2017
Dị na Njikere Iburita Ibu-arọ Onye Ọbụla nye Ibe ya.
December 2017


Ozi nkuzi ndị nleta ụmụnwanyị Onwa Ịrị na abụọ 2016

Dị na Njikere Iburita Ibu-arọ Onye Ọbụla nye Ibe ya.

Mụọ akwụkwọ ọziza nke-a site n’ekpere ma chọpụta ihe ịga-akuzi Kedụ otu ịghọta nzube nke Otu enyem-aka ga-esi akwado ụmụ ndi nwanyị nke Chineke maka ngọzi nke ndụ ebigh-ebi?

Okwukwe, Ezi-na-ụlọ, Enye m aka

E jiri ndi nọ na mkpa nke nlekọta anyị, agbam ume anyị, enyemaka anyị, nkasi-obi anyị, obi-ebere anyị gbaa anyị gburugburu,” ka Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson kwuru. … Anyị bụ aka Onye-nwe n’elu ụwa nke a, enyere ọrụ ileta ma kulite ụmụ Ya.” Ọ dabere na ebe anyi nọ na-otu-na-otu.”1

Onye-isi-nduzi Henry B. Eyring, Onye ndụmọdụ nke Mbụ n’ime Otu Ndi Isi-nduzi Mbụ, kwuru: “Otu oke ihe mgbanwe bidoro n’ime obi gị mgbe ị batara n’ime Nzukọ-nsọ a. I mere ọgbụgba-ndụ, ma ị natara nkwa nke bidoro gbanwewa agwa gị. …

“… I kwere nkwa na ị ga-enyere Onye-nwe-anyị aka mee ibu-arọ [ndi ọzọ] a diri mfe ma nwete nkasi-obi. E nyere gị ike iji nyee aka mee ka ibu niile ahụ dị mfe mgbe ị natara onyinye nke Mụọ Nsọ.”2

Anyị chọrọ iji ihé nke oziọma ahụ hụta ndi ọzọ ka Onye-nzọpụta si ahụta—jiri omiko, olile-anya, na afọ-ọma,” ka Jean B. Bingham, Onye-isi-nduzi Zuruọha Otu Enyem-aka kwuru. Ụbọchi ahụ ga-abịa mgbe anyị ga-enwe nghọta zuruoke maka obi ndi ọzọ ma nwee obi ekele inwe ebere nke enyere anyị— dịka otu anyị si enye uche na okwu jupụtara n’afọ-ọma nye ndi ọzọ. …

“Ọrụ anyị na ihe úgwú anyị bụ ịnabata mgbali n’ime onye ọbụla dịka anyị na-agba mbọ idizi ka Onye-nzọpụta karịa.”3

Mgbe anyị na-eburita ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya ma debe ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị n’emepe ụzọ nke Jisọs Kraịst si agwọ ndị ọzọ. Okenye Jeffrey R. Holland nke Kworum Ndi Ozi Iri na Abụọ kuziri: “N’itule nghọta n’enweghị atụ nke ikpọgide n’obe na Aja-mgbaghara-mmehie, a na m ekwe gị nkwa na Ọ gaghị ahapụ anyị ugbua. Mgbe Ọ na-asi ndi dara ogbenye n’ime mụọ, ‘Bịakwute nụ m,’ Ọ na-akọwa na Ya maara ụzọ esi apụta ma mara ụzọ esi aga n’elu. Ọ maara ya n’ihi na Ọ gala ije n’ụzọ ahụ. Ọ maara ụzọ ahụ n’ihi na Ọ bụ ụzọ ahụ.”4

Akwụkwọ nsọ niile agbakwunyere

Matiu 25:40; Ndi Galeshia 6:2; Mosaịa 2:17; 18:8–9

Huba ama

  1. Thomas S. Monson, “Jeere Onye-nwe-anyị ozi n’Ịhụnanya,” Liahona, Feb. 2014, 4.

  2. Henry B. Eyring,”Onye Nkasi-obi,” Liahona, May 2015, 18.

  3. Jean B. Bingham, A Ga m Ewebata Ihé nke Ozi-ọma ahụ n’ime Ebe-obibi m,” Liahona, Nov. 2016, 6, 8.

  4. Jeffrey R. Holland, “Ihe ndị Kụwara-akụwa aga Emezi,” Liahona, May 2006, 71.

Bipụta