2017
Ụmụnne nwanyị Atọ
November 2017


Nkụzi ndi nleta ụmụnwanyi, Ọnwa Nọvemba 2017

Ụmụnne nwanyị Atọ

Ọ bụ ọrụ anyị gbasara ị bụ onye na-eso ụzọ nke onwe anyị, ma o nwere obere ọbụrụ ọbụla ime site nụzọ ndi ọzọ si akpasiri anyị agwa.

Ezigbo ụmụnne nwanyị, ezigbo ndi enyi, ibido ọgbakọ ozuruọha site niji nkeji nke ụmụnnne nwanyị gburugburu ụwa dị mkpa ma dị ịtụnaanya. Ma chegodi: ụmụnne nwanyị nke afọ ole ọbụla, ọnọdụ, obodo niile, na ọtụtụ asụsụ jikọtara n’okwukwe na ịhụnaanya maka Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst.

Ka anyị zutere na nso nso onye-amụma anyị hụrụ nanya, Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson, o kwupụtara nye anyị otu dị mma o siri nwee ịhụnaanya nebe Onye-nwe-anyị nọ. Ma a ma m na Onye-isi-nduzi Monson nwere obi ekele nihi ịhụnanya unu, ekpere unu niile, na nyefecha unu niile nye Onye-nwe-anyị.

Ogologo oge gara-aga n’ala ebe dị-anya ka otu ezi-na ụlọ nke ụmụnne nwanyị atọ biiri.

Nwanne nwanyi nke mbụ nweere mwute. Ihe nile site n’imi ya ruo na nti ya na site n’akpụkpọ-ahụ ya ruo na mkpisi-ukwu ya adịghị nke dị ya ka ha zuru ezu nke ọma. Mgbe ọ na-ekwu okwu, oge ụfọdụ okwu ya nile na-apụta otu na-adịchaghị mma, ma ndi mmadụ naara achị ọchị. Mgbe ọtu-ọnye katọrọ ya ma ọbụ chefuo ịkpọ ya ọkọ maka ọtu-ihe, ọ ga-agbarụ ihu, gara pụọ ma chọta ọtu ebu-nzuzo ebe ọ ga-ewepụta ima-ọsụ mwute na itu-uche ihe mere ndụ jiri tụgharia ịbụ ihe juru-oyi na enweghị ọńụ.

Nwanne –nwanyị nke abụọ bụụrụ mad onye ara Ọ naara eche maka maka onwe ya dika onye dị nko, mana oge nile a naara enwe ọtu onye ọzọ nke na-emekarị ya nke ọma n’ule nile n’ulọ-akwụkwọ. Ọ naara atụ-uche na ya n’onwe ya na-eme ihe-ọchị, maa mma, na-eke ekike dị mma, ma na-etọ akpịrị n’ile anya. Mana oge nile, ọ diịrị ka o nwere otu onye naara emekarị ya n’ihe ọchị, na amakarị ya na mma, na-ekekari ya n’ekike ọma, ma ọbụ n’ito-akpịrị n’ile anya karịa.

Ọdịghị mgbe ọbụla ọ gbara onye mbụ n’ihe ọbụla ma nke a ka ọ na-enweghị ike ịnagide. Emeghị ndụ ka ọ dị otu a!

Oge ụfọdụ ọ kwupụtara okwu ọjọọ n’ebe ndi ọzọ nọ ma ọ dịịrị ka ọ fọdụrụ nanị ntakịrị ka ọbụrụ na a na-akpasu ya iwe site n’otu ihe ma ọbụ nke ọzọ.

Otu o doro-anya, nke a emeghị ka a hụ ya n’anya ma obụ bụrụ onye ama-ama karịa. Oge ụfọdụ ọ na-atakọta eze ya, kwukwuchie aka-ọkpọ ya nile, ma na-eche, “Ndụ na-emejọ nke ukwuu!”

Mgbe ahụ e nwere nwanne nwanyi nke atọ. Na-adịghị ka ụmụnne ya nwanyị ndi nwere obi mwute na ịgba-ara, o nwere—ọ dị mma, obi-ụtọ. Ma ọbụghi n’ihi na ọ dịịrị nkọ karia ma ọbụ maa mma karịa ma ọbụ nwe ike ime ihe karịa ụmụnne ya nwanyị. Ọdịghị, oge ụfọdụ ndi mmadụ na kwa ewezuga ma ọ bụ leghara ya anya. Oge ụfọdụ ha na-eji ihe o yi n’ahu ma ọbụ ihe ndi ọ na-ekwu na-eme ihe ọchị. ge ụfọdụ ha na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ya. Mana o nyeghi ohere ka nke ọbụla n’ihe ndi ahụ nye ya nsogbụ karịa.

Nwanne-nwanyị nkea hụrụ ịbụ abụ n’anya. O nweghi oke olu-abụ, ma ndi mmadụ chịrị ọchị maka ya, mana nke ahụ akwụsịghị ya. Ọ ga-ekwu si, “A gaghị m ekwe ka ndi ọzọ na uche ha kwụsị m ịgụ-egwu!”

Ihe ahụ ọ gara n’ihu na–abụ abụ mere nwanne ya nwanyị mbụ obi ọjọọ mee nwanne ya nwanyị nke abụọ ara.

Otụtụ afọ gafere, ma emesịa nwanne nwanyị nke ọbụla ruru ngwụcha nke oge ya n’ụwa.

Nwanne nwanyị nke mbụ ahụ, nke chọpụtara ugboro ugboro na enweghi ebe a na-echekwa ngharịpụ nile na ndụ, mechara nwụọ na mwute.

Nke abụọ, nke na-achọta kwa ụbọchị ihe ọhụrụ na-agaghị amasị ya, nwụrụ n’ara.

Ma nwanne nwanyị nke atọ, onye biri ndu ịbụ abụ ya n’ike ya nile n’ihu-ọchị na obi siri ike n’ihu ya, nwụrụ n’obi ụtọ.

Otu o doro anya, ndụ adịghị mgbe o dị nnọọ mfe, ma ndi mmadụ adịghị mgbe ha na-elegide anya n’otu ebe dịka ụmụnne nwanyị atọ ahụ nọ n’ime akụkọ a. Mana ọbụna ihe ọmuma-atụ nile ndia nwere ike ikuziri anyị ihe gbasara onwe anyị. Ọbụrụ na ị di ka otụtụ n’ime anyị enwere ike ị matala otu akụkụ nke onwe gị n’ime otu, abuọ, ma ọbụ eleghi-anya ụmunne nwanyị atọ ndi a. Ka anyị leruo nke ọbụla n’ime ha anya.

Onye ahụ ịhe dakwasịrị

Nwanne nwanyị nke mbụ hụtara onwe ya dịka onye ihe dakwasịrị—dịka onye e ji na-eme ihe.1 Ọ dịịrị ka otu ihe na–eme ya nke ọzọ a na-emekwasị nke mere ya ịnọ n’ọnọdụ nhuju-anya. N’iji ụdị omume a na ndụ, ọ nọọrọ na-enye ndi ọzọ ohere ịtuzị aka n’otu o siri na–enwe mmetụta ma na-akpa agwa. Mgbe anyi na–eme nke a, a na-akpụgharị anyi site n’ikuku ọbụla nke ịtụta—uche ma n’ụbọchị a nke mgbasa-ozi dị oge nile, ikuku ndi ahụ n’eku na mfesike nke họrịken.

Ezigbo ụmunne nwanyị, gịnị mere unu ga-egi nyefee obi-ụtọ unu n’aka onye-ọzọ, ma ọbu otu nke ndi-ọzọ ndi na–echepụrụ—unu ma ọbụ obi-ụto unu nwa ihe ntakịrị?

Ọbụrụ na ị nwetara onwe gi ka ị na-esogbu maka ihe ndi ọzọ na-ekwu gbasara gị, ka m tụnye-aro ọgwụ-ntejụ nsogbu a: cheta onye ị bu. Cheta na I bụ nke ụlọ-eze nke ala-eze nke Chineke, ụmụ-ada nke Nne na nna nke Elu-igwe, ndi na-ewu gburu gburu ụwa.

Unụ nwere mụọ DNA nke Chineke. Unu nwere onyinye ọpụrụ -iche nile nke malitere n’okike mụọ unu na nke a zulitere n’oge obọsara atụmatụ nke ndụ tupu abịa n’uwa unu . I bụ nwa nke Nna nke Eluigwe obi ebere na nke na adị ndụ ebigh-ebi, Onye-nwe-anyị nke Usu nile nke ndi agha, Onye nke kere ụwa, gbasaa kpakpando nile na-erugharị mgbasa nke mbara elu-igwe, ma debe planet nile n’ọnọdụ ha.

Unu nọ n’ọba-aka Ya abụọ.

Aka abụọ dị ezigbo mma.

Aka abụọ nke ịhụn’anya.

Aka abụọ na-echepụrụ anyị

Ma ọdịghị ihe onye ọbula kwuru mgbe ọbụla maka unu nwere ike ịgbanwe nke ahụ. Okwu ha nile apụtaghị ihe ọbụla n’iji tunyere ihe Chineke kwuworo maka unu.

Ị bu nwa Ya dị oke ọnụ-ahịa

Ọ hụrụ gị na anya.

Obụna mgbe ị zọhiere-ụkwu, obụna mgbe I si n’ebe Ọ nọ tụgharịa pụọ, Chineke hụrụ unu n’anya. Ọbụrụ na ị na-enwe mmetụta ifu-efu, onye a juru-aju, ma ọbụ onye echefuru echefu—atụla egwu. Ezi Onye-ọzụzụ -atụrụ ahụ ga- achọta gi. Ọ ga ebukwasị gị n’ubu aka Ya na-ańụrị ọńụ. Ọ ga-eburu gị ụlọ.2

Ezigbo umunne m nwanyị, biko ka ezi-okwu nile ndi a dị nsọ mikpuo ime-ime n’ime obi unu nile. Ma unu ga-achọta na e nwere ọtụtụ ihe kpatara ka a ghara inwe obi mwute, n’ihi na unu nwere ebe nketa ebigh-ebi unu ga-emejupụta.

Onye-nzọpụta nke ụwa hụrụnanya nyere ndu Ya nke ga-eme ka unu nwe ike ịhọrọ ime ebe nketa ahụ ihe bụ ezi-okwu. Unu ewekwasịwo onwe unu aha ya, unu bụ ndi-n’eso ụzọ Ya. Ma n’ihi Ya, unu nwere ike iyikwasị onwe unu uwe mwụda nile nke otuto ebigh-egi.

Onye na-akpọ-asị

Nwanne-nwanyị nke abụọ noorọ n’eweso ụwa iwe. Dịka nwanne ya nwanyị nke na-enwe mwute, o chere na nsogbu nile ahu dị na ndu ya bụụru ihe nile onye ọzọ kpatara. Ọ tara-ụta n’ezi na ụlọ ya, ndi enyi ya, onye-isi-ọrụ ya na ndi-ụlọ oru ya nile, ndi uwe-ojii, ndi agbata-obi, ndi-ndu Nzuko-nso, usoro ike-ekike ọhụrụ, idịkọta-ọnụ nke ihe nile dị n’elu–igwe, na enweghi ihu-oma doro-anya. Ma ọ nyechara ha nile ọnụ-ọjọọ.

O cheghị maka onwe ya dịka onye na-emejọ mmadụ. Kama, o chere na ya nọọrọ na-azochitere onwe ya. Onye ọzọ obụla, otu o siri kwere, nwere ihe kpalitere ya site n’iche maka onwe, ime ihe na-adịghị mkpa, na ịkpọ-asi. Ya, n’aka nke ọzọ, nwetere mkpalite site n’ebum-n’uche nile di mma—ikpe ziri-ezi, ịkwusi-ike n’ihe ziri-ezi, na ịhụnanya.

N’abụghị ihe ụwa ọma, usoro echiche nke nwanne nwanyị nke ara ahụ zuru-onụ. Nke a ka a hubara-ama n’ihe-ọmụmụ e mere na nso-nso a nke nyobara-anya na esem-okwu dịịrị n’etiti otu ndi-iro. Dika akuku nke ihe ọmụmụ ahu, ndi na-eme nchọpụta jụrụ ndi Palestine na ndi isrel bi na Middle East na ndi otu Republican na Democrats nke United States ajụjụ-ọnụ. Ha chọpụtara na “akụkụ ọbụla chere na ndi otu nke ha [nwere] mkpalite site n’ihụnanya karịa mkpọrọm-asị, mana mgbe a jụrụ ihe mere ndi-otu ndi-iro nke ha [jiri] webata onwe ha n’esem-okwu ahụ, ha tụrụ-aka na mkpọrọm-asị dịka ihe kpalitere otu nke [ndi ọzọ].”3

N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, otu nke ọbụla na-eche maka onwe ha dịka ndi “ezigbo mmadụ”—akpaghi-oke, obi-ọma, na ndi ezi-okwu. Site na ntule, ha hụrụ ndi irọ ha dịka ndi “ajọọ-mmadu”—ndi na-amaghị ihe a na-ekwu, ndi na-anaghị akwụwa-aka ọtọ, ọbụna ndi ọjọọ.

N’ime afọ a mụrụ m, ụwa ka e mikpuru n’ime agha dị egwu nke wetere mwute oke-ahụhụ na iru ụjụ n’ụwa. Agha a ka a kpatara site n’aka obodo mụ onwe m—site n’otu ndi mmadu ndi nke hutara otu ndi nke ọzọ dịka ndi-ọjọọ ma kwado mkpọrọm-asị n’ebe ha nọ

Ha mechiri ndi nke na-amasịghị ha ọnụ. Ha menyere ha ihere ma mee ha ndi a jụrụ-ajụ. Ha weere ha dịka ndi e ledara anya—ọbụna na-erụghị ịbụ mmadụ. Otu aka ahụ i wedara otu ndi mmadụ ala, i ga-anọ na-ekwuzi okwu nile na omume nile na-egosi izi-ezi nke mkpasu-iwe megide ha.

A na m ama jijiji mgbe m na-eche ihe gbasara ihe mere n’ala ndi German na senturi nke 20.

Mgbe mmadụ jụrụ ma ọbụ ekwenyeghị n’ihe anyị na-eme, a na-enwe ọnwụnwa iwere ya na e nwere ihe na-ezighị-ezị n’ebe ha nọ. Ma site n’ebe ahụ ọ dịrị mfe ịtapanye ebumnuche nile kachasị njọ n’okwu nile na omume ha nile.

Dịka o siri kwe nghọta, anyị ga na-eguzo rịrị n’ihe ziri ezi, ma o nwere oge anyị ga ewelite rịrị olu anyị elu maka nke ahụ. Otu o sila dị, mgbe anyị mere otu ahụ n’iwe ma ọbụ mkpọrọm-asị n’ime obi anyị nile—mgbe anyị na-ebuso ndi ọzọ agha imeke ha obi, ime ha ihere, ma ọbụ ikpuchi ha ọnụ—ohere nile bụ anyị anaghị eme otu ahụ n’ezi-omume.

Gịnị ka Onye-nzọpụta ahụ kuziri?

“Asị m unu, hụ ndị iro unu n’anya, gọzie ha bụ ndị na-akọcha unu, na-emere ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, ma na-ekpere ndị na-eji unu eme ihe nleda-anya ma na-esogbu unu ekpere;

“Ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu bi n’elu-igwe;”4

Nke bụ ụzọ nke Onye-nzọpụta ahụ. Ọ bụ nzọ-ụkwụ nke mbụ n’ịkwụda ọdachi nile nke na-emepụta oke nnukwu iwe-ọkụ, mkpọrọm-asị, nkewa, na esem-okwu n’ụwa.

“E,” i nwere ike sị, “aga M a nọ na njikere ịhụ ndi iro m n’anya—ma ọbụrụ na ha nọ kwa na njikere ime otu aka ahụ.”

Mana nke ahụ adịghị ihe o mere, o nwere? Ọ bụ ọrụ anyị gbasara ị bụ onye na-eso ụzọ nke onwe anyị, ma o nwere obere ọbụrụ ọbụla ime site nụzọ ndi ọzọ si akpasiri anyị agwa. Anyị na-atụ anya na ha ga-enwe nghọta ma na-enwe afọ-ọma na mmeghachi, mana ịhụnanya anyị n’ebe them nọ adabereghị na mmetụta ha nile n’ebe nọ.

Eleghị-anya mgbalị anyị ịhụ ndi iro anyị n’anya ga-eme ka obi ha dị nro ma kpalite ike na-arụ ọrụ n’ime ha maka ime ihe ọma. Eleghị anya ọ gaghị eme. Mana nke ahụ anaghị agbanwe nkwa anyị kwere onwe anyị isoro Jisọs Kraịst.

Ya mere, dịka ndi-otu nke Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst, anyị ga ahụ ndi-iro anyị n’anya.

Anyị ga-alụgbu oke iwe ma ọbụ mkpọrọm-asi.

Anyị ga-emejupụta obi anyị nile n’ịhụnanya maka ụmụ nile nke Chineke.

Anyị ga-agaru ịgọzi ndi ọzọ ma kwusaara ha ozi-ọma—ọbụna ndi nke nwere ike “iji [anyị] eme ndi na-adịghị ihe ha bụ ma megbuo [anyị].”5

Onye-na-eso-ụzọ Ya N’ezie

Nwanne nwanyị nke atọ na-anọchite anya onye na-eso-ụzọ Jisọs Kraịst n’ezie. O mere ihe nwere ike isi ezigbo ike ime: ọ tụkwasịrị Chineke obi ọbụna n’ihu iji ya mere ihe ọchi na ihe isi-ike. Otu ọbụla, ọ nọgidere n’okwukwe na olile-anya ya, na-agbanyeghị nleda-anya na ime akaja gbara ya gburu gburu. O biri ndụ n’ańụrị, n’abụghị n’ihi na ọnọdụ ya nile bụụrụ nke ańụrị kama n’ihi na o nwere ańụrị.

Ọdịghị onye ọbụla n’ime anyị na-agafecha n’ije ndụ na-enweghị mmegide. N’ime ọtụtụ ihe ndakwaasị na-anwa ịdọkpụpụ anyị, ole otu anyị si na-atụkwasị olile-anya anyị n’obi-ụtọ ahụ dị ebube nke e kwere ndi okwukwe na nkwa?

Ekwere m na a ga-achọta ọsịsa ya na nrọ nke onye-amụma rọrọ puku-puku afọ gara aga. Aha onye-amụma ahụ bụ Lihaị, ma nrọ ya ka e dekọtara n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn dị oke-ọnụ ahịa na ịtụnaanya.

N’ime nrọ ya, Lihaị hụrụ obosara mbara ala ma n’ime ya bụụrụ otu osisi dị ebube mara mma karịa ka e nwere ike ịkọwa. Ọ hụkwara nnukwu otu nile nke ndi mmadụ na-aga n’ụzọ ha ịgaru n’osisi ahụ. Ha chọrọ ịdetụ mkpụrụ-osisi ya dị ebube ọnụ. Ha nwere mmetụta ma tụkwasị-obi na ọ ga-enye ha nnukwu obi-ụtọ na udo na-adigide.

E nwere ụzọ dị mkpafa nke na-eduga n’osisi ahụ, ma n’akụkụ e nwere otu okporo-igwe nke na-enyere ha aka ịnọ n’ụzọ ahụ. Mana enwekwara igirigi ochichịrị nke kpuchiri ihu-ụzọ ha ma nke ụzọ ahụ ma nke osisi ahụ. Ma n’eleghị-anya ọbụna nke kara dị egwu bụụrụ mkpọtụ nke ọchị dị oke elu na ịkwa-emo nke siri n’otu nnukwu na obosara ụlọ dị na nso nso. Na nkụja, ịkwa-emo ahụ mere ọbụna ụfọdụ mmadụ ndi nke garuworo n’osisi ahụ ma detụ mkpụrụ-osisi ahụ ọnụ bidoro inwe ihere ma gara pụọ.6

Eleghị-anya ha malitere inwe obi-abụọ ma osisi ahụ ọ mara mma n’ezie dịka ha cheworo na mbụ. Eleghị anya ha malitere ịjụ ma ihe ahụ ha nweworo mmetụta ọ bụ kwa ezi-okwu.

O nwere ike bụrụ na ha chere na ọbụrụ na ha tụgharịa azụ site n’osisi ahụ, ndụ ga-adị mfe karịa. O nwere ike a gaghị eji ha mere ihe ịchị-ọchị ma ọbụ chịakwa ha ọchị ọzọ.

Ma n’ezi-okwu, ndi ahụ nọọrọ na-akwa ha emo dịịrị ka ha nwere nnọọ obi-ụtọ ma na-enweta onwe ha. Ya mere eleghị-anya ọbụrụ na ha hapụ osisi ahụ, a ga-anabata ha n’ime otu-ndi-ụka nke nnukwu na obosara ụlọ ahụ ma e too ha maka mkpebi ha, inwe-uche, na ịmata nke ha riri.

Nọrọ n’Ụzọ ahụ

Ezigbo ụmụnne nwanyị, ezigbo ndi enyi m, ọbụrụ na ọ na-esiri unu ike ijidesi okporo-igwe ahụ ike ma na-aga na nkwusike chee ihu na nzọpụta; ọbụrụ na ọchị na ikwa-emo ahụ nke ndi ọzọ chere na obi siri ha ike na-eme ka i sụọ ngọngọ; ọbụrụ na Ị na-enwe nsogbu site n’ajụjụ nile ma ọbụ ozizi nile unu na-aghọtabeghị; ọbụrụ na unu na-enwe mwute n’ihi ngharịpụ nile, ana m agba unu ume icheta nro Lihaị.

Nọrọ n’Ụzọ ahụ!

Ka ọ ghara inwe mgbe unu ga-ahapụ okporo-nke igwe ahụ—okwu nke Chineke.

Ma mgbe onye ọbụla ga-anwa ime imenye unu ihere maka iketa-oke nke ịhụnanya nke Chineke, leghara ha anya.

Ka ọ ghara inwe oge Ị ga-echefu, Ị bụ nwa Chineke; ngọzi nile bara ụba dị chere; ọbụrụ na Ị ga-amụta nanị ime Uche Ya Ị ga-ebinyere Ya otu mgbe ọzọ!7

Nkwa nile nke otuto na nnakwere site n’aka ụwa ekwesighị ntụkwasị-obi, abụghị ezi-okwu, ma anaghị enye afọ-ojuju. Nkwa nile nke Chineke ga-emezu rịrị, bụ eziokwu, ma na-enye ọńụ—ugbua na mgbe niile.

Ana m akpọ unu oku itule okpukpe-chi na okwukwe site n’ebe dị elu karịa. Ọ dịghị ihe a na-enye n’ime nnukwu na obosara ụlọ ahụ a ga-eji tụnyere mkpụrụ-osisi nke ibi ndụ nke ozi-ọma nke Jisọs Kraịst.

N’ezie, “anya ahụbeghị, ma ọbụ ntị ịnụ, ọbụghị ma ọbawo n’ime obi nke mmadụ, ihe nile nke Chineke kwadoworo ndi nke hụrụ Ya n’anya.”8

Amụtawo m n’onwe m na ụzọ ịbụ-ndi-na-eso-ụzọ Ya n’ime ozi-ọma nke Jisọs Kraịst bụ ụzọ e si na-enweta ọńụ. Ọ bụ ụzọ e si enwe nchekwa na udo. Ọ bụ ụzọ esi enweta ezi-okwu.

Ana m agba ama na site n’onyinye na ike nke Mụọ Nsọ, unu nwere ike ịmụta nke a n’onwe unu.

N’oge nke a, ya bụrụ na ụzọ ahụ esizielere gị ike, e nwere m olile-anya na Ị ga-achọta ebe mgbaba na ume n’ime nhazi anyị nile dị ebube nke Nzukọ-nsọ ahụ: Praịmarị, Ndi nyom nta, na Otu-Enyem-aka. Ha dị ka ebe nkwụsị zuru-ike n’ụzọ ahụ, ebe i ga-enwe ike megharịa obisike na okwukwe gị ọhụrụ maka njem dị n’ihu. Ha bụ ebe-obibi nwere nchekwa, ebe Ị ga-enwe mmetụta nke na-ibu otu onye n’ime ma na anata mgbam-ume site n’aka ụmụnne gị ndinyom na ndi soro bụrụ ndi na-eso-ụzọ Ya.

Ihe nile unu na-amụta na Praịmarị na-akwado unu maka mgbakwunye ezi-okwu nile unu na-amụta dịka ndinyom-nta. Ụzọ nke ịbụ ndi-na-eso-ụzọ Ya unu na-aga ya n’ime otu dị iche iche nke Ndinyom-nta na-eduba na ngakọrịta na ịbụ ụmụnne-nwanyị nke Otu Enyem-aka. Site na nzọ-ụkwụ ọbụla ka a na-aga n’ụzọ ahụ, a na-enye unu mgbakwunye ohere-ọma nile igosipụta ịhụnanya unu maka ndi ọzọ site n’omume nile nke okwukwe, omiko, afọ-ọma, ezigbo omume na ije-ozi.

Ịhọrọ ụzọ nke ịbụ ndi-na-eso-ụzọ a ga-eduba n’obi-ụtọ na-enweghị ike ịkọwa na inwe afọ-ojuju nke ọdịdị gị si na chi.

Ọ gaghị adị mfe. Ọ ga-achọ ihe ahụ kacha mma nke i nwere—inwe uche gị nile, ime-nka, okwukwe, ikwusi-ike n’omume ziri-ezi, ume, inwe mkpebi, na ịhụnanya. Mana otu ụbọchị unu ga-eleghachi anya azụ lekwasị mgbalị unu nile, ma o, lee otu inwe obi-ekele i nwere ga-adị na ị n’ọgidesiri ike, na i kwere, ma na ị sighị n’ụzọ ahụ pụọ.

Kwagide na-aga

Enwere ike nwe ọtụtụ ihe gbasara ndụ gị nke karịrị ihe i nwere ike ijikọlata. Mana na ngwụcha, Ị ga-enwe ike ịhọrọ ma ebe nketa gị na ọtụtụ ihe mmetụta gị nile n’ụzọ ahụ. Ọbụghị maka ihe nile i nwere ike ime kama nhọrọ gị nile bụ ihe mere ihe ahụ dị iche iche na ndụ.9

Inweghị ike ikwe ka ọnọdụ nile mee ka i nwe mwute.

Inweghị ike ikwe ka ha mee ka i wee oke iwe.

I nwere ike na-ańụrị-ọńụ na Ị bụ nwa-ada nke Chineke. I nwere ike ịchọta ańụrị na obi-ụtọ n’ime amara nke Chineke na n’ime ịhụnanya nke Jisọs Kraịst.

I nwere ike inwe obi-ụtọ.

Ana m agba unu ume imejupụta obi unu nile n’obi-ekele maka uju na enweghị njedebe nke ịdị-mma nke Chineke. Ụmụnne m nwanyị m hụrụ n’anya, unu nwere ike ime nke a! Ana m ekpe ekpere jiri inwe-mmasị nile nke mkpụrụ-obi m ka unu mee nhọrọ ịkwagide na-aga iru osisi nke ndụ ahụ. Ana m ekpe ekpere ka unu welite olu unu ma mee ndụ unu ndakọrịta olu-abụ nke otuto dị ebube, na-ańụrị-ọńụ n’ihe ịhụnaya nke Chineke, ọrụ-ebube nile nke Nzukọ-nsọ Ya na ozi-ọma nke Jisọs Kraịst nwere ike iweta n’ụwa.

Abụ nke ezi onye-na-eso-ụzọ ya nwere ike na-ada otu na-adabaghị adaba ma ọbụ ọbụna dalitu elu nye ụfọdụ ndi. Kemgbe mmalite oge, nke a adịwo rịị otu a.

Mana n’ebe nna nke Elu-igwe nọ, na n’ebe ndi nke hụrụ Ya n’anya ma na-asọpụrụ Ya, ọ bụ abụ kachasị n’ịdị-oke-ọnụ-ahịa na ịma mma—abụ nke ịhụnanya mgbapụta dị elu ma na-enye nsacha na ijere Chineke na ndinyom ibe ozi.10

Ana m ahapụrụ unu ngọzi m dịka Onye-ozi nke Onye-nwe-anyị ga-achọta ume na mgbam ume ịnọgide n’ọńụ dịka ụmụ-ada nke Chineke ebe unu na-aga kwa ụbọchị n’ụzọ ahụ dị ebube nke ịbụ ndi-na-eso-ụzọ Ya. Site na aha di nsọ nke Jịsọs Karist, amen

Bipụta