“Gịnị Na-eme na Nzukọ niile nke Nzukọ nsọ Sọnde?,” Liahona, Jun 2022.
Ozi Liahona Kwa Ọnwa, Jun 2022
Gịnị Na-eme na Nzukọ niile nke Nzukọ nsọ Sọnde
Ndị otù Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-agbakọ Sọnde ọbụla ife Chineke ofufe ma kuziere onye na ibe ya ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ana anabata mmadụ niile ịbịa, ma ndị otu ga-enwe ohere ikpe ekpere, ikwu okwu, ma kuzie ihe ọmụmụ ma ọ bụrụ ma ha chọọ. Nzukọ ndị a na-enyere ndị otu aka nye onye na ibe ya mgbam ume niime okwukwe ma mee ka “obi ha jikọta ọnụ n’ịdị n’otu na n’ịhụnaanya” (Mosiah 18:21).
Nzukọ Oriri nsọ
Ndị otu nke ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta na-agbakọ Sọnde ọbụla maka nzukọ oriri nsọ. (Ndị ahụ na-esoghị n’okpukperechi anyị ka ana anabata ịbịakwa.) A na-enye ndị otu oriri nsọ n’oge nzukọ nke a iji nyere ha aka cheta Jizọs Kraịst (lee Eprel 2022 Ntọala edide Ozi ọma maka ozi ndị ọzọ gbasara oriri nsọ). Nzukọ ahụ gụnyekwara ekpere, abụ ofufe, na okwu ndị otu nyere gbasara ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Nzukọ ndị Ọzọ
Emesịa nzukọ oriri nsọ, ndị otu na-ekewa banye na klas niile na kworum niile. Ụmụntakịrị gbara site n’ọnwa 18 ruo afọ 11 na-aga Praịmarị. Na Sọnde nke mbụ na nke atọ nke ọnwa ọbụla, ndị otu ọbụla ọzọ na-aga Ụlọ akwụkwọ Sọnde. N’ụbọchị Sọnde nke abụọ na nke anọ, ha na-aga nzukọ ndị nke Otu Enyem aka, Ndịinyom Nta, ma ọ bụ kworum ọkwa nchụaja.
Ekpere niile
Ekpere na nzukọ niile nke Nzukọ nsọ bụ ihe ndị otu na-enye. Ekpere ahụ niile dị mfe ma Mmụọ Nsọ na-enye ntuzi aka. Ndị otu na-ekpe ekpere jiri okwu ndị na-egosi ịhụnaanya na nkwanye ugwu maka Nna nke Eluigwe. Nke a gunyere iji nnọchiaha niile Gị, Gị, Gị, na Gị onwe Gị mgbe ị na-ekpe ekpere nye Ya.
Okwu niile
Onye otu nke ngalaba ukwu ma ọ bụ otu ndịisi ngalaba nta na-agwa ndị otu ikwu okwu na nzukọ oriri nsọ. Okwu ndị a na-etinye uche n’ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ndị na-ekwu okwu na-eji akwụkwọ nsọ na okwu nke ndị ndu Nzukọ nsọ mgbe ha na-akwado okwu ha. Ha na-agbakwa ama banyere ngọzi niile nke ụkpụrụ niile nke ozi ọma niime ndụ ha.
Ihe ọmụmụ niile
Emesịa nzukọ oriri nsọ, ndị otu na-amụ ihe banyere ozi ọma nime klas ndị dị ntakịrị karịa. Ihe ọmụmụ niile ahụ nwere ike bụrụ ihe gbasara akwụkwọ nsọ, nkuzi niile sitere na ọgbakọ zuru ọha, ma ọ bụ isiokwu ndị ọzọ. N’agbanyeghị na onye nkuzi ahụ ga-edu niihe ọmụmụ ahụ, ọ bụghị oke okwu. Ndị otu klas niile nwere ike kọwaa echiche ha gbasara isiokwu ahụ.
Ama
Otu ugboro n’ọnwa, nzukọ oriri nsọ gụnyere nzukọ ọgbụgba ama. Nke a na-abụkarị na Sọnde nke mbụ n’ọnwa. N’oge nzukọ nke a, ndị otu nwere ike gbaa ama ha banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Ịgba ama pụtara ịma ọkwa eziokwu niile nke ozi ọma dị ka mkpake nke Mmụọ Nsọ siri dị.
Nkwadobe
Ndị otu na-akwado maka nzukọ niile nke Sọnde site n’ikpe ekpere, ịmụ akwụkwọ nsọ, na ịdị na njikere ịnata mkpake mmụọ sitere na Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na agwa gị maka ikwu okwu ma ọ bụ ikuzi otu ihe ọmụmụ, jiri ekpere chee echiche gbasara otu ị ga-esi akuzi ụkpụrụ niile nke ozi ọma. Jiri akwụkwọ nsọ mee ihe. Gbaa ama banyere eziokwu. Ndị ndu gị na Nzukọ nsọ nwere ike nyere gị aka kwadoo, ma ọ bụrụ a chọọ.
© 2022 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. All rights reserved. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Liahona Kwa ọnwa, Jun 2022. Asụsụ. 18315 593