2021
Ichọta Ume Ịgbaghara
Jun 2021


“Ichọta Ume Ịgbaghara,” Maka Mgbam ume nke Ndị Ntoroọbịa, Jun 2021, 10–11.

Bịanụ, Soro M

Ichọta Ume I }gbaghara

Onyenwe anyị nyewo anyị iwu ị gbaghara ndị ọzọ. Ọ ga-enyere anyị aka idobe iwu nsọ Ya, tinyekwara nke a.

Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 64:10

Foto, oyiyi
onyeinyom na-ele onye na-esetị aka nye ya

Nkọwa site n’aka James Madsen

Ọ dị ka ụfọdụ iwu nsọ siri ike idebe karịa ndị ọzọ?

Nke a bụ otu na-emenye ọtụtụ ndị mmadụ ụjọ: “Mụ onwe m, Onyenwe anyị, ga-agbaghara onye m ga-agbaghara, mana n’ime unu a chọrọ ka unu gbaghara mmadụ niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:10).

Chere. Anyi kwesiri igbaghara mmadụ niile mejọrọ anyị? Nke ahụ ọ ga-ekwe omume?!

Ọ bụ otu ihe ịgbaghara mmadụ maka ịgwa gị okwu ọjọọ ma ọ bụ iwere achịcha ikpeazụ n’elu tebụụl nri abalị. Mana kedụ maka ọnyá ahụ miri emi? Mmehie ndị ahụ jọgburu onwe ha nwere ike gbasasịa ma ọ bụ ọbụna gbanwee ụzọ ndụ anyị?

Mgbe ụfọdụ ike nke ịgbaghara onye mejọrọ anyị nke ukwuu nwere ike dịka ọ gafere ebe aka anyị ruru.

Nke a bụ ozi ọma ahụ: Site na enyemaka nke Jizọs Kraịst, anyị enweghị oke n’ihe anyị nwere ike ime n’onwe anyị.

Enyemaka Nwanyị Ahụ Chọrọ

Otu Onye kwesịrị ike na Kraịst si Netherlands a kpọrọ Corrie ten Boom ji anya ya hụ ike ịrịọ Chineke ka o nyere ya bụ nwanyị aka ịgbaghara otu onye.

Ya na nwanne ya nwanyị Betsy ka atụrụrịị mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ n’oge Agha Mba Uwa nke Abụọ. Corrie na ndị ọzọ nagidere mmetọ ọjọọ site n’aka ndị nche ụlọ mkpọrọ ndị Nazi. Nwanne ya nwaanyi Betsy ọbụna nwụrụ n’ihi mmetọ ahụ. Corrie nyara ndụ.

Mgbe agha ahụ biri, Corrie chọpụtara ike ọgwụgwọ nke ịgbaghara ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-ekwupụta ozi ya n’ebe ọha na eze nọ. Mana otu ụbọchị e tinyere okwu ya na mnwale kachasị.

Mgbe o kwusịrị okwu n’ihu ọha, otu n’ime ndị nche ụlọ mkpọrọ kachasị nwee obi ọjọọ si n’ogige ndị ahụ bịakwutere Corrie.

Ọ gwara Corrie na ya abụrụwo Onye kwere na Kraịst kemgbe agha ahụ kwụsịrị ma o chegharịwo site n’ihe niile dị egwu o mere mgbe ọ bụ onye-nche ụlọ-mkpọrọ.

O wepụtara aka ya, sị, “I ga-agbaghara m?”

N’agbanyeghị ihe niile ọ mụtara ma kwusaa banyere ịgbaghara ndị ọzọ, Corrie enweghị ike ịnabata aka nwoke a ma gbaghara ya—ọ bụghị n’ike aka ya, n’agbanyeghị.

O mechara dee, “Ọbụna dịka echiche iwe, nke mmegwara siri na-anụ ọkụ n’ime m, a hụrụ m mmehie nke ha. … Onyenwe anyị Jizọs, e kpere m ekpere, gbaghara m ma nyere m aka ịgbaghara ya.

“Agbalịrị m ịmụmụ ọnụ ọchị, [ma] a gbalịsiri m ike iwelite aka m. Enwenwughị m ike. Enweghị m mmetụta ọ bụla, ọ bụghị nwaobere mmetụta mkpomọkụ ma ọbụ afọ ọma. Ma ya mere ọzọkwa e kpere m ekpere nwayọ. Jizọs, enweghị m ike ịgbaghara ya. Nye m mgbaghara Gị.

“Ka m jidere aka ya, ihe kachasị dị ịtụnanya mere. Site na ubu aka m ruo n’ogwe ogwe aka m ma gbada n’aka m, ihe yiri ka kọrent sitere n’aka m gakwuru ya, ebe n’ime obi m ịhụnanya maka onye ọbịa nke a kpalitere nke gaara akarị m.

“Ya mere a chọpụtara m na ọ bụghị na mgbaghara anyị ọzọ karịa na ịdị mma anyị ka ọgwụgwọ nke ụwa dabere, kama na nke Ya. Mgbe Ọ gwara anyị ka anyị hụ ndị iro anyị n’anya, Ọ na-enye, tinyere iwu ahụ, ịhụnanya ahụ n’onwe ya.”1

Chineke nọ n’ebe ahụ inyere gị aka idebe iwu-nsọ Ya niile, tinyekwara iwu nsọ nke ịgbaghara—ọbụna mgbe ọ siri ike. O nwere ike inyere gị aka dị nnọọ ka O nyeere Corrie ten Boom aka.

Ọgwụgwọ Ahụ Kwesịịrị Gị

Ndụ dị aghụghọ. O metọrọ emetọ. Ma nezie o jupụtara na ndi mmadu nwere ohere nhọrọ nke Chineke nyere.

N’oge ndị ahụ mgbe mmadụ mere nhọrọ nke na-ewetara gị nnukwu ihe mgbu—ma ọ bụ ọbụna mee otu ahụ na mberede—ị pụrụ ịnata ike ọgwụgwọ dịka ikpere ekpere maka enyemaka ma gbaa mbọ ịgbaghara.

Igbaghara ndị ọzọ na ewete ọgwụgwọ nye mkpụrụ obi gị. Site n’enyemaka Chineke, dị ka ị na-agbaghara onye mejọrọ gị, ị tụpụrụ ibu dị egwu site n’ubu aka gị nke nwere ike na-adọla gị azụ. Ọbụna mgbe ụzọ nke ezi ọgwụgwọ siri ike, site na Chineke, ị nweghị ike aga ije naanị gị.

Hụba-ama

  1. Corrie ten Boom, Ebe Nzuzo Ahụ (1971), 215.

  2. Jeffrey R. Holland, ọgbakọ zuru ọha Oct. 2018 (Ensign or Liahona, Nov. 2018, 79).

Bipụta