2017
Ichete Onye-nwe-anyị Kwa Ụbọchị
October 2017


Ntorobia

Ichete Onye-nwe-anyị Kwa Ụbọchị

Ndị-enyi, ọrụ-ụlọ, edemede a na ede n’ebe obibi, TV –enwere ọtụtụ ihe ndị nke na-achọ ka uche anyị dịrị na ya. Mana izu-ụka ọbụla, anyị n’ekwe Nna nke Eluigwe nkwa na [anyị] oge niile ga n’echete [Ọkpara Ya, Jisọs Kraịst]” (O&O 20:79).

Onye-isi-nduzi Eyring na-ekwu na anyị nwere ike “ime nhọrọ ụbọchi niile” nke na-enyere anyị aka icheta Onye-nzọpụta. Tulee itụpụta ebumnobi n’ọnwa nkea iji cheta karịa Onye-nzọpụta kwa ụbọchị. I nwere ike mee kalịnda ma kpebie ime ọbụladi otu ihe kwa ụbọchị iji wulite adịnamma gị na Ya. Onye-isi-nduzi Eyring depụtara ihe ndị dịka ịgụ-akwụkwọ nsọ, ikpe ekpere n’okwukwe, na ijere Onye-nzọpụta ozi na ndị ọzọ. Enwekwara idedata ihe n’akwụkwọ, ije nzukọ niile nke Nzukọ-nsọ, igere ntị na ọgbakọ ozuru-ọha, I na-aga tempụl, ịbụ-abụ —ndepụta ahụ na-aga n’ihu! Dịka anyị n’echeta Onye-nzọpụta kwa ụbọchị, Onye-isi-nduzi Eyring n’ekwe nkwa na “ngọzi niile … ga-abịa nwayọ nwayọ ma digide … [ma] ọ ga-eme anyị ịbụrụ ezi ndị na-eso ụzọ nke Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst.”

Bipụta