2021
Gịnị Bụ Chukwu ahụ?
Jun 2021


“Gịnị Bụ Chukwu ahụ??,” Liahona, Jun2021

Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jun 2021

Gịnị Bụ Chukwu ahụ?

Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraist, na Mmụọ Nsọ bụ ndị dị adị atọ dị iche iche nwere otu ebumnuche.

Foto, oyiyi
Ọhụ Nke Mbụ

Nkọwapụta sitere na Ọhụ nke mbụ,site n’aka Jon McNaughton

Onye odezi akwụkwọ nchịkọta akụkọ otu mgbe jụrụ Onye-amụma Josef Smith ihe ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi-ikpeazu a kwenyere. Na nzaghachi, Onye-amụma dere ahịrịokwu maka okwukwe 13 anyị kpọrọ Ndepụta nke Okwukwe. Ahịrịokwu nke mbụ sị, “Anyị kwere na Chineke, Nna nke Ebighi ebi, na n’Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na na Mmụọ Nsọ” (Ndepụta nke Okwukwe 1:1). Atọ ndị a mejupụtara ihe anyị na-akpọ Chukwu.

Chukwu, Nna Ebighi ebi

Chineke nwere anụ ahụ na ọkpụkpụ ndị bilitere n’ọnwụ. Ọ bụ Nna nke mmụọ anyị. Ọ hụrụ ụmụ Ya ọbụla n’anya n’ụzọ zuru oke. Chineke zuru oke, nwee ike niile, ma mara ihe niile. O ziri ezi, dị obi ebere, ma nwee obiọma. Anyị biiri dịka mmụọ binyere Chineke tupu a mụọ anyị. O zitere anyị n’ụwa ka anyị mụta ihe ma too. Ọchịchọ nke Chineke kachasị bụ ka onye ọbụla na ụmụ Ya lọghachi bịa binyere Ya ọzọ mgbe anyị nwụsịrị. Chineke na-akuziri anyị na anyị garịrị esoro Jizọs Kraịst ilaghachi n’ihu Chineke.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst Na-ekwusa Ozi ọma n’ime Ala Mmụọ

Kraịst Na-ekwusa Ozi ọma n’ime Ala Mmụọ, site naka Robert T. Barrett

Jizọs Kraịst

Jizọs Kraịst nwekwara anụ ahụ na ọkpụkpụ ndị bilitere n’ọnwụ. Ọ bụ Ọkpara nke Chineke. Tupu amụọ anyị, Chineke họọrọ Ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta anyị. Nke a pụtara na Jizọs bịara n’ụw ị bụ ihe ọmụmaatụ nyere anyị, kuzie ozi-ọma Ya, chụọ aja maka mmehie anyị, ma napụta anyị n’aka ọnwụ. N’ihi Jizọs Kraịst, a ga-agbaghara anyị mmehie anyị mgbe anyị chegharịrị. Jizọs Kraịst takwara ahụhụ ọtụtụ ihe ka O wee nwee ike ghọta ma nyere anyị aka. Jizọs Kraịst nwụrụ ma dịrịkwa ndụ ọzọ, mee ka ọ dị ire onye ọbụla ịdị ndụ ọzọ.

Foto, oyiyi
olili nke Kraist

Foto sitere n’aka Getty Images

Mmuọ Nsọ

Mmụọ Nsọ bụ onye otu Chukwu onye nke na-enweghị anụ ahụ. Ọ bụ mmụọ. Mmụọ Nsọ nwere ike ịgwa mmụọ anyị okwu n’onwe ya. Ọ na-agbara anyị ama na Chineke dị ire ma na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Mmụọ Nsọ na-arụ ọrụ dịka onye ozi nke Chineke inye anyị mmetụta nke ịhụnaanya, nduzi, ma ọ bụ nkasi obi. Mgbe emere anyị baptizim ma mee anyị onye otu, anyị na-anata onyinye nke Mmụọ Nsọ. Mgbe anyị mesịrị baptizim, Mmụọ Nsọ nwere ike ịnọnyere anyị oge niile ka anyị na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke.

Foto, oyiyi
Ọhụ Nke Mbụ

Ọhụ Nke Mbụ, site n’aka Walter Rane

Ọhụ Nke Mbụ nke Josef Smith

Kemgbe ndị mmadụ enwewo mgbagwoju anya banyere Chukwu. Ndị mmadụ ekwenyeghi n’ihe gbasara otu Chineke, Jizọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ dịcha ka ya. Nke a bụ otu ihe mere Ọhụ nke Mbụ nke Joseph Smith nwere ji dị oke mkpa. Ọ hụrụ na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nwere anụ ahụ ma bụrụ ndị abụọ dị iche iche.

Foto, oyiyi
Ige ntị

Ige ntị, site n’aka Michael Jarvis Nelson

Dị iche iche mana Dịrị n’otu

Akwụkwọ nsọ na ndị amụma nke oge a na-akụziri anyị na Chineke, Jizọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ bụ ndị dị iche iche nwere otu ebumnuche: anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi anyị (lee Mozis 1:39). Dị ka ndị otu ụdị otu, Ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nyere anyị aka ụbọchị niile. Anyị nwere ike nwee mmetụta ịnọ Ha nso mgbe anyị chegharịrị na mmehie anyị ma họrọ nke ziri ezi.

Akwụkwọ Nsọ banyere Chukwu

  • Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst bụ otu na ebumnuche (lee Jọn 10:30).

  • Nna nke Eluigwe gwara Ọkpara Ya okwu (lee Matiu 3:16–17).

  • Jizọs Kraịst gwara Nna Ya okwu (lee Jọn 11:41).

  • Jizọs Kraịst kpere ekpere ka anyị bụrụ otu otu ụbọchị (lee Jọn 17:11).

  • Josef Smith hụrụ Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst (lee Josef Smith—Agụgụala 1:17).

  • Mmụọ Nsọ na-agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị (lee Jọn 15:26).

Bipụta