2023
Akụrụngwa niile maka Ndị Ntoroọbịa na Ụmụntakịrị
Febụwarị 2023


“Akụrụngwa niile maka Ndị Ntoroọbịa na Ụmụntakịrị,” Liahona, Feb. 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Febụwarị 2023

Akụrụngwa niile maka Ndị Ntoroọbịa na Ụmụntakịrị

Foto, oyiyi
ndị nne na nna na-agụ akwụkwọ nsọ ha na nwa ha nwoke

Ndị nne na nna nwere oke na ọrụ mbụ ikuziri ụmụ ha ihe banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a nwere otù niile, ihe omume niile, na akụrụngwa ndị ọzọ iji nyere ndị nne na nna aka na mgbalị ha. N’otu, ndị nne na nna, ndị ndu Nzukọ nsọ, na ndị enyi nwere ike nyere ụmụntakịrị na ntoroọbịa niile aka bịakwute Kraịst.

Foto, oyiyi
Ụmụntakịrị Praịmarị

Foto site n’aka Ben Johnson

Praịmarị

Praịmarị bụ otù nke Nzukọ nsọ nke ụmụntakịrị gbara ọnwa 18 ruo afọ 11. Na Praịmarị, ụmụntakịrị na-amụ ihe banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya site na ihe ọmụmụ niile, egwu niile, na ihe omume niile. Praịmarị pụrụ inyere ụmụntakịrị aka nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke maka ha.

Kworum niile nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klasị niile nke Ndịiyom Nta

Na Jenụwarị nke afọ ahụ nke ụmụntakịrị ga-agba afọ 12, ha na-esite na Praịmarị baa ma ọ bụ kworum ndị nke Ọkwa nchụaja nke Erọn (maka ndị nwoke) ma ọ bụ na klasị ndị nke Ndịiyom Nta (maka ndị nwanyị). Na kworum na klasị ha niile, ndị ntoroọbịa na-aganiihu na-agba ama ha niile ume ma na-ejere ndị ọzọ ozi.

Foto, oyiyi
aka ndị na-ese otu foto

Ihe omume Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa

Na ntoroọbịa Ya, Jizọs tolitere “na-amamiihe ma n’ogo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ” (Luk 2:52). Ihe omume Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa na-enyere ndị otù Nzukọ nsọ na-etolite etolite aka isoro ọmụmaatụ nke Kraịst. Ha na-amụta ma n’etolite n’akụkụ niile nke ndụ ha—nke ime mmụọ, nke ọha madụ, nke anụ ahụ, na nke ọgụgụ isi.

Magazin niile nke Nzukọ nsọ

Magazin nke Nzukọ nsọ maka ụmụntakịrị bụ magazin Friend. Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa bụ magazin nke ndị ntoroọbịa. Magazin ndị a gụnyere akụkụ niile, nkuzi niile, na ihe omume niile e dere kpọmkwem maka ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa.

Foto, oyiyi
mkpuchi nke akwụkwọ odudu n’asụsụ Spanish

Akwụkwọ odudu Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa

Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Ihe odudu maka Ime Nhọrọ niile na-akuziri ndị ntoroọbịa banyere ezi okwu niile nke ozi ọma. Ọ na-akuziri ha otu esi eme mkpebi niile nke ga-enyere ha aka isoro Jizọs Kraịst. Ọ gụnyekwara azịza niile nye ajụjụ niile ndị ntoroọbịa nwere ike ịjụ banyere otu esi ebi ndụ ozi ọma.

Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma

Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma nwere ọtụtụ akụrụngwa dijitalụ, gụnyekọta vidio niile, egwu, akụkọ akwụkwọ nsọ niile, na ihe omume niile. Ọ gụnyekwara akụrụngwa ndị ga-enyere ndị nne na nna na ndị ndu aka ikuzi ụkpụrụ niile nke ozi ọma. Akụrụngwa ndị a ka a na-achọta n’ime Ọba Akwụkwọ maka Ozi ọma na ChurchofJesusChrist.org na nime app Ọba Akwụkwọ maka Ozi ọma.

Ọgbakọ niile nke FSY

Malite n’afọ ha gbara 14, a na-akpọku ndị ntoroọbịa ịga ọgbakọ niile nke Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa (FSY). Ihe omume ndị a gụnyere ihe omume niile na klas niile nke na-enye aka gbaa okwukwe n’ime Jizọs Kraịst ume ma nyere ndị ntoroọbịa aka tolite n’ime mmụọ, nke ọha mmadụ, nke anụ ahụ, na nke ọgụgụ isi.

Bipụta