada Chineke Ya na ha gbara-ndụ.”3

Inyefe ihe edoro-nsọ bụ ọgbụgba ndụ Chineke na eme “ya na ezi-na-ụlọ Isreal; Mgbe ụbọchị ndịa ahụ gachara, Onye-nwee siri, Aga m etinye iwu m na echi-che unu niile, ma dee ya n’ime obi unu niile; mụ onwe-m ga abụ Chineke unu, ma unu ga abụ ndị-m” (Jeremaia 31:33). Ibi ndụ edoro-nsọ dabara na atụmatụ ahụ Chineke nwere maka anyị.

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

1 Ndi Tesolo 1:3; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 105:5;

reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. D. Todd Christofferson, “Reflections on a Consecrated Life,” Liahona, Ọnwa Iri na otu. 2010,16

  2. Neal A. Maxwell, “Consecrate Thy Performance,” Liahona, Ọnwa asaa 2002, 39

  3. Carole M. Stephens, “Wide Awake to Our Duties,” Liahona, Ọnwa iri na otu. 2012, 115–16.

Bipụta