2023
Ndabere onwe Na-agba Anyị ume
Ọgọst 2023


“Ndabere onwe Na-agba Anyị ume,” Liahona, Aug. 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Ọgọst 2023

Ndabere onwe Na-agba Anyị ume

Foto, oyiyi
mmadụ abụọ na-asa efere

Inwe ndabere onwe pụtara na anyị nwere ike ịlekọta mkpa niile nke onwe anyị na nke ezi na ụlọ anyị. Mgbe anyị nwere ndabere onwe, anyị nọkwa n’ọnọdụ dị mma iji jeere Onyenwe anyị ozi ma lekọta ndị ọzọ. Mana ndabere onwe apụtaghị na anyị ga-ezute aka mgba anyị niile naanị anyị. Anyị nwere ike ịrịọ enyemaka site n’aka ndị enyi, ezi na ụlọ, ndị otu ngalaba ukwu ma ọ bụ ngalaba nta na ndị ọkachamara mgbe anyị chọrọ ya.

Ụkpụrụ niile nke Ndabere onwe

Inwe ndabere onwe na-achọ agụmakwụkwọ, nrube isi, na nrusi ọrụ ike. Anyị n’eme dị ka ike anyị ha iji lekọta onwe anyị, ma anyị nwere ike ịrịọ enyemaka site n’aka ndị ọzọ mgbe ọ dị mkpa. Inwe ndabere onwe n’ezie, kosiladị, anyị kwesịkwara ịmụta otu esi enwe okwukwe na Jizọs Kraist. Mgbe ahụ dị ka anyị na-agba mbọ ịnyere onwe anyị aka, Ọ ga-agba anyị ume.

Foto, oyiyi
aka abụọ apịakọtara ọnụ

Ndabere onwe nke Ime Mmụọ

Anyị nwere ike iwulite ndabere onwe nke ime mmụọ anyị site na-ịgba ọgbụgba ama anyị nke Jizọs Kraịst ume. Anyị na-eme nke a dị ka anyị na-ekpe ekpere, amụ akwụkwọ nsọ, aga nzukọ nsọ, erube isi nye iwu nsọ niile, ma mee ihe ndị ọzọ na-akpọta anyị nso na Kraịst. Ịmata na Ọ dị njikere inyere anyị aka ga-enye anyị okwukwe iji nogidesie ike ọbụnadị mgbe ndụ rara ahụ.

Ndabere onwe nke Anụ ahụ

Ndabere onwe nke anụ ahụ gụnyere inwe ike iji lekọta mkpa niile nke anụ ahụ nke onwe anyị na nke ezi na ụlọ anyị. Nke a gụnyere ihe oriri, ụlọ, ahụike, na mkpa ndị ọzọ. Anyị na-eme nke a site na-inweta ezigbo agụmakwụkwọ, ịmụta ma ọ bụ ịmụba nka niile dị mkpa, ịrụsi ọrụ ike, ijiri oge anyị mee ihe bara uru, na ịlekọta ego anyị nke ọma.

Foto, oyiyi
ndịinyọm atọ na-ejekọrịta ije

Ndabere onwe nke Mmetụta Uche

Ndabere onwe nke mmetụta uche bụ ikike eji anagịde aka mgba nke mmetụta uche niile jiri mgbam ume na okwukwe. Anyị niile nwere aka mgba niile na ndọla azụ niile. Ekele dịịrị ozi ọma, anyị maara na anyị nwere ike ịhọrọ otu anyị ga esi azaghachi ha. Ịzaghachi n’okwukwe nime Onyenwe anyị na-amụba ike anyị izute ihe isiike ndị ọzọ jiri olile anya karịrị akarị.

Agụmakwụkwọ

Anyị kwesịrị ị na-amụta ihe mgbe niile. Chineke chọrọ ka anyị kuziere uche anyị ma melite nka anyị ruo ogologo ndụ nke a ma banye nke ọzọ. Ka anyị na-amụtakwu, ka anyị nwere ike ịbụ ike mmetụta ka mma, maka ezi ihe ma rọpụtara onwe anyị, ezi na ụlọ anyị, ma ndị ahụ nọ na mkpa ihe.

Foto, oyiyi
nwaikom nta bu akpa

Ngọzị niile nke Inwe Ndabere onwe

Ndị amụma akuziwo na dị ka anyị na-emelite ndabere onwe anyị, a ga-agọzi anyị jiri olileanya na udo dị ukwuu. Anyị ga-enwe ike inyere ndị ezi na ụlọ anyị na ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Ma a ga-agọzi anyị jiri ọtụtụ ohere na ikike inwe ọganiihu esepụghị aka.

Akụrụngwa Nzukọ nsọ

Stek gị nwere ike hiwe ọtụtụ otu nke ndabere onwe. Ndị a nwere ike ikuziri gị ụkpụrụ niile nke ndabere onwe na nka niile dị ka ilekọta ego gị ma ọ bụ ịchọta ọrụ dị mma karịa. I nwere ike ịchọta akụrụngwa ndị ọzọ yiri ya niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma. Họrọ “Akwụkwọ niile na Nkụzi niile” ma emesịa “Ndabere Onwe.”

Bipụta