“Umụnne nwanyị Rollins Chekwara Ubọchị ahụ!” Friend, Jun 2021
Ozi Friend Kwa ọnwa, Jun 2021
Umụnne nwanyị Rollins Chekwara Ubọchị ahụ!
Jizọs Kraịst gwara Onye-amụma Josef Smith ọtụtụ ihe ndị dị mkpa iji nyere anyị aka. Nzukọ nsọ mepere ụlọ ọrụ mbipụta iji bipụta okwu Jizọs. N’ụzọ ahụ, ndị mmadụ ga-enwe ike ịgụ ha.
Otu ụbọchị, otu ndị ikom iwe na ewe bịara. Ha mebiri ụlọ ọrụ mbipụta ahụ. Ha tufuru ibe akwụkwọ ndị nke akwụkwọ nsọ na ama.
Umụnne nwanyị abụọ a kpọrọ Mary Elizabeth na Caroline Rollins hụrụ ihe mere. Ha gbara ọsọ ma chịkọta ibe akwụkwọ ndị ahụ n’ogwe aka ha.
Umụntakịrị nwanyị ahụ zoro n’ubi ọka ruo mgbe ndị ikom ahụ pụrụ. Ha echekwawo akwụkwọ nsọ ahụ! Akwụkwọ nsọ ndị ahụ mechara bụrụ akụkụ nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile.
Enwere m ike ịgụ akwụkwọ nsọ. Enwere m ike kaa obi ma kwụsie ike maka ihe m nkwenyere.
© 2021 by Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. E bipụtara na USA. Nkwado asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị-asụsụ: 6/19. Ntụghari-asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Jun 2021. Igbo. 17470 593