2017
Ị Na-achọ Kraịst n’oge Ekeresimesi
December 2017


Ozi nke Ndị Isi Nduzi Mbụ, Ọnwa Disemba 2017

Ị Na-achọ Kraịst n’oge Ekeresimesi

Maka ndi ahụ niile nwere mmasi ịghọta ndi anyị bụ dịka ndi otu Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst n’Ụbọchi Ikpeazu a, ọ ga-amasị m inye ebe mbido nke nkọwa ya sitere n’ime mkpụrụ okwu atọ ndia: Anyị na-achọ Kraịst.

Anyị na-achọ ịmụta maka Ya. Isoro Ya Idizi otu Ọ dị.

Ụbọchi niile n’ime afọ, anyị na-achọ Ya. Mana kacha nke n’oge nkea n’ime afọ—Ekeresimasi, mgbe anyị n’eme ncheta ọmụmụ nke Onye-nzọpụta anyị hụrụ n’anya—obi anyị na-anọgide n’ebe Ọ nọ.

Dịka otu ụzọ n’ime nkwado niile maka mmemme Ekeresimesi, ka anyị tulee otu ndi ahụ ndi nke biri ndụ milenịa abụọ gara aga siri dịrị njikere ịnabata ọbịbịa nke Onye-nzọpụta.

Ndi-ọzụzụ-atụrụ

Anyị amaghị ọtụtụ ihe gbasara ndi-ọzụzụ-atụrụ, nanị na ha “nọọrọ na-ọha, n’eche kwa igwe atụrụ ha na-abali.”1 Ndi-ọzụzụ-atụrụ ahụ bụụrụ nnọọ dịka onye ọbụla n’ime anyị dị, dịka ọtụtụ mmadụ pụrụ ija-mma ndi na-agagharị ụbọchi ha niile ikpata ihe ha ji apụ ndụ.

Ha nwere ike inọchite mmadu ndi, n’otu oge, nwere ike ha adighị ike n’ichọ Kraịst, mana obi ha gbanwere mgbe eluigwe mepere ma amaa ọkwa nye ha maka Kraịst.

Ndi a bụ ndi, mgbe ha nụtachara olu nke nd-ozi nke eluigwe, n’egbụghị oge gawara na Betilehem iga hụta.3

Ndi ahụ Mara Ihe

Ndi ahụ mara ihe bụ ndi akadamiiki ndi naara amụ ihe ọmụmụ maka ọbibia nke Mesaịa, Ọkpara nke Chineke. N’ime mmụta ha niile, ha chọpụtara akara niile nke gosipụtara ọmụmụ Ya. Mgbe ha chọpụtachara ha, ha hapụrụ ebe-ọbibi ha ma gaa njem gawa Jerusalem, na-ajụ ajụjụ, “ Olee ya nke ahụ a mụrụ Eze nke ndi Juu?”3

Ọmụma ihe ha maka Kraịst ahụ akwụsịghị nanị na akademiiki. Otu aka ahụ ha hụtara ihe-iriba-ama niile maka ọmụmụ Ya, ha tinyere ya n’ọrụ. Ha pụtara iga chọta Kraịst ahụ.

Ndị mara ihe nwere ike ịnọchite anya ndi ahụ na-achọ Kraịst site na ihe mmụta na akademiiki. Nkwusi-ike ha n’eziokwu na-emesi dụbaga ha ịchọta Kraịst ma fee Ya ofufe dịka Eze ndi eze niile, Onye-nzọpụta nke ụmụ mmadụ.4

Simiọn na Ana

Simiọn na Ana nwere ike ịnọchite anya ndị ahụ na-achọ Kraịst site na Mụọ. Mụọ ndi a dị ịtụnanya bụụrụ ndi dịịrị uchu n’okpukperechi ma, site na ibu-ọnụ na ikpe ekpere ma site n’igosi ndụ nke idi uchu na nrube-isi, jiri ịnụ ọkụ n’obi chere ịhụta ụbọchi ahụ nke ọbịbịa nke Ọkpara nke Chineke.

Site na nrube-isi, obi ume-ala, na okwukwe, ha nwere ndidi n’atụ anya ọbịbịa nke Onye-nzọpụta.

Ma emesia, nkwesị ntụkwasị obi ha nwetere uru mgbe Meri na Josef chere ha n’ihu nwa-ọhụrụ ahụ onye nke otu ụbọchi ga-ewekwasị onwe Ya njọọ niile nke ụmụ-mmadụ.5

Ndị kwere-ekwe n’etiti Ndi Nifaị na Ndi Laman

Akụkọ nke n’emetụ n’obi gbasara otu ndi kwere ekwe n’ime Ụwa Ọhụụ si elele maka ihe iriba-ama niile nke ọmụmụ nke Onye-nzọpụta ka aga achọta n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn.

Ichetere na ndị ahụ ndi nwebuuru okwukwe n’ime Kraịst ka ejiri mee ihe ọchị ma megide. Ndi oke amamiihe nke ụbọchi ahụ n’ekwugide ndi kwere ekwe na ha nọgidere n’okwu ụgha na-abaghị uru. Na ezi-okwu, ndi n’ekweghị ekwe naara ekwupụta okwu akaja ha niile nke mere ha jiri mee “nnukwu ọgba-aghara” n’ala ahụ (3 Nifaị 1:7). Ha jiri ndi kwere ekwe na aga amụ Onye-nzọpụta mee ihe akaja.

Oke iwe na ọnụma ha tolitere nke ukwuu nke mere ha ji nwee oke mkpebi igbusi kpam kpam ndi niile kwenyere n’ime Onye-nzọpụta. Akwụkwọ nke Mọmọn dekọtara mkpebi dị iriba ama.6

Ndi kwere ekwe ndi biri ndụ n’oge nkea nwere ike nọchite anya ndi ahụ na-achọ Kraịst ọbụladị mgbe ndi ọzọ na-achị ọchị, na-akwa emu, ma kpachara anya na-akpasu iwe. Ha na-achọ Kraịst ọbụladị mgbe ndị ọzọ na-agba mbọ ińọmi ha dịka ndi na-amachaghị ihe, na-enweghị nghọta dị omimi, ma ọ bụ dị aghụghọ.

Ma obi ọjọọ nke ndi ọzọ anaghị egbochi ezi ndi kwere ekwe ị na-achọ Kraịst.

Anyị Na-achọ Kraịst

N’ime afọ ahụ niile, ma elemaanya kachasi nke n’oge Ekeresimesi nkea, ọ ga-abụ ihe nrite nye anyị ọzọ kwa ịjụ ajụjụ “Kedu otu m si na-achọ Kraịst?”

N’oge ihe isi-ike nke ndụ ya, oke Eze Devid dere, “O Chineke, Chineke m ka I bụ; a na m achọsi Gị ike: akpiri Gị akpọwo mkpụrụ-obi m nku, anụ-ahụ m achọsiwo Gị ike.”7

Elemaanya ágwá nke a nke ịchọ Chineke buuru otu n’ime ihe mere e jiri kọwaa Devid dịka nwoke nke dịka obi nke Chineke si chọọ.8

N’oge Ekeresimesi nkea na n’ime afọ niile a, ka anyị jiri obi anyị na mụọ anyị niile chọọ Onye-nzọpụta anyị hụrụ n’anya, Isi nke Ụdọ, Onye dị Nsọ nke Izrel. N’ihi ọchịchọ nkea, n’ụzọ kacha ibe ya, na-akọwapụta na-abụghị nanị ndi anyị bụ dịka ndị otu Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst Ụbọchi Ikpeazụ a kama karịa kwa ndi anyị bụ n’ezie dịka ndi na-eso ụzọ Kraịst.

Bipụta