2017
Ibụzi Ezi Ndị-na-Eso-Ụzọ
October 2017


Ozi nke ndị Nduzi Mbụ, Onwa Iri 2017

Ibụzi Ezi Ndị-na-Eso-Ụzọ

N’ime nzukọ oriri-nsọ niile, anyị nwere oghere-ọma ikwe-nkwa nye Nna nke Eluigwe na anyị ga n’echeta oge niile Onye-nzọpụta ma debe iwu-nsọ Ya niile ka anyị nwee ike nwete Mụọ Ya ịnọnyere anyị (lee Moronai 4:3; 5:2; O&O 20:77, 79). Idi na-echeta Ya ga na-abiara anyị oge niile dịka anyị n’ebukwasi onwe anyị aha Ya. Anyị na-eme otu ahụ n’ọtụtụ ụzọ mana nke kacha nke mgbe anyị n’ejere ndị ọzọ ozi n’aha Ya, gụọ okwu nsọ Ya niile, ma kpee ekpere imata ihe Ọ gaara achọ ka anyị mee.

O mere maka m mgbe m meere otu nwaokoroọbịa baptism. A maara m na akpọwo m oku site n’aka ndị odibo nke Onye-nzọpụta echiri echichi dịka onye mgbasa ozi-ọma ikuzi ozi-ọma Ya na igba ama maka Ya na Nzukọ-nsọ Ya bụ Ezi-okwu. Mụ na onye nsiso m nke mgbasa ozi-ọma ekwewo nwaokroọbịa ahụ nkwa na-aga asachapụ ya site n’ike nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jisọs Kraịst dịka ọ na-echeghari site n’okwukwe n’ime Onye-nzọpụta ma mee baptism site n’aka otu n’ime ndị odibo Ya enyere ikikere.

Ka m welitere nwaokoroọbịa ahụ site na mmiri dị n’ime font baptism, ọ takenyere m na ntị, “A dịwom ụcha, A dịwom ụcha.” N’ime nwa oge ahụ, echetere m baptism Onye Nzọpụta n’aka Jọn Omee Baptism n’ime Iyi ukwu Jodan Ma karịa, echetere m na m nọọrọ na-arụ ọrụ nke Onye-nzọpụta biliteworo na ọnwụ ma dị ndụ—nke Mụọ Nsọ bịara, dịka Jọn meworo.

Maka mụ na maka onye ọbụla n’ime anyị, ichete Onye-nzọpụta nwere ike bụrụ karịa ịtụkwasị obi n’elu ncheta nke ọmụma-ihe na nhumiihe anyị nwetere n’aka Ya. Anyị nwere ike ime nhọrọ niile kwa ụbọchi nke na-adọkwute anyị nso nso ruo na Ya n’ime oge ugbua.

Nhọrọ kacha dị mfe nwere ike bụrụ igụ akwụkwọ-nsọ. Site na-ime nkea, anyị nwere ike rite mmetụta niile nke ịnọ Ya nso. Nye mụ onwe m, ịnọ nso nso na-abịara m oge ụfọdụ mgbe m gụrụ site n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. N’ime mbido ọkara mgbe m gụrụ n’ime isi-okwu ndị nke 2 Nifaị, anụtara m n’ime obi m olu niile nke Nifaị na Lihaị na-akọwa Onye-nzọpụta dịka ha maara Ya n’onwe ha. Mmetụta nke ịnọ nso nso na-abịa.

Maka gị, ebe ndị ọzọ niile nime akwụkwọ nsọ nwere ike kacha ịdọbata gị ruo na Ya Mana ebe ọbụla na mgbe ọbụla I gụrụ okwu nke Chineke, jiri umeala na ezi ebum n’uche icheta Onye-nzọpụta ahụ, I ga-ebulite mmasi gị iwekwasi onwe gị aha Ya n’ime ndụ gị kwa ụbọchi.

Mmasi ahụ ga-agbanwe ụzọ I si ejere Onye-nwe-anyị ozi n’ime Nzụkọ-nsọ. I ga-ekpe ekpere nye Nna nke Eluigwe maka enyem aka ikwado ọbụladị ihe ahụ nke yiri gị dịka obere ọkpụkpọ oku. Enyem aka nke iga arịọ bụ inwe ike ichefu onwe gị ma tinye uche karịa na ihe Onye-nzọpụta ahụ chọrọ maka ndị ahụ akpọrọ gị oku ijere ozi.

Ahụwom aka Ya na ibịa nso Ya n’ime ije-ozi m n’ebe ụmụ anyị nọ mgbe m kpere ekpere imata otu m si enyere ha aka chọta udo nke nanị ozi-ọma n’ewete. N’ụdị oge ndị ahụ, ọgbasachaghịm maka ihụta m dịka onye nne na nna nwere mmeri, kama ọgbasra m nke ukwuu maka mmeri na ọdịmma nke ụmụ m.

Mmasị nke inye ndị anyị n’ejere ozi ihe Onye-nzọpụta gaara enye ha n’edubanye na ekpere nke na arịọ arịrịọ n’aka Nna nke Eluigwe, n’eziokwu n’aha nke Jisọs Kraịst. Mgbe anyị n’ekpe ekpere n’ụdị ahụ—n’aha Onye-nzọpụta, nwee okwukwe n’ime Ya—Nna n’aza. Ọ n’ezipụ Mụọ Nsọ ka o duo, kasie obi, ma gbaa anyị ume. N’ihi Mụọ Nsọ ahụ na-agba aka-ebe maka Onye-nzọpụta ahụ (lee 3 Nifaị 11:32, 36; 28:11; Ita 12:41), ike anyị nwere iji obi anyị niile, na ike anyị nwee ịhụnanya n’ebe Onye-nwe-anyị nọ na-abawanye (lee Mak 12:30; Luk 10:27; O&O 59:5).

Ngọzi niile nke icheta kwa ụbọchi na oge ugbua ga-abịa n’ụzọ dị nwayọ ma digide ka anyị n’ejere Ya ozi, rie oriri n’okwu Ya, ma kpee ekpere n’okwukwe n’aha Ya. Ma ụdị ncheta nkea ga-edozie anyị ịbụrụ ezi ndị n’eso ụzọ nke Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst n’ime alaeze Ya n’elu ụwa nkea—ma emesia anyị na Nna Ya n’ime ụwa dị ebube nke na-abịa.

Bipụta