2021
Agụgụala Ezi na ụlọ Na-enyere Ndị Nna nna Anyị aka
Disemba 2021


“Agụgụala Ezi na ụlọ Na-enyere Ndị Nna nna Anyị aka,” Liahona, Disemba 2021

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Disemba 2021

Agụgụala Ezi na ụlọ Na-enyere Ndị Nna nna Anyị aka

Agụgụala ezi na ụlọ bụ ịchọpụta na ịmụta banyere ndị otu ezi na ụlọ anyị. Anyị nakwa ekpokọta ozi banyere ndị nna nna anyị ka anyị nwee ike rụọ ọrụ tempụl maka ha.

Foto, oyiyi
alt text

Ezi na ụlọ niile dị n’etiti atụmatụ nke ańụrị nke Nna nke Eluigwe. Ọ kwadowo ụzọ maka ezi na ụlọ niile ịganiihu ruo ebighị ebi. Dị ka anyị na-eme agụgụala ezi na ụlọ na ọrụ tempụl anyị, anyị na-ewekọta ndị otù ezi na ụlọ ọnụ, ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ. (“Ọrụ Tempụl” pụtara ịnata emume nsọ niile nke tempụl maka onwe anyị, dị ka ime nrachi anyị na onye anyị lụrụ, nakwa ime emume nsọ niile nime tempụl maka ndị nna nna anyị ha.)

Agụgụala Ezi na ụlọ na Ọrụ Tempụl

Mmadụ niile ndị biworo ma ọ bụ ga-ebi n’elu ụwa kwesịrị inwete emume nsọ niile nke oziọma. Ọ bụrụ na ndị nna nna anyị ha enweghị ohere ahụ, anyị nwere ike ime emume nsọ niile n’ime tempụl maka ha. Otu n’ime emume nsọ ndị ahụ bụ ime nrachi anyị na ndị otu ezi na ụlọ. Ime “nrachi” pụtara na anyị na ezi na ụlọ anyị ga-enwe ike bie ruo ebighị ebi ọ bụrụ na anyị bụrụ ndị ezi omume. E nwere ike rachie anyị na ndị ezi na ụlọ anyị n’ime tempụl.

Ngọzi niile nke Ọrụ Agụgụala Ezi na ụlọ

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ

Agụgụala ezi na ụlọ nwere ike inyere anyị aka gbaa mmekọrịta anyị na ndị otù ezi na ụlọ anyị dị ndụ ume. Dị ka anyị na-ekekọrịta akụkọ, foto, na ihe ncheta niile n’etiti onye ọbụla, anyị na-ehiwe njikọ ezi na ụlọ siri ike. Anyị nakwa agba ịhụnaanya anyị nwere maka onye ọbụla ume. Ndị Amụma ekwewokwa nkwa na ịrụ ọrụ na agụgụala ezi na ụlọ anyị ga-akpọta anyị nso n’ebe Jizọs Kraist nọ.

Ịchọta Ndị Nna nna Anyị

Foto, oyiyi
ndekọihe n’asụsụ Chinese

Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị mee nrachi anyị na ndị ezi na ụlọ anyị ugbua na ndị nna nna anyị. Tupu anyị e nwee ike rachie anyị na ndị nna nna, anyị kwesịrị ịchọta ma chekwaa ozi gbasara ha. Mana agụgụala ezi na ụlọ karịrị naanị inyocha aha niile, ụbọchi niile, na ebe niile. Ka anyị na-amụta banyere ndị nna nna anyị, anyị ga-enwete mmetụta njikọ n’ebe ha nọ karịa.

Bipụta