“Jizọs Gosiri Anyị Ụzọ ahụ,” Friend, Ọgọst 2023, 4–5.
Ozi niile nke Friend Kwa Ọnwa, Ọgọst 2023
Jizọs Gosiri Anyị Ụzọ ahụ
Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Nna nke Eluigwe. Ọ bịara n’ụwa igosi anyị otu anyị nwere ike isi alaghachikwuru Nna nke Eluigwe otu ụbọchị. Emere Jizọs baptizim. Ọ kuziri na anyị ka ekwesịrị imekwa baptizim.
Jizọs gosiri anyị otu esi ebi. Ọ hụrụ onye niile naanya ma nyeere onye ọbụla aka. Ọ chọrọ ka anyị soro Ya.
Jizọs Kraịst nwere mmetụta mgbu anyị niile ma taa ahụhụ maka mmehie anyị. Emesịa Ọ nwụrụ maka anyị. Nke a ka a na-akpọ Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ọ bilitere site n’ọnwụ. Nke a pụtara na Ọ dị ndụ taa! Niihi Jizọs Kraist, anyị ga-adịkwa ndụ ọzọ mgbe anyị nwụsiworo.
Jizọs mere ihe niile ndị a maka anyị n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya. Niihi Ya, anyị nwere ike ibinyere Nna anyị nke Eluigwe na ndị ezi na ụlọ anyị niile otu ụbọchị.
Anyị nwere ike isoro Jizọs site na-ime baptizim. Anyị nwekwara ike isoro Ya ụbọchị niile mgbe anyị na-ahụ ndị ọzọ naanya ma na-enyere ha aka ma debe iwu nsọ Ya niile.
© 2023 site n’aka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa Ọnwa, Ọgọst 2023. Language. 19046 593