Ozi nke ndi Ịsi Nduzi nke mbụ, Onwa Nọvemba 2017
Unu atụla-egwụ Ime Ihe-ọma.
Onye-nwe-anyị na-agwa anyị na mgbe anyị ji okwukwe guzoro na-elu nkume Ya, obi-abụọ na ụjọ na-emelata, ọchịchọ ahụ ime ihe-ọma na-emelita.
Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, E ji m obi-ume-ala ekpe-ekpere ka Mụọ nke Onye-nwe-anyị ga-anọnyere anyị dịka m n’ekwu-okwu taa. Obi m jupụtara na-ekele nye Onye-nwe-anyị, onye Nzukọ-nsọ nke a bụ nke ya, maka ịkwalite-mụọ anyị nwerela n’ime ekpere nịịle, okwu-chukwu nịịle ịkwalite-mụọ, na abụ ndị mụọ-ozi n’ime ọgbakọ nke a.
Ọnwa-anọ gara-aga, Onye-isi-nduzi Thomas{nb}S.Monson ziri-ozi nke mmetụrụ ọtụtụ obi n’ụwa, tinyere nke m. O kwuru maka ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ gbara anyị ume ịgụ, tụgharịa-uche, ma were nkuzi ya nịịle mee ihe. O kwere nkwa na ọbụrụ na anyị wepụta oge ụbọchị ọbụla ịgụ ma tụgharịa-uche ma dobe iwu nịịle nọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn , anyị ga-enweta ịgbaa-ama siri-ike nke ezi-okwu ya, na ịgbaa-ama n’eso nke Kraịst ahụ dị ndụ ga-enye anyị aka nwee ndidi n’ime oge nịịle nke nsogbu. (Lee “Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn,” Liahona, May 2017, 86–87.)
Dịka ọtụtụ n’ime unu, A nụrụ m okwu nịịle nke onye-amụma dịka olu nke Onye-nwe-anyị nye m. Ma, dịka kwa ọtụtụ n’ime unu, E kpebiri m irube-isi nye okwu nịịle ndị ahụ. Ugbua, site na-mgbe m bụ nwa-nwoke, E nwetara m aka-ebe na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke, na Nna na Ọkpara pụtara ma gwaa Josef Smit okwu, ma na ndị-ozi mgbe ochie bịakwutere Onye-amụma Josef ị weghachi ọtụghe-ụzọ nye Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe-anyị.
Iji ịgbaa-ama ahụ, a gụọla m Akwukwọ-nke Mọmọn ụbọchị ọbụla ihe karịrị afọ 50. Ya mere E nwere m ike ịche na okwu nịịle nke Onye-isi-nduzi Monson bụ maka onye ọzọ. Agbanyeghị, dịka ọtụtụ n’ime unu, e nwere m mmetụta ịgbaa-ume na nkwa nke onye-amụma mere ka m nwee mgbalị karịa. Ọtụtụ n’ime unu emela ihe m mere;kpee ekpere karịa,tụgharịa-uche akwụkwọ-nso karịa, ma gbalịa karịa ijere Onye-nwe-anyị na ndị-ọzọ ozi maka Ya.
Ihe ọma pụtara na ya n’uche m, ma ọtụtụ n’ime unu, bụ ihe onye-amụma kwere na nkwa. Anyị bụ ndị nabatara ndụmọdụ nkwalite-mụọ ya nke-ọma anụla olu nke Mụọ nke-ọma. Anyị enwetala ike karịa ị guzogide ọnwụnwa ma nwee okwukwe karịa n’ime Jisus Kraịst biliteworo n’ọnwụ, n’ime ozi-ọma Ya, na Nzukọ-nsọ Ya dị ndụ.
N’ime oge nke nnukwu ogbaghara n’ime ụwa, mmelite nịịle ndị-ahụ n’ime ị gbaa-ama a chụpụla obi-abụọ na ụjọ ma wetara anyị mmetụta nịịle nke udo. Ị nụrụ ndụmọdụ nke Onye-isi-nduzi Monson enwela ihe abụọ ọzọ juru-anya omere m. Nke mbụ, Mụọ ahụ okwere nkwa mepụtara uche nke ị mata maka ihe ga-eme, agbanyeghị na ọgba-aghara n’ime ụwa dịka ọ na-abawanye. Ma nke abụọ, Onye-nwe-anyị enyewo m—na unu—mmetụta karịrị-akarị nke ị hụn’anya Yam aka ndị nwere nnukwu nsogbu. Anyị enwela mmetụta karịa n’ime ọchịchọ ahụ nke ị ga nyere ndị ọzọ aka. Ọchịchọ ahụ bụ ihe nọrọla n’obi nke igbasa-ozi-ọma na nkuzi nke Onye-isi-nduzi Monson.
Onye-nwe-anyị kwere nkwa na anyị ga-enwe ịhụn’anya karịa ebe ndị ọzọ nọ ma Onye-amụma Joseph Smith na Oliver Cowdery ga-enwe mgbam-ume ha ga-achọ mgbe ọrụ nịịle chere ha n’ihu ga-adị egwu. Onye-nwe-anyị kwuru na mgbam-ume ha chọrọ ga-abịa site na okwukwe ha n’ime Ya dịka nkume ha:
“Unu atụla egwu ime ihe-ọma, ụmụ m ndịkom, n’ihi na mkpụrụ ọbụla mmadụ na-akụ, nke ahụ ka ọ ga-aghọkwa, ya mere, ọbụrụ na i kụọ mkpụrụ ọma ị ga-aghọta ihe-ọma ka ụgwọ-ọrụ gị.
Ya mere, atula egwu, igwe-anụ nta; mee ihe-ọma; ka ụwa na ala-mụọ gwakọta megide gị, n’ihi na ọbụrụ na e wuru unu n’elu oke nkume m, ha agaghị emeri unu.
Lee, a naghị m ama unu ikpe; gaanụ n’ụzọ unu nile ma unu emehiekwala ọzọ; rụọ nụ n’anya udo ọrụ nke m nyeworo unu n’iwu.
Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.
Lee mmerụ-arụ nile nke dụpuru akụkụ m, nakwa apa ntu nile nọ n’aka m abụọ ma n’ukwu m abụọ; kwesi ntụkwasị-obi, debe iwu-nsọ m nile, ma unu ga-eketa ala-eze nke elu-igwe” (D&C 6:33–37)
Onye-nwe-anyị gwara ndị-ndu Ya nke mweghachi, ma Ọ na-agwa anyị, na mgbe anyị jiri okwukwe kwụrụ n’elu nkume Ya, obi-abụọ na ụjọ ga-apụ; ọchịchọ ime ihe ọma na emelita. Mgbe anyị nabatara ịkpọ-oku nke Onye-isi-nduzi Monson ịkụ n’ime mkpụrụ-obi anyị nịịle ọgbụgba-ama nke Jisus Kraịst; anyị n’enweta ike, ọchịchọ, na mgbam-ume ị ga nyere ndị ọzọ aka n’agbanyeghị ihe ndị dịrị anyị.
A hụla m okwukwe na mgbam-ume ahụ ọtụtụ oge mgbe Ndị-nsọ ụbọchị-ikpeazụ kwere-ekwe hụrụ nnwale nịịle n’atụ-ụjọ. Maka otu atụ, A nọ m n’ime Idaho mgbe Dam nke Teton gbabiri na Ọnwa Jun 5, 1976. Otu mgbidi nke mmiri wụdatara. Ọtụtụ puku ndị mmadụ gbapụrụ site n’ebe obibi ha nịịle. E mebiri ọtụtụ puku nke ebe-obibi na ebe-ịzụ-ahia nịịle. Na-ọrụ-ebube, ndị nwụrụ-anwụ erughị 15.
Ihe m hụrụ na-ebe ahụ, a hụla m mgbe ọbụla Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ kwudosịrị-ike n’elu nkume nke ịgbaa-ama nke Jisus Kraịst. N’ihi na ha enweghị obi-abụọ na Ọ na echekwa ha, ha anaghị atụ-ụjọ. Ha na-ahapụ nnwale ha nịịle ma gaa ịnyere ndị-ọzọ aka. Ma ha n’eme nke a maka ịhụn’anya ha hụrụ Onye-nwe-anyị, a jụghị maka nkwụghachi.
Maka ịma-atụ, mgbe Dam nke Teton gbabiri, otu di na nwunye n’aga njem, ọtụtụ maịl site na ebe-obibi ha. Ngwa-ngwa ha nụrụ akụkọ ahụ na radio, ha laghachiri Rexburg. Kama ị ga na ebe-obibi ha ị hụ ma obibirị, ha gara ịchọ ụkọchukwu ha. Ọ nọ n’ime ụlọ e jiri mee ebe ịnabata ndị mmadụ. Ọ nọ n’enye-aka atuziri ọtụtụ puku nke ndị jiri-obi ha pụta inye-aka ndị jiri bus nịịle n’acha odo-odo bia.
Di na nwunye ahụ gakwuru ụkọchukwu ma sị, “Anyị ka lọtara. Ụkọchukwu, ebe ka anyị nwere-ike gaa inye-aka?” O nyere ha aha nịịle nke otu ezi-na-ụlọ. Di na nwunye ahụ nọrọ na-ewepụ apịtị na mmiri n’ime ebe-obibi ndị mmadụ. Ha rụrụ-ọrụ site na ụtụtụ ruo na abli ọtụtụ ụbọchị. Ha mechara were oge ị ga lee ebe-obibi nke ha. Mmiri ekpochapụla ya, ahapụghị ihe ọbụla. Ya mere ha laghachi ngwa-ngwa ọzọ ịhụ ụkọchukwu ha. Ha jụrụ, “Ụkọchukwu,inwere onye anyị ga-enyere aka?”
Ọrụ-ebube ahụ nke mgbam-ume na afọ-ọma udo—ịhụnanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ—bụ ihe emerela ọtụtụ afọ na ụwa nịịle. O mere n’ime ụbọchị ọjọ nịịle nke mkpagbu na nnwale nịịle na oge nke Onye-amụma Joseph Smith n’ime Missouri. O mere mgbe Brigham Young duru ọpụpụ-igwe-mmadụ site na Nauvoo ma kpọkuo Ndị-nsọ nịịle ka ha gaa ebe nịịle mmadụ ebighị ebe nịịle western United States, inyere onwe ha aka hiwe Zaịọn maka Onye-nwe-anyị.
Ọ bụrụ na gị gụọ ihe odide nịịle nke ndị mmalite ahụ, ị ga-ahụ ọrụ-ebube nke okwukwe na-achụpụ obi-abụọ na ụjọ. Ma ị gụọ nke Ndị-nsọ na-ahapụ ihe nịịle dịrị ha ịnyere onye ọzọ aka maka Onye-nwe-anyị, tupu ha alaghachi ị lee atụrụ ha ma-ọbụ ubi ha nịịle akọbeghị.
A hụrụ m otu ọrụ-ebube ahụ nanị ụbọchị ole na ole gara-aga n’ime mbibi nke Hurricane Irma mere n’ime Puerto Rico, Saint Thomas, na Florida, ebe Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ na nzukọ-nsọ nịịle ndị-ọzọ, na ndị otu ogige, gbakọtara-aka ibido ọrụ nịịle nke nkpochapụ.
Dịka ndị enyi m n’ime Rexburg, otu di na nwunye abụghị ndị-otu n’ime Florida legidere-anya inyere ogige ahụ aka karịa ịrụ-ọrụ na arịa ha. Mgbe ụfọdụ ndị agbata-obi Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ chọrọ inye-aka bupụ osisi ukwu abụọ dachiri ụzọ ụlọ ha, di na nwunye ahụ kọwara na ike gwụrụ ha ya mere ha ji tụgharịa n’anyere ndị-ọzọ aka, nenwe okwukwe na Onye-nwe-anyị ga –eweta enyem-aka ha chọrọ na ebe-obibi ha. Di ahụ mgbe ahụ kọwara na tupu ndị-otu nịịle Nzukọ-nsọ anyị e jiri enyem-aka ha bịa,di na nwunye ahụ nọ n’ekpere. Ha natara ọziza na enyem-aka ga-abịa. Ọ bịara n’etiti awa nke nkwa ahụ.
A nụla m akụkọ na ụfọdụ ebidola n’akpọ Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ ndị n’eyi uwe odo-odo edere Enyem-aka Aka nịịle “Ndị Mụọ-ozi Edo-edo.” Otu Onye-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ gara imezi ụgbọ-ala ya, ma onye-nwoke n’enyere ya aka kọwara “uche o nwetara n’onwe ya”mgbe ndị mmadụ yii uwe odo-odo bupụrụ osisi nịịle site na ebe-obi ma mgbe-ahụ o sịrị ha “bụrụ-m abụ gbasara ị bụ nwa nke Chineke.”
Onye ọzọ bii n’ime Florida—n’abụghịkwa onye okwukwe anyị—kọkwara na Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ bịara n’ebe-obibi ya mgbe ọ na-arụ-ọrụ nime ogige ya mebiri-emebi ma nwee mmetụta nke ike-ọgwụgwụ, na ibe-akwa. Ndị a jiri obi ha pụta keere n.ime mkpụrụ-okwu nịịle nke ya, “ọrụ-ebube enweghị ntụpọ.” Ha jere-ozi abụghị nanị ịrụsi ọrụ ike kama were ọchị na obi-ọma anaghị ihe-ọbụla.
A hụrụ m ịrụsi-ọrụ-ike ahụ ma nụ ọchị ahụ mgbe, oge gachara na Satọde, A gara m ịhụ otu Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ n’ime Florida. Ndị ahụ jiri obi ha pụta kwụsịrị ọrụ ha ma nye m ohere ikwe ụfọdụ ha n’aka. Ha kwuru na ndị otu ha dị 90 nke stek ha nime Georgia nwere atụmatụ isoro n’ime inye-aka n’ime Florida na-abalị bọrọ ụbọchị ahụ.
Ha hapụrụ Georgia na elekere 4.00 nke ụtụtụ, gbaa moto ọtụtụ awa, rụọ-ọrụ ehihie nịịle ma n’ime abalị, ma nwee atụmatụ ịrụ-ọrụ ọzọ echi ya.
Ha jiri ihu-ọchị na obi-ọma kọwa ihe nịịle a. Nanị ndagide m hụrụ bụ na ha chọrọ ka m kwụsị ikele ha ka ha nwee ikelaghachi n’ọrụ. Onye-isi-nduzi stek ebidola ngwa-ọrụ ya ma n’arụ-ọrụ na osisi dara-ada ma otu ụkọchukwu n’ewepụ apa-osisi dịka anyị banyere n’ime ụgbọ-ala anyị ị ga hụ ndị otu enyem-aka ọzọ.
N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, dịka anyị hapụrụ ebe ọzọ, otu nwoke bịara na ugbọ-ala ahụ, wepụ okpu ya, ma kele anyị maka ndị jiri-obi-ha-pụta. O sịrị,”A bụghị m onye-otu nzukọ-nsọ unu. E kwetaghị m ihe unu merela anyị. Chineke gọzie unu.” Ndị jiri-obi-ha-pụta LDS guzroro ya nso chịrị-ọchị ma kpọọ n’ubu, dịka o kwesịghị inwe otito.
Ka ndị jiri-obi-ha-pụta sitere Georgia bịara inyere nwoke nke a ekwenyghị aka, ọtụtụ nnarị nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ site na akụkụ nke Florida mebiri-emebi a gala ọtụtụ maịl n’ebe ọzọ n’ime Florida ebe ha nụrụ na ndị mmadụ nwere nnukwu nsogbu.
Ụbọchị ahụ, echetara m, ma ghọta nke-ọma, okwu amụma nịịle nke Onye-amụma Josef Smit;”Nwoke jupụtara na ịhụn’anya nke Chineke, anaghị enwe obi-ọma ị gọzi nanị ezi-na-ụlọ ya, kama n’agagharị ụwa nịịle, ị nye ndị ụwa nịịle ngọzi.” (Nkuzi nịịle nke Ndị-isi-Nduzi nke Nzukọ-nsọ: Josef Smit [2007], 426).
Anyị n’ahụ ụdị ịhụn’anya ahụ n’ime ndụ nịịle nke Ndị-nsọ-Ụbọchị-Ikpeazụ ebe-ọbụla. Mgbe ọbụla enwere ihe ọjọọ mere ebe-ọbụla n’ime ụwa, Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ na-enye ma jiri-obi-ha-pụta nye ọrụ-enyem-aka nịịle nke Nzukọ-nsọ. Anaghị arịọ ha biko. N’ezi a, ụfọdụ oge, anyị na-agwa ndị ga-eji obi-ha pụta ka ha chere ị ga njem ebe inye-aka ruo mgbe ndị nduzi ọrụ ahụ chọrọ inabata ha.
Ọchịchọ ahụ ị gọzi bụ nsonazu nke ndị mmadụ nwetara ịgbaa-ama nke Jisus Kraịst, ozi-ọma Ya, Nzukọ-nsọ Ya eweghachiri, na onye-amụma Ya. Ya mere ndị mmadụ nke Onye-nwe-anyị anaghị enwe obi-abụọ na ụjọ. Ya mere ndị mgbasa-ozi-ọma ji ewepụta onwe ha maka ije-ozi n’ime akụkụ ọbụla nke ụwa. Ya mere ndị nne na nna na ụmụ ha ji ekpere ndị-ọzọ ekpere. Ya mere ndị-ndu ji agwa ndị-ntorobia ha ka tinye mkpọku nke Onye-isi-nduzi Monson ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn n’obi. Mkpụrụ-ọmitara n’abịa abụghị site na ịgba-ume site n’aka ndị-ndu kama site na ndị-ntorobịa na ndị-otu nịịle itinye okwukwe ha n’ọrụ. Okwukwe ahụ e tinyere n’ọrụ---nke chọrọ ichụ-aja---n’eweta mgbanwe nke obi nke na-enye ha ohere ịnwe mmetụta ịhụn’anya nke Chineke.
Obi anyị nịịle, agbanyeghị, na-anọ na mgbanwe nanị ka anyị n’aga n’ihu isoro ndụmọdụ nke onye-amụma. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ịgba-mbọ mgbe anyị gbachara mbọ nke mbụ, mgbanwe ahụ ga-apụ.
Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ nwere okwukwe ebulitela okwukwe ha n’ime Onye-nwe-anyị Jisus Kraịst, n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn dịka okwu nke Chineke, ma n’ime mweghachi nke ọtụghe-ụzọ nịịle ọkwa-nchụ-aja n’ime Nzukọ-nsọ ezi-okwu Ya. Ịgbaa-ama ahụ melitere enyela anyị mgbam-ume na mmetụta karịa maka ndị-ọzọ nke ụmụ Chineke. Kama aka-mgba na ohere nịịle nọ n’ihu ga-achọ karịa.
Anyị enweghị ike ịhụ ihe ndị nịịle nọ n’ihu, kama anyị mara ebe anyị n’aga. Anyị mara na ụbọchị nịịle nke ikpeazụ, ụwa ga-anọ n’ọgba-aghara. Anyị mara na n’etiti nke nsogbu ọbụla bịara, Onye-nwe-anyị ga-edu Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ nwere okwukwe ka ha were ozi-ọma ahụ nke Jisus Kraịst nye mba , ebo, asụsụ, na mmadụ nịịle. Ma anyị mara na ezi ndị-na-eso-ụzọ nke Jisus Kraịst ga-etozu-oke ma nọrọ na njikere ịnabata Ya mgbe Ọ ga-abịa ọzọ. Anyị ekwesighi ịtụ egwu.
Ya mere, dịka anyị adịla mbụ rụọ okwukwe na ịgbaa-ume n’ime obi anyị, Onye-nwe-anyị chọrọ karịa n’aka anyị—na site n’aka ọgbọ nịịle n’abịa. Ha kwesịrị ịdị ike ma nwee obi karịa n’ihi na ha ga-eme ihe nịịle ga-aka ndị anyị mere isi-ike. Ma ha ga-enwe mmegide karịa site na onye-iro nke mụọ anyị nịịle.
Ụzọ nke inwe olile-anya dịka anyị n’aga n’ihu ka Onye-nwe-anyị nyere: “Lekwasịnu m anya n’echiche ọbụla, enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.” (D&C 6:36). Onye-isi-nduzi Monson gwara anyị otu esi eme nke a. Anyị ga-atụgharị-uche ma tinye n’ọrụ Akwụkwọ nke Mọmọn na okwu nịịle nke ndị-amụma nịịle. Kpee-ekpere mgbe ọbụla. Na-ekwenye. Jere Onye-nwe-anyị ozi jiri obi anyị nịịle, ike, uche, na ume. Anyị ga-eji ike nịịle nke obi anyị kpee-ekpere maka onyinye nke afọ-ọma, ịhụnanya nke Kraịst n’enweghị ntụpọ. (lee Moroni 7:47–48). Ma nke kachasị, anyị kwesịrị ịnọgidesi-ike ma kwesie-ike na isoro ndụmọdụ nke ndị-amụma.
Mgbe ụzọ ahụ siri-ike, anyị nwere-ike dakwasị n’elu nkwa nke Onye-nwe-anyị—nkwa ahụ Onye-isi-nduzi Monson chetarala anyị mbge ọbụla o kwugharịrị okwu nịịle nke Onye-nzọpụta: “Onye ahụ nke nabatara unu, ebe ahụ ka m ga-anọ kwa, n’ihi na a ga m aga n’iru gị. Aga m anọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, ma Mụọ nke m ga-anọ n’obi unu niile, ma ndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ikwalite unu” (O&O 84:88)
A na m agba-ama na Onye-nwe-anyị na-aga n’iru unu mgbe ọbụla ị nọ na ozi nke Ya. Mgbe ụfọdụ ị ga-abụ mụọ-ozi ahụ Onye-nwe-anyị n’ezipụ ị kulite ndị-ọzọ. Mgbe-ụfọdụ ị ga-abụ onye ndị-mụọ-ozi gbara gburu-gburu ndị ga-akwalite gị. Kama mgbe-ọbụla ị ga-enwe Mụọ Ya ịnọ n’ime obi gị, dịka ekwere gị na nkwa n’ime ekpere oriri-nsọ. Ị kwere nkwa na ịdobe iwu Ya nille.
Ụbọchị nịịle kachasị mma nọ n’ihu maka ala-eze nke Chineke n’elu ụwa. Mmegide ga-agba okwukwe anyị nime Jisus Kraịst ume, dịka omerela site na ụbọchị nịịle nke Onye-amụma Josef Smit. Okwukwe mgbe-ọbụla na emery ụjọ. Ị rụkọta ọrụ ọnụ n’eweta ịdị-n’otu. Ma ekpere gị maka ndị nọ na ọchịchọ ka a na-anụ ma zaa site na Chineke ịhụn’anya. Ọ naghị ada-mba ma-ọbụ rahụ-ụra.
A na m agba-ama m na Chineke Nna dị ndụ ma chọọ ka unu lọta ebe-obibi Ya. Nke a bu Nzukọ-nsọ ezi-okwu nke Jisus Kraịst. Ọ mara unu, Ọ hụrụ unu n’anya, ma Ọ na-eche unu nche. Ọ chụrụ aja-mgbaghara-mmehie maka mmehie nịịle unu na mmehie nịịle nke ụmụ nke Nna nke Elu-igwe. Isoro Ya n’ime ndụ unu na n’ime ijere ndị-ọzọ ozi unu bụ nanị ụzọ nke ndụ ebigh-ebi.
A na m agba-ama nke a ma nye unu ngọzi na ịhụn’anya m. Site na aha di nsọ nke Jịsọs Karist, amen.
© 2017 site n’aka Intellectual Reserve, Inc Ikike Mbipụta nile ka e dokwara Ebipụtara na USA. Asụsụ Bekee akwadoro: 6/17 Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/17 Ntụgharị asụsụ nke First Presidency Message, November 2017. Igbo. 97928 593