2021
Okwukwe iji Rịọ ma Mgbe ahụ Mee ihe
Nọvemba 2021


“Okwukwe iji Rịọ ma Mgbe ahụ Mee ihe,” Liahona, Nov.

Ozi LiahonaKwa Ọnwa, Novemba 2021

Okwukwe iji Jụọ ma Mgbe ahụ Mee

Ụfọdụ ihe ndị e kwuru

Foto, oyiyi
Nwoke na-ekpe ekpere

Ụzọ eji anata mkpughe site n’aka Chineke agbanwebeghị site na ụbọchị niile nke Adam na Iv. Ọ bụ otu ihe maka ndị odibo niile nke Onyenwe anyị kpọrọ oku site na mbido ruo taa. Ọ bụ otu ihe ahụ maka mụ na gị. A na eme ya mgbe niile site na itinye okwukwe n’ọrụ. …

… Unu nwere ajụjụ ndị unu chọrọ azịza ha. Unu nwere ọbụnadị okwukwe zuru inwe olileanya na unu ga anata azịza site n’aka Onyenwe anyị site na ndị odibo Ya. Unu agaghị enwe ohere ịjụ ndị kwuru okwu ajụjụ a na-anụ anụ maka azịza, kama unu nwere ike jụọ Nna unu hụrụ unu naanya n’ekpere.

A mara m site na nhụmihe na azịza niile ga abịa izute mkpa unu na nkwado nke ime mmụọ unu. …

Ọ bụrụ na okwukwe unu nwere nime Jizọs Kraịst emewo ka obi dị nro site na ire nke Aja mgbaghara mmehie Ya, unu ga adị na njikere karịa inweta mmetụta ntaka ụka nke Mmụọ ahụ n’azịza nye ekpere unu. …

Dị ka okwukwe anyị nime Jizọs Kraịst garala eduba anyị ịrọ Nna maka azịza niile, okwukwe ahụ gakwa ewetere anyị mmetụ aka dị nro nke Onye nzọpụta ga-ezuru anyị ị nụ ntụzi aka Ya ma nwee mkpebi na obi ụtọ irube isi. …

Ọ bụ ịgba ama m na nkume ahụ n’elu nke anyị guzooro bụ akaebe anyị na Jizọs bụ Kraịst ahụ; na nke a bụ Nzukọ nsọ Ya, nke Ọ na edu na onwe Ya; ma na Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma Ya dị ndụ taa. …

A na m ekpe ekpere ka unu nwee otu ụdị aka ebe ahụ.

Foto, oyiyi
tempụl

Nkwupụta maka Córdoba Argentina Tempụl

Bipụta