2017
Ijiri Ịhụnanya Kpugide Ndị Ahụ nke Na-adapụ
October 2017


Ozi nke ndị Nkuzi Nleta Ọnwa Iri 2017

Ijiri Ịhụnanya Kpugide Ndị Ahụ nke Na-adapụ

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?

Foto, oyiyi
Relief Society seal

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

“Eziokwu pụrụ ihé bụ na enweghị ezị-na-ụlọ ndị zuru-oke …,” ka Onye-isi-nduzi Dieter F. Uchtdorf, Onye ndụmọdụ nke Abụọ n’ime Ndị-isi-nduzi Mbụ. “Nsogbu ọbụla ezi-na-ụlọ unu na-agabiga, ihe ọbụla I ga emerịrị iji mezie ha, mbido na ngwụcha usoro nghazi ahụ bụ afọ-ọma, ịhụnanya nke Kraịst n’enweghị ntụpo.”1

Maka ndị ahụ ndị na-anaghị esoro n’uju n’ihe a na-eme n’ime ozi-ọma, Linda K. Burton, onye bubuuru Onye-isi-nduzi Zuru-ọha nke Otu Enyem-aka, kwuru: “Nna nke Eluigwe hụrụ ụmụ Ya niile n’anya. … Na-agbanyeghị ebe ha nọ—n’ụzọ ma ọ bụ na ndapụ—Ọ chọrọ ka ha lọghachi n’ebe obibi.”2

Ọbụladị otu ụmụ gị siri bụrụ nwa-mmefụ, … mgbe ị na-agwa ma ọbụ n’ekwusịrị ha okwu, mee ya na-abụghị n’iwe, mee ya na-abụghị n’obi ọkụ, na mụọ nke n’ekwugide,” ka Onye-isi-nduzi Josef F. Smith kwuziri (1838–1918). “Kwusiri ha okwu n’obi-ọma.”3

Okenye Brent H. Nielson nke ndị Iri Asaa kwupụtara ọzọ ndụmọdụ Onye-nzọpụta nyere ndị ahụ nwere mkpụrụ siliva 10 ma otu efuo: Chọgharịa tutu ị chọta ya. Mgbe nke furu efu bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị, nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwanyị, … emesia ihe niile anyị nwere ike ime, anyị ejiri obi anyị niile nwee ịhụnanya n’ebe onye ahụ nọ, …

Ka mụ na gị nata mkpughe iji mata ụzọ kacha mma karịa iji garuo ndị nọ n’ime ndụ anyị nso ndị nke furu efu ma, mgbe ọ dị mkpa, inwe ndidi na ịhụnanya nke Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jisọs Kraịst, ka anyị n’enwe ịhụnanya, n’ele, ma chere maka onye mmefu ahụ.”4

Onye-isi-nduzi Henry B. Eyring, Onye ndụmọdụ nke Mbụ n’ime Otu Ndị-isi-nduzi Mbụ, kwuru: “Ekpewo m ekpere site n’okwukwe na otu onye m hụrụ n’anya ga-achọsi-ike ma nwete mmetụta ike nke Aja-mgbaghara-mmehie ahụ. Ekpewo m ekpere site n’okwukwe na mmadụ dịka mụọ-ozi ga-abịa nyere ha aka, ma ha bịara.

“Chineke achọpụtawo ụzọ iji zọpụta ụmụ ya n’otu n’otu.”5

Akwụkwọ nsọ niile na Ozi agbakwunyere

Matiu 18:12; Alma 31:35; 3 Nifaị 13:32; O&O 121:41–42

reliefsociety.lds.org

Huba ama

  1. Dieter F. Uchtdorf, “N’ime Otito nke Ndị Ahụ Na-Azọpụta,” Liahona, Ọnwa Ise 2016, 79, 80.

  2. Linda K. Burton, n’ime Sarah Jane Weaver, “Nwanne nwanyị Burton, Nwanne nwanyị Wixom gara nleta na Mpaghara Nzukọ-nsọ dị na Pacific,” Ọkwa Nzukọ-nsọ, Apr. 2, 2013, lds.org/church/news.

  3. Nkuzị nile nke ndị isi nduzi Nzukọ Nsọ a: JosephF. Smith (1998), 247.

  4. Brent H. Nielson, “Ichere maka Nwa-mmefu,” Liahona, Ọnwa Ise 2015, 103.

  5. Henry B. Eyring, “Nye Ụmụ-ụmụ M” Liahona, Ọnwa Ise 2013, 71.

Bipụta