“Jizọs Na-agwọta otu Nwanyị,” Ozi niile nke Friend Kwa ọnwa, Febụwarị 2023
“Jizọs Na-agwọta otu Nwanyị”
Ozi niile nke Friend Kwa ọnwa, Febụwarị 2023
Jizọs Na-agwọta otu Nwanyị
Otu ụbọchi Jizọs jere ije gbadaa ama na-ekwo ekwo. N’ime igwe mmadụ ahụ enwere otu nwanyị onye naara arịa ọrịa kemgbe afọ 12.
Nwanyị ahụ nwere okwukwe na Jizọs nwere ike ịgwọ ya. Ọ garuru ma metụ uwe mwụda Ya aka. Ozugbo o nwetere ọgwụgwọ!
“Onye metụrụ uwe m aka?” Ka Jizọs jụrụ. Egwu tụrụ nwanyị ahụ. O sekpuuru ala n’ihu Jizọs ma gwa Ya ihe mere.
Jizọs dịịrị ịhụnaanya. Ọ sịrị, “Nwee ezi nkasị obi.” Ọ gwara ya na agwọwo ya n’ihi okwukwe ya.
A pụrụ m inwe okwukwe nʼime Jizọs Kraist. Ịhụnaanya Ya pụrụ inyere m aka ma wetere m udo.
© 2023 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nnabata n’asụsụ Bekee: 6/19. Nnabata ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Febụwarị 2023. Language. 18910 593