2021
Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị
Nọvemba 2021


Ozi LiahonaKwa ọnwa, Nọvemba 2021

18:59

Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị

Mgbe ọbụla ụdị ihe ọgba aghara ọbụla mere niime ndụ gị, ebe kachasị mma iji nwee nchekwa ime mmụọ bụ ibi ndụ niime ọgbụgbandụ gị niile nke tempụl!

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, obi m juru n’ekele ịnọnyere unu n’ụtụtụ a ịkọrọ unu mmetụta niile nke obi m.

Dị ka unu maara, anyị na-arụgharị ọtụtụ ihe na Tempụl nke Salt Lake dị mkpa na-agụgụala. Nnukwu ọrụ nke a gụnyere ime ka ntọala nsinambụ sikwuo ike, bụ nke rụwooro ọrụ nke ọma ihe karịrị otu narị afọ. Mana tempụl nke a garịrị a nọ karịa oge ndị ọzọ. Na ngwụcha Me, a gara m mee nleta ọganiihu nke nnukwu ọrụ nke a. E chere m na ọ ga-amasị unu ịhụ ihe mụ na nwunye m Wendy hụrụ. Eche m na unu ga-ahụta ihe kpatara abụ nke a “How Firm a Foundation”1jiri bịa nwee nkọwa ọhụrụ nye anyị.

2:4

Vidio nke si n’ebe a na-eme nrụgharị nke Tempụl Salt Lake: “Anyị na-ekiri ntọala nsinambụ nke Tempụl Salt Lake. Ebe a m guzoro nọ n’okpuru ihe bụbuuru Garden Room. Dị ka m n’ekiri nka ọrụaka nke ụlọ nke a niile, ọ tụrụ m n’anya ihe ndị ahụ bu ụzọ mepụtara. O juru m ọnụ mgbe m tulere na ha wuru ọmarịcha tempụl nke a naanị ijiri ngwa ọrụ na usoro ọrụ ndị nke dịịrị ha mgbe ahụ ihe karịrị otu narị afọ gara aga.

“Kemgbe ọtụtụ iri afọ ndị a gafere, otu osila dị, ọ bụrụ na anyị elezie anya nke ọma na ntọala ahụ, anyị ga-ahụ mpụtara niile nke mbuze, oghere ndị dị n’ọrụokwute nsinambụ, na ọtụtụ ogo nkwụsiike dị iche iche n’ọrụ ido blọk ahụ.

“Ugbua dị ka m n’ekiri ihe ndị injinia oge ugbu a, ndị na-ese ụlọ, na ndị diọka n’iwu ụlọ nwere ike ime iji mee ka ntọala nsinambụ ahụ sikwuo ike, ọ n’atụ m n’anya nke ukwuu. Ọrụ ha dị ebube!

“Ntọala nke ụlọ ọbụla, nke ka nke, ụdị nke dị nnukwu ka nke a, garịrị esi ike ma kwụrụ chịm na-agbanyeghị ọnọdụ ọbụla ruo imegide ala ọma jijiji niile, ịta nchara, oke ikuku, na ihe ndị na-ahaghị ịdị nke na-emetụta ụlọ niiile. Ọrụ a siri ike nke ime ka o sie ike na-aganiihu ugbua ga-eme ka tempụl nke a dị nsọ nwee ntọala sikwuru ike nke ga-enwe ike ma ga-anọgide oge niile.”

Nrụgharị Tempụl Salt Lake

Anyị anaghị asọ ihe ọbụla ọ g’eri iji nye tempụl nke a nwere ugwu, nke adịghị ike ya na-amụbawanye, ntọala nke ga-anagide ike niile nke eke ruo na Millennium. N’otu aka ahụ, ugbua bụ oge nke anyị g’eji tinye usoro ndị pụrụ iche n’ọrụ—elemanya usoro ihe ndị anyị emetụbeghị mbụ—iji kwadosie ike ntọala nke ịdị ike nke ime mmụọ nke onwe anyị. Oge a na-ahụtubeghị mbụ ka a na-etinye usoro ndị a na etinyebeghị mbụ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a bụ ubọchị ikpeazụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na mụ na gị ga-anagide ihe egwu niile na ibu arọ niile n’abịa niihu, ọ dị oke mkpa na onye ọbụla nime anyị g’enwe ntọala nke mmụọ siri ike nke ewuru n’elu oke nkume nke Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst.2

Ya mere, a na m ajụ onye ọbụla niime unu, “kedụ otu ntọala gịsiri sie ike? Ma olee ihe ndị ị chọrọ iji eme ka ịgba ama na nghọta nke ozi ọma gị sikwuo ike bụrụ ihe ndị a chọrọ?

Tempụl bụ isi ihe na-enye okwukwe anyị na obi ike nke ime mmụọ anyị mgbam ume niihi na Onye Nzọpụta na ozizi Ya bụ ebe tempụl hiwere isi. Ihe niile a na-akuzi niime tempụl, site na ntụzi aka na site na Mmụọ, n’eme ka nghọta anyị banyere Jizọs Kraịst na-abawanye. Emume nsọ Ya niile dị oke mkpa n’ekekọta anyị na Ya site na ọgbụgbandụ niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Mgbe ahụ, dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, Ọ n’enye anyị onyinye ọgwụgwọ Ya nke n’enye ike.3 Ma oh, lee ka anyị ga-esi a chọ ike nke Ya nime ụbọchị ndị n’abịa nihu.

Ekwewo anyị nkwa na “ọ bụrụ na [anyị] nọrọ na njikere [anyị] agaghị atụ egwu.”4 Okwu mmasi obi ike nke a nwere ihe nnukwu mpụta ihè taa. Onyenwe anyị amawo ọkwa na na-agbanyeghi ihe ima aka nke taa ndị a na-ahụtụbeghi mbụ, ndị ahụ n’ewu ntọala ha n’elu Jizọs Kraịst, ma mụtawo otu esi a dọrọ ike Ya, ekwesịghị idaba niime ihe obi ịlọ mmiri nke oge a pụrụ iche.

Emume nsọ niile na Ọgbụgba ndụ niile nke Tempụl dị kemgbe gboo. Onyenwe anyị kụziri Adam and Iv ikpe ekpere, ịmee ọgbụgbandụ niile ma ọtụ esi achụ aja.5 Na-ezie, “oge ọbụla Onyenwe anyị nwere ndị mmadụ n’elu ụwa ndị n’erube isi n’okwu Ya, enyewo ha iwu maka iwu tempụl niile.”6 Akwụkwọ nsọ niile juputara na nrụtụaka niile nye nkuzi niile nke tempụl, uwe, asụsụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.7 Ihe niile anyị kwenyere na nkwa niile nke Chineke meworo nye ndị Ya ndị gbara ndụ na-abịakọta ọnụ niime tempụl. Niime oge ọbụla, tempụl egosipụtawo ezi okwu dị oke mkpa na ndị ahụ na-eme ọgbụgba ndụ ha na Chineke ma dobe ha bụ ụmụ nke ọgbụgbandụ.

Nihi nke a, nime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na Chineke nwere ike mee otu ụdịrị ọgbụgba ndụ ahụ nke Abraham, Isaac na Jacob mere. Ma anyị ga-enwe ike natakwa otu ụdịrị ngọzị niile ahụ!

Tempụl nke Kirtland na nke Nauvoo

Tempụl abụrụworịị akụkụ nke ndudugandu nke a site na gboo gboo ya.8 Elaịja nyefere ọtụghe niile nke ikike nrachi n’aka Josef Smit niime Tempụl Kirtland. Ọkwa nchụ aja n’uju ya ka eweghachitere nime Tempụl Nauvoo.9

Tutu ruo ogbugbu ya dị ka onye nsọ, Josepf Smit gara niihu na-anata mkpughe niile nke garaniihu mejupụta mweghachite nke emume nsọ nke onyinye dị nsọ na nke nrachi.10 Otu osila dị, ọ matara na, ọ dị mkpa imezigharị ya. Mgbe e nyechara Brigham Young onyinye dị nsọ na Me 1842, Joseph gwara Brigham, “Ahazighị nke a nke ọma, mana anyị emewo otu anyị kachasị nwee ike ime n’ọkpuru ọnọdụ ndị nke edobere anyị, ma ọ bụ ọchịchọ m na ị ga-etinye okwu a n’uche gị ma hazie emume niile ndịa n’usoro.”11

Mgbe Onye amụma nwụrụ, Onyeisi Young hụrụ maka nrụcha nke Tempụl Nauvoo12 ma mesịa wuo ọtụtụ tempụl na Mpaghara nke Utah. Na mmemme ido nsọ nke ụlọ ala nke tempụl St. George, Brigham Young mara ọkwa ọkụ ọkụ banyere ọsịsọ ọrụ nnọchị anya nke tempụl dị mgbe o kwuru, “Mgbe ọ bụla m chere echiche banyere isiokwu nke a, A chọrọ m ka ire nke egbe eluigwe asaa kpọlite ndị mmadụ n’ụra.”13

Bido n’oge ahụ gawa niihu, emume nsọ niile nke tempụl ka a na-emegharị mgbe na mgbe. Onyeisi Harold B. Lee kọwara ihe kpatara usoro ndịa, iwu ndịa, na ọbụla otu esi eme emume nsọ niile nke tempụl ji aganiihu agbanwe niime Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta eweghachitere. Onyeisi Lee kwuru: “Ụkpụrụ niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ihe si n’igwe. Enweghị mmadụ na-agbanwe ụkpụrụ niile na [ozizi] nke Nzukọ nsọ ma ọ bụghị Onyenwe anyị site na mkpughe. Mana ọtụtụ usoro na-agbanwe dị ka ntuzi aka nke mmụọ kpalitere na-abịara ndị ahụ na-anọ n’isi n’oge ọbụla.”14

Leebagodi anya otu inye oriri nsọ si wee gbanwee kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga. N’oge mbụ, mmiri nke oriri nsọ ka a naara enye igwe ndị ọgbakọ site n’otu nnukwu arịa. Onye ọbụla n’esi nime ya an̄ụ. Ugbua anyị n’eji iko ndị nke onye ọbụla n̄ụchaa o tufuo. Usoro ahụ gbanwere, mana ọgbụgba ndụ ndị ahụ nọkwa bụrụ otu ụdị ihe ahụ.

Tụgharịa uche na eziokwu atọ ndịa:

  1. Mweghachite ahụ bụ usoro, ọ bụghị otu mmemme, ma ọ ga-aganiihu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-abịa ọzọ.

  2. Ebumnobi kacha ibe ya nke mkpokọta Izrel15bụ ịwete ngọzi niile nke tempụl nye ụmụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.

  3. Dịka anyị n’achọ otu esi emezu ebumnobi ahụ n’ụzọ kacha dị nkọ, Onyenwe anyị ekpughekwuo nghọta ihe ndị ọzọ. Mweghachite na-aganiihu chọkwara mkpughe nke na-aganiihu.

Otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ ajụwọ Onyenwe anyị ajụjụ ọtụtụ mgbe ma e nwere ụzọ ndị kacha mma iji wegara ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi ngọzi niile nke tempụl. Anyị n’achọ ntụzi aka mgbe niile maka otu eji eme ka nkụzi nke tempụl, ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ nille nọgide ka esi chọọ na enweghị mgbanwe na gburugburu ụwa na-agbanyeghi ndịiche niile dị n’asụsụ na omenaala.

N’okpuru ntuzi aka nke Onyenwe anyị ma n’aziza nye ekpere anyị, enwere ufọdụ mgbanwe usoro ndị e meworo n’oge n’adịghị anya. bụ ya bụ Onye chọrọ ka ị ghọta n’ezi uche doro anya kpọm kwem ihe ndị ị na-agba ndụ na ị ga-eme. bụ ya bụ Onye chọrọ ka ị nwete nhụmiihe n’uju emume nsọ Ya niile dị nsọ. chọrọ ka ị ghọta nke ọma ohere dị iche iche, nkwa niile na oke n’ọrụ niile i nwere. chọrọ ka ị nwee mmata ihe nke ime mmụọ na nghọta ihe ndị ị na-enwetụbeghi na mbụ. Ihe nke a ka Ọ chọrọ maka ndị petron niile nke tempụl, na-agbanyeghị ebe ha bi.

Mgbanwe ndị nke a emeworo ugbua n’usoro niile nke tempụl, ma ndị ọzọ ga-esochi, bụ eziokwu na-aganiihu egosi na Onyenwe anyị nọ nnọọ n’edu Nzukọ nsọ Ya. Ọ na-arọpụta ọtụtụ ohere maka onye ọbụla nime anyị ime ka ntọala nke ime mmụọ anyị sikwuo ike site n’ịme ka ndụ anyị dabere na Ya na n’elu emume nsọ na ọgbụgbandụ niile nke tempụl Ya. Mgbe ọbụla ị jiri rekọmendị tempụl gị, obi dị nchegharị, na uche na-achọ mmụta bịa nime ụlọ ọmụmụ ihe nke Onyenwe anyị, ga-akụziri gị ihe.

Ọ bụ na ịdị anya, ima aka nke ahụike, ma ọ bụ ihe ndọla azụ ndị ọzọ gbochiri gị agala tempụl ruo nwa mgbe nta, a na m akpoku gị ka ihiwe oge mgbe na mgbe iji mụgharịa n’uche gị ọgbụgba ndụ ndị ahụ ị meworo.

Ọ bụrụ na ibidobeghi hụwa ije tempụl nanya, gakwuo ọtụtụ mgbe—na-abụghị ị ga mgbe i chetara. Hapụ ka Onyenwe anyị, site na Mmụọ Ya, kuzie ihe ma kpakee mmụọ gị ebe ahụ. A na m ekwe gị nkwa na mgbe oge gasịrị, tempụl ahụ ga-abụ ebe nchekwa, ebe nkasị obi, na ebe mkpughe.

Ọ bụrụ n’ọga ekwe m omume ikwu n’ihu n’ihu mụ na onye ntoroọbịa ọbụla, a ga m arịọ gị ka ị chọọ onye nsiso onye e nwere ike ịrachi gị na ya niime tempụl. Ị nwere ike na-eche kedụ ihe dị iche nke a g’eme nime ndụ gị. A na m ekwe gị nkwa n’ọga eme ihe niile dị iche! Dị ka ị na-agba akwụkwọ nime tempụl, ma na-alọghachi ugboro ugboro, a ga-agba gị ume ma duzie gị na mkpebi gị niile.

Ọ bụrụ na m nwere ike ikwuru di mọbụ nwunye ọbụla okwu onye nke nọkwarịrịị na-emebeghị nrachi na tempụl, a ga m arịọ gị ka i mee ihe ndị dị mkpa iji nata emume nsọ nke ahụ nwere okpueze ma na-agbanwe ndụ.16 Ọ g’eme ihe dị iche? Naanị mọbụrụ na ịchọrọ ịganiihu ruo ebighi ebi ma nọkọọ ọnụ ruo ebighi ebi. Ị nwe ọchịchọ obi ị nọkọ ọnụ ruo ebighi ebi agaghị eme ka ọ dịrị otu ahụ. Enweghi emume ọbụla mọbụ nkwekọrịta ọbụla nwere ime ka ọ dị otu a.17

Ọ bụrụ na m nwere ike ikwuru nwoke mọbụ nwanyị ọbụla okwu nke nwere mmasị alụm di na nwunye mana ọ hụbeghi onye nsiso ebighi ebi nke ya, a na m arịọsi gị ike ka ị ghara iche tutu ruo agbam akwụkwọ ị nata onyinye dị nsọ gị n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Bido ugbua ịmụta na inwete nhụmihe ihe ọ pụtara ijiri ike nke ọkwa nchụaja kwara ngwa agha.

Ma nye onye ọbụla nime unu onye meworo ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, a na m arịọ gị ka ị chọọ—site na ekpere na na-esepụghị aka—iji ghọta ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nke tempụl.18 Uzọ nke ime mmụọ niile g’emeghe. Ị ga-amụta otu esi emeghetụ akwa mgbochi dị n’etiti eluigwe na ụwa, otu esi arịọ Chineke maka ndị mmụọ ozi ị nọnyere gị, na otu dị mma karịa eji anata ntuzi aka si n’eluigwe. Mgbalị gị niile di uchu ime otu ahụg’eme ka ntọala nke ime mmụọ gị sikwuo ike.

Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị, mgbe a ga-arụcha mmezigharị nime nke Tempụl nke Salt Lake, agaghị enwe ebe kacha nwe nchekwamgbe ala ọma jijiji g’eme n’ebe niile nke Ndagwurugwu nke Salt Lake karịa nime tempụl ahụ.

N’otu aka ahụ, mgbe ọbụla enwere ihe ọgba aghara mere nime ndụ gị, ebe nchekwa kacha ibe ya bụ ibiniime mmụọ ọgbụgba ndụ gị niile nke tempụl!

Jizọs Kraịst

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, site n’aka Del Parson

Biko kwere okwu m mgbe m kwuru na mgbe e wusiri ntọala nke ime mmụọ gị ike n’elu Jizọs Kraịst, i kwesịghị ịtu egwu. Dị ka ị na-akwụsị ike n’ọgbụgba ndụ niile ị mere niime tempụl, a ga-agba gị ume site n’ike Ya. Mgbe ahụ, mgbe ala ọma jijiji nke ime mmụọ mere, ị g’enwe ike guzosie ike nihi ntọala nke ime mmụọ gị siri ike ma kwụrụ chịm.

A hụrụ m unu naanya ezi ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị. Eziokwu ndịa ka m maara: Chineke, Nna anyị nke Eluigwe chọọrọ ka họọrọ ịbịa n’ebe obibi Ya. Atụmatụ ya maka ọganiihu nke ebighị ebi agbagwojughị anya, ma ọ na-akwanyere ohere nhọrọ gị ugwu. Ọ dị gị n’aka ị họrọ onye ị g’abụ—na onye ị chọrọ ka gị na ya nọrọ—niime ụwa na-abịa abịa!

Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ! Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya, eweghachitere iji nyere gị aka mezuo akara aka gị dị nsọ. A na m esi otu a agba ama n’aha nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee “How Firm a Foundation,” Abụ,no. 85.

  2. Nke ọ ga-abụ na “mgbe ekwensu [zipụrụ] [ikuku] ike ya, … ọ gaghị enwe ike nʼahụ [anyị] … n’ihi nkume ahụ nʼelu nke e wuru [anyị], nke bụ ezigbo ntọala, ntọala nʼelu nke ọ bụrụ na ụmụ mmadụ wuo ha agaghị ada” (Helaman 5:12; nkwusi ike ka agbakwunyere).

  3. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 109:15, 22

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:55

  5. Lee Moses 5:5–6

  6. Ọkọwa okwu Baịbụl, “Tempụl.”

  7. Na-ịmaatụ, lee Ọpụpụ 28; 29; Levitikọs 8. Ụlọikwuu nke Mosis ka a maara dịka “ụlọikwuu nke ịgba ama” (Ọnụ ọgụgụ 9:15) na “ụlọikwuu nke ịgba ama” (Ọpụpụ 38:21). E bibiri tempụl nke Solomon na 587 BC, naanị afọ ole na ole mgbe ezi na ụlọ Lehi hapụrụ Jerusalem. Mweghachite nke tempụl nke a site n’aka Zerubbabel mere mgbe afọ 70 gasịrị. Ọkụ mesịrị gbaa ya na 37 BC. Herod wusara tempụl ahụ ihe dị ka na 16 BC. Emesịa tempụl nke a, nke Jizọs maara, ka e bibiri na AD 70. Nefi nwere nhụmihe yiri nke tempụl site n’ịga “n’elu ugwu ọtụtụ mgbe” i kpe ekpere (1 Nefi 18:3) ma mesịa, n’ala Amerika, wuo otu tempụl “n’ụdị owuwu dị ka tempụl nke Solomon,” na-agbanyeghị na-achọrọ ya mma n’ụzọ dị ntakịrị (lee 2 Nefi 5:16).

  8. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:119; 124:31

  9. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:13–16; 124:28. Nkuku ụlọ nke Tempụl Nauvoo ka eliri na Eprel 6, 1841, naanị ọnwa ole na ole oge Josef Smit natasịrị mkpughe iwu ya. Tempụl Nauvoo nwere ọrụ ndị a gbakwunyere ya. Na-ịmaatụ, Onyenwe anyị kọwara na ebe a na-eme baptizim dị mkpa maka Ndị nsọ ime baptizim maka ndị ahụ nwụrụ anwụ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 124:29–30).

  10. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 131; 132. Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 128 nwere niime ya ozi Josef Smit degara ndị nsọ banyere baptizim maka ndị nwụrụ anwụ. N’ebe ahụ ka ọ mara ọkwa na nzọpụta nke ndị nwụrụ anwụ “dị mkpa ma dị oke mkpa nye nzọpụta anyị, … [niihi na] ma ọ bụghị ma anyị ha agaghị a bụ ndị e mere ka ha zuo oke—ma ọ bụghị ma anyị nwere ike ma ndị anyị nwụrụ anwụ anọghị ịbụ ndị a ga-eme ka e zuo oke” (amaokwu 15).

  11. Josef Smit, nime Ndị nsọ: Akụkọ ahụ nke Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nime Ụbọchị nile Ikpeazụvol. 1, Ihe Nlere anya ahụ nke Eziokwu, 1815–18462018), 454.

  12. “Onye ndekọ Agụgụala nke Nzukọ nsọ George A. Smith kwubiri na ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị dị 5,634 natara onyinye dị nsọ nke ha niime Tempụl Nauvoo na-arụchabeghị na Dizember 1845 na Jenụwarị 1846. Nrachi nke ndị di na nwunye garaniihu bido na Feb. 7, [1846,] mgbe ahụ ihe karịrị di na nwunye dị 2000 ka ejikọtara ọnụ site n’ọkwa nchụaja maka oge na ebighi ebi” (Bruce A. Van Orden, “Temple Finished before Exodus,” Deseret News, Dec. 9, 1995, deseret.com; see also Richard O. Cowan, “Endowments Bless the Living and Dead,” Church News, Aug. 27, 1988, thechurchnews.com).

  13. “Kedụ ihe i chere ndị nna nna ha ga-ekwu ma ọ bụrụ na ha nwere ike ikwu okwu site n’ala mmụọ? Ọ bụ na ha agaghị asị, ‘Anyị edinawo ebe a puku kwuru puku afọ, ebe a nime ụlọ mkpọrọ nke a, na-eche maka ọgbọ nke a ị bịa’? … Nezie, ọ bụrụ na ha nwere ike, egbe eluigwe niile nke eluigwe ga-eti na ntị anyị, ma ọ bụrụ na anyị nwere ike kama mata mkpa ọrụ nke anyị nọ nime ya dị. Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-ele mmadụ ole na ole nke a anya, ma na-akpake ha nye nzọpụta nke ezi na ụlọ nke mmadụ. … Mgbe ọbụla m chere echiche maka isiokwu nke a, a chọrọ m ka ire nke egbe eluigwe asaa kpọlite ndị mmadụ n’ụra” (Discourses of Brigham Young, sel. John A. Widtsoe [1954], 403–4).

  14. Harold B. Lee, “Alaeze nke Chineke—Alaeze A haziri ahazi,” Ensign, Jan. 1971, 10. Lee kwa okwu nke Onyeisi Wilford Woodruff kwuru na 1896; ọ mara ọkwa: “A chọrọ m ikwu, dị ka onyeisi Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, n’anyị kwesịrị ị na-aganiihu ma mee nke ọma. Anyị [enwetachabeghi] mkpughe niile. … Onyeisi [Brigham] Young, onye sochiri Onyeisi Josef Smit, dutara anyị ebe a. Ọ haziri tempụl ndị a ma mezuo ebumnuche niile nke ọkpụkpọ okù ya na okwa ọrụ ya. … Ọ natachaghị mkpughe niile nke gbasara ọrụ nke a; ma ọ bụghị ma Onyeisi Taylor, ma ọ bụ Wilford Woodruff natara. A gaghị enwe ngwụcha n’ọrụ nke a ruo mgbe o tozuru oke” (The Discourses of Wilford Woodruff, sel. G. Homer Durham [1946], 153–54).

  15. Lee 3 Nefi 29:8–9

  16. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 131:2, 4

  17. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7

  18. Okenye John A. Widtsoe dere: “Maka nwoke mọbụ nwanyị ọbụla nke na-aga tempụl, jiri anya ghere oghe, ńaa ntị na akara niile na ọgbụgba ndụ niile, ma na-aganiihu agba mbọ ịghọta nkọwa ya n’uju, Chineke n’ekwu okwu ya, ma mkpughe a na-abịa. Onyinye dị nsọ nwere ịma atụ bara ụba nke naanị onye nzuzu ga-agba mbọ ị kọwa ya; ọ jupụtara na mkpughe maka ndị ahụ jiri ume ha chọọ ma hụ, na enweghi okwu nke mmadụ nwere ike ịkọwa mọbụ mee ka o doo anya ihe niile kwere omume nke nọ n’ije ozi tempụl. Onyinye dị nsọ nke enyere site na mkpughe ka enwere ike ị kachasị ghọta site na mkpughe” (in Archibald F. Bennett, Saviors on Mount Zion [Sunday School manual, 1950], 168).