2023
Okwu Ikpeazụ: Chọọ Nghọta
Ọgọst 2023


“Chọọ Nghọta” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, Ọgọ. 2023.

Ozi Kwa Ọnwa Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa Ọgọst 2023

Chọọ Nghọta

Sitere na otu ozi enyere n’ọgbakọ zuru ọha na Eprel 2019.

Foto, oyiyi
nwanyị jị mmanụ oriọna

Ngosipụta niile sitere n’aka Emily Jones

Nzube anyị dị ka anyị na-achọ nghọta nke ozi ọma Jizọs Kraịst aghaghị ịbụ iji mụbaa okwukwe niime Chineke ma niime atụmatụ obi ụtọ Ya dị nsọ na nime Jizọs Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya na iji nwete ntọghata na-adịgide. Ụdị okwukwe na ntọghata nke a mụbara amụba nwere ike inyere anyị aka mee ma debe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, site otu a na-agba ọchịchọ anyị nwere isoro Jizọs ume ma rọpụtazie ezi mgbanwe nke ime mmụọ niime anyị. Mgbanwe nke a ga-ewetere anyị ndụ ga aka enwe obi ụtọ, dị nrụpụta ihe, ma nwee ahụike ma nyere anyị aka debe nhụnuche dị ebighị ebi.

Foto, oyiyi
nwaikom nta na-agụ akwụkwọ nsọ

Inwete nke a, anyị kwesịrị ịnọnyere Jizọs Kraịst site na-irukpunye onwe anyị niime akwụkwọ nsọ, na-aṅụrị ọṅụ na ha, na amụta ozizi Ya, ma na-agbalịsị ike ibi ndụ dị ka O biri. Naanị mgbe ahụ ka anyị ga-abịa mata Ya ma mata olu Ya, na-amata na dị ka anyị na-abịakwute Ya ma kwere na Ya, agụụ agaghị agụ anyị ma ọ bụ akpịrị akpọ anyị nkụ ma ọlị (lee Jọn 6:35).

Foto, oyiyi
nwaikom nta na-ekpe ekpere

Nke ahụ anaghị eme na mberede. Itinye onwe anyị nye nhụmiihe nke nsọpụrụchi ahụ kachasị abụghị ihe dị mfe; ọ na-achọ ịkpọku Chineke na ịmụta otu esi ewete ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’etiti ndụ anyị.

Foto, oyiyi
nwainyom nta na-emetụ obi ya aka

Ana m agbara unu ama na mgbe anyị jiri uchu, obi, nkwudesi ike na obi ọcha chọọ ịghọta ozi ọma nke Jizọs Kraịst ma kuziekọrịtara onwe anyị jiri ezi nzube ma n’okpuru mmetụta nke Mmụọ ahụ, nkuzi ndị a nwere ike ịgbanwe obi niile ma kpatee ọchịchọ ibi dị ka otu eziokwu niile nke Chineke sịrị dị.

Bipụta