2021
Mkpa ọ dị Inwe Nzukọ nsọ
Nọvemba 2021


“Mkpa ọ dị Inwe Nzukọ nsọ,” Liahona, Nov. 2022.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Novemba 2021

Mkpa ọ dị Inwe Nzukọ nsọ

Ụfọdụ ihe ndị e kwuru

Foto, oyiyi
tempụl

Taa, ozi m gbasara ndị ọma ahụ ihe banyere okpukperechi na-amasị, ndị kwụsiworo ịbịa m’ọbụ sonye nime ịhe a n’eme na nzukọ nsọ ha. Mgbe m kwuru maka “nzukọ nsọ niile,” A gụnyerem nke ndị juu, ndị alaakụba, mọbụ otù okpukpere chi ndị ọzọ. Ọ metụrụ anyị n’obi na ọnụ ọgụgụ ndị n’eje ọgbakọ ndị a niile n’ebelata hie nne, gburugburu mba niile. …

Ije ọgbakọ na isonye na ihe omume niile nime nzukọ nsọ n’enyere anyị aka bụrụ ndị ezigbo mmadu karịa ma bụrụ ezi mmetụta na ndụ niile nke ndị ọzọ. …

… N’ebe nzukọ nsọ, ọ bụ anyị na ndị ọma na-agba mbọ ijere Chineke ozi na-akparịkọta. Nke a na-echetara anyị na anyị anọghị naanị anyị n’ihe omume niile nke okpukperechi anyị. Ọ dị mkpa n’anyị na ndị ọzọ nwere mmekọrịta, ma mmekọrịta nke nzukọ nsọ bụ ụfọdụ nime ihe ndị kachasị mma anyị nwere ike i nwete. …

… Ndị ọtù ọbụla ga-ahapụ ịje nzukọ nsọ ma dabere naanị n’ịdị ike nke ime mmụọ nke onwe ha, na-ewezuga onwe ha site n’ihe ndị dị oke mkpa nke ozi ọma: ike ahụ na ngọzị niile nke ọkwa nchụaaja, ozizi n’uju ya nke eweghachitere, ma mkpali mmụọ na ohere niile nke eji etinye ozizi ahụ n’ọrụ. …

Na mgbakwunye inwe mmetụta nke udo na ọṅụ site na nsiso nke Mmụọ ahụ, ndị otù anyị neje Nzukọ nsọ na-eritekwa uru nke ibi ndụ ozi ọma, ndị dị ka ngọzị niile nke ịdebe iwu nke Okwu nke Amamiihe na ime nke ọma niihe nke anụ ahụ na nke ime mmụọ e kwere na nkwa maka idobe iwu nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. …

… Ozizi n’uju ya na emume nsọ nzọpụta na mbuli elu ya dị adị naanị nime Nzukọ nsọ ahụ eweghachitere.

Bipụta