2021
Nna Anyị nke Eluigwe Chọrọ ka Anyị Nwee Ańụrị
Julaị 2021


“Nna Anyị nke Eluigwe Chọrọ ka Anyị Nwee Ańụrị,” Liahona, Julaị 2021

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Julaị 2021

Nna Anyị nke Eluigwe Chọrọ ka Anyị Nwee Ańụrị

Ka anyị na-echeta atụmatụ nke ańụrị nke Chineke, anyị nwere ike chọta ọńụ ọbụna mgbe ndụ siri ike.

Foto, oyiyi
Kraịst na ụmụntakịrị

Tupu amụọ anyị nelu ụwa, anyị niile na Nna nke Eluigwe biiri dịka ụmụ mmụọ Ya. O gosịrị anyị otu atụmatụ iji nyere ụmụ Ya aka mụọ ihe ma too eto. Site na atụmatụ Ya, anyị nwere ike dịkarịa ka Ya ma tozuo oke inwe ọńụ ndụ ebighị ebi. Atụmatụ nke a dị ire n’ihi Ọkpara nke Chineke, Jizọs Kraist, bịara n’ụwa ịta ahụhụ maka mmehie anyị, aja akpọrọ Aja mgbaghara mmehie.

Atụmatụ nke Nna nke Eluigwe ka akpọrọ atụmatụ nke

Dị ka ndịa na akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-egosi, Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị dịrịzie ka Ya, laghachikwute Ya, ma nwee ezi ańụrị (lee Moses 1:39).

Anyị Na-abịa n’Ụwa Ịmụ ihe ma Too etoo

Chineke zitere anyị n’ụwa, ebe anyị ga-enwe ike nwete anụ ahụ (lee Jenesis 1:26–27). Anyị nwere mkpa anụ ahụ iji nyere anyị aka nweta nhụmiihe nke ndụ n’elu ụwa.

Chineke maara na anyị agaghị enwe ańụrị oge niile. Anyị na-agabiga ndakpọ olileanya, mgbu, ma ọbụna ọnwụ. Mana site na ihe aka mgba niile nke ndụ, Nna nke Eluigwe na-enyere anyị aka mụta ihe ma too etoo.

Chineke nyekwara anyị ohere nhọrọ, ike nke ịhọrọ site n’etiti ihe dị mma na ihe ọjọọ. Ọ na-ekwe ka anyị họrọ na onwe anyị ihe anyị chere ma na-eme. O nyewo anyị akwụkwọ nsọ na ndị amụma dị ndụ inyere anyị aka mụọ ịhọrọ ihe ziri ezi (lee Ebraham 3:25).

Foto, oyiyi
osisi nke ndụ

Gbalịa ị Dị ka Jizọs Kraist

Chineke ezipụtaghị anyị n’ụwa n’enweghị ihe ọmụmatụ a ga-eso (lee Jọn 13:15). O zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, igosi anyị ụzọ ahụ. Ịmụta otu esi esoro Ya, anyị nwere ike gụọ akwụkwọ nsọ ịmụta onye Ọ bụ na ihe O mere n’oge ndụ Ya n’elu ụwa. Anyị nwekwara ike mee otu ọ kachasị anyị mma ị dị ka Kraịst site n’irubere Chineke isi ma hụ ndị ọzọ n’anya.

Mgbe anyị jeghere, anyị arịọ maka mgbaghara ma dọrọ ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist iji nyere anyị aka gbanwee. Anyị nwere ike nwee ańụrị dịka anyị na-agbalị kwa ụbọchị ịdịkarị ka Ya.

Ọnwụ Abụghị Njedebe

Mgbe anyị nwụrụ, mmụọ anyị na-aga n’ụwa mmụọ. Ebe ahụ anyị na-aganiihu ịmụta ihe dị ka anyị na-akwado maka Mbilite n’ọnwụ

N’oge Mbilite n’ọnwụ, ahụ anyị na mmụọ anyị ga-ezukọta. Ahụ anyị ga-ezu oke, ma anyị agaghị ata ahụhụ ọnwụ ma ọbụ ọrịa ọzọ (lee Alma 11:44–45). Dịkwa ka Jizọs Kraist nwụrụ ma dịkwa ndụ ọzọ, anyị niile ga-adị ndụ ọzọ.

Mgbe Chineke ga-ekpe anyị ikpe, Ọ ga-atụle omume anyị na ọchịchọ anyị. Ọbụrụ na anyị agbalịwo idebe iwu nsọ niile na nkwa niile anyị kwere nye Nna nke Eluigwe, mgbe ahụ anyị na Ya nwere ike bie ndụ ọzọ.

Ndụ anyị na Chineke na Ezi na ụlọ Anyị n’Eluigwe.

N’ime alaeze celestial, anyị ga-ebikwuru Chineke na Jizọs Kraist. Anyị ga-enwekwa ike biri ebe ahụ anyị na ndị ezi na ụlọ anyị ruo ebighị ebi ọbụrụ na anyị na ha arachịkọta ọnụ. Anyị ga-achọta udo, ańụrị, na ezumike (lee Mosiah 2:41).

Ndụ anyị n’elu ụwa mgbe ụfọdụ nwere ike sie ike, mana ọbụrụ na anyị soro Jizọs Kraist, anyị nwere ike chọta ọńụ nime ndụ nke a na ańụrị dị ebighị ebi nime ndụ na-abịa abịa.

Gịnị Ka Akwụkwọ nsọ N’ekwu banyere Atụmatụ nke Ańụrị?

Otu anyị si ebi ndụ anyị dị mkpa. Chineke ga-ekpe anyị ikpe ma kwụọ anyị ụgwọ dịka otu echiche anyị na omume ihe anyị siri dị (lee Alma 41:3).

Setan bụ onye iro nke ańụrị anyị. Ọ na-anwa anyị ijitọsị ndụ anyị n’ụwa ma mee njọ. Ọ chọrọ ka anyị nwee obi ọjọọ dịka ya (lee 2 Nifaị 2:27).

Mgbe anyị nwere okwukwe nime atụmatụ nke Chineke nwere maka anyị, anyị ga-enwe udo n’agbanyeghị nnwale ndị anyị na-ezute. Anyị nwere ike nwee olileanya ibi ndụ ebighị ebi anyị na Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:23).

Ọrụnka niile sitere n’aka J. Kirk Richards

Bipụta