2021
Mee Ihe Ziri ezi
Julaị 2021


“Mee Ihe Ziri ezi,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Julaị 2021, 18-19.

Ozi Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Kwa Ọnwa, Julaị 2021

Mee Ihe Ziri ezi

Idedata echiche gị dịka ị na-amụ akwụkwọ nsọ nwere ike n’ezie nyere gị aka mụta.

“Mgbe niile m bidoro ịgụ akwụkwọ nsọ, m na-ada n’ụra!” otu onye mgbasa ozi ọma gwara onyeisi mishọn ya. Ọ dị ka akwụkwọ nsọ bụ ọgwụ ụra!”

Onyeisi ya zaghachịrị, “Ị nakwa ededata ihe mgbe ị na-agụ ihe ọgụgụ?”

“Mba,” ka onye mgbasa ozi ọma kwuru.

“Ọ dị mfe ihi ụra ma ọbụ uche gị ịkpafu mgbe ị na-agụ agụ naanị,” ka onyeisi ahụ kwuru, “mana ọgaghị ekwe omume mgbe ị gbakwunyere odide ihe!”

Ndụmọdụ onyeisi mishọn nke a nyere onye mgbasa ozi ọma ya na-agba mbọ mepụtara nnukwu ọdịiche. Ya mere ọbụrụ na ị na-achọ ụzọ ọhụrụ iji kwalite ọmụmụ akwụkwọ-nsọ gị, ńwaa ya. Dịka i na-ede banyere ihe ị na-agụ, ị ga-ahụ onwe gị ịkacha itinye uche ma na-amụtazi karịa, kwa.

Ndịa bụ ụzọ ndị anyị hụtara bara ezigbo uru.

Nwanne nwoke Steven Lund:

Foto, oyiyi
Steven Lund

A na m edebe akwụkwọ nso mgbe m na-agụ ihe. Otu Mmụọ si akpali m na-oge m na-amụ ihe, a na m ededata nkwagide ndị ahụ.

E nwetere m echiche a site n’aka Okenye Richard G. Scott (1928–2015) nke Kworum nke Ndị ozi Iri na Abụọ, onye sịrị: “Dedata n’ebe nwere nchekwa ihe ndị dị mkpa ị mụtara site na Mmụọ ahụ. Ị ga-achọpụta na dịka ị na-ededata mmetụta ndị ahụ dị oke mkpa, ọtụtụ mgbe ndị ọzọ ga-abịa. Nakwa, mmata ị nwetere ga-adịgide oge ndụ gị niile” (“I Nwete Mmụta na Ume Iji Ya Mee ihe N’ụzọ dị mma,” Ensign, Jun 2002, 32).

A maara m na okwu ndị ahụ bụ eziokwu. Ka m na-akwado okwu na ihe ọmụmụ nịịle, anaghị m aga naanị na akwụkwọ nsọ kama nakwa ihe m dedatara mgbe m na-agụ ha.

Nwanne nwoke Ahmad Corbitt:

Foto, oyiyi
Ahmad Corbitt

Ọ na-amasị m ịmụ ihe site n’isiokwu. A na m agụ akwụkwọ nsọ site na mmalite ruo na nsọtụ, mana ọ na-amasịkwa m ilegharị anya gburugburu ma mụọ isiokwu ndị nọ ya. N’ịmaatụ, a ga m e site na Topical Guide ịchọta akwụkwọ nsọ ndị gbasara okwukwe ma ọbụ mkpokọta nke Israel. Ọbụghị naanị na m na-ede ihe odide, kama a na m ededata ihe m na-amụta iji doo anya na m na aghọta nke ọma. Ọ na-atụ m nanya mgbe niile otu m si aghọta ihe nke ọma mgbe m na-eme nke a. A na m ahọrọkwa ụfọdụ akwụkwọ nsọ ibu n’isi.

Nwanne nwoke Bradley Wilcox:

Foto, oyiyi
Bradley Wilcox

A na m edebe jonalụ ọmụmụ ihe ebe m n’ede akwụkwọ nsọ n’okwu nke m. N’ịmaatụ, “Nihi na mmadụ anụ ahụ bụ onye iro nye Chineke” (Mosiah 3:19) na-abụrụ “Nihi na mmadụ mpako na onye n’enweghị nchegharị na ahọrọ ịbụ onye iro nye Chineke, mana Chineke abụghị onye iro ya. Chineke bụ enyi kachasị enyi ya.”

A nakwa m ede ajụjụ niile. Ha nwere ike bụrụ ajụjụ ndị m n’eche echiche banyere ha tupu mụ agụọ, ma ọbụ ha nwere ike bụrụ ajụjụ ndị dapụtara site na ihe m na-agụ. N’ụzọ nke ọbụla, ọ na-eme ka uche m dịrị na ya.

Ike nke Ide Echiche Gị nịịle

Onye ọbụla n’ime anyị n’otu ndịisi anyị na-amụ akwụkwọ nsọ n’ụzọ dị iche iche, mana anyị niile na-ede ka anyị na-agụ!

Ịgụ agụ na-enyere anyị aka echiche na mmetụta ịbanye niime anyị. Nke ahụ dị mkpa. Ma mgbe anyị na-ekwu ma ọbụ na-ede, anyị na-achọpụta ma na-egosipụta echiche na mmetụta niile sitere n’ime pụta. Ọ na-emetụ anyị na nke ahụ na-enyere anyị aka nabata eziokwu nke ozi ọma n’onwe anyị.

Otu nwata nwoke chọpụtara eziokwu nkea n’onwe ya mgbe a gwara ya ka o kwuo okwu na nzukọ oriri nsọ. Ọ nụwo ka ọtụtụ ndị ọzọ kwuworo okwu mana o chetaghị ihe ndị so na ya. Oge nkea pụrụ iche. Mgbe o dere isiokwu maka okwu nke ya onwe ya, ọbụghị nanị na o nyeere ya aka kwuo okwu ahaziri nke ọma, kama o chetere ya ogologo oge.

Otu ụdị ihe ahụ nwere ike mee na ọmụmụ akwụkwọ nsọ gị. Ọbụrụ na ị na-adaba n’ụra mgbe i mepere akwụkwọ nsọ gị, oge eruwo iteta. Gbalịa iwepụta otu pencil, pen, ekwe ntị, ma ọbụ kọmputa ma bido ide ihe. Ọ ga-atụ gị n’anya n’ụdị ọdịiche o nwere ike ime!

Bipụta