2023
Inye Nlekọta maka Ndị Ahụ nọ na Mkpa
Septemba 2023


Inye Nlekọta maka Ndị Ahụ nọ na Mkpa,” Liahona, Sept. 2023.

Ozi Liahona Kwa ọnwa, Septemba 2023

Inye Nlekọta maka Ndị Ahụ nọ na Mkpa

Foto, oyiyi
Jizọs Na-agwọ Ndị mmadụ

Ọ Gwọrọ Ọtụtụ ndị site n’Ọrịa Dị iche, nke si n’aka J. Kirk Richards, nke e nwere ike agaghị akọpị akọpị

Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-esoro nkuzi nke Onyenwe anyị ilekọta ndị ahụ nọ na mkpa. Anyị na-elekọta ndị ọzọ site n’ijere ha ozi, na-enyere ha aka ịghọ ndị nwere ndabere onwe, ma na-ekesa ihe anyị nwere.

Ọmụmaatụ nke Jịzọs Kraịst

Jizọs Kraịst hụrụ naanya, nye nkasi obi, ma kpeere ndị nọ Ya nso ekpere. Ọ “nọ na-agagharị n’eme ihe dị mma” (Ọlụ 10:38). Anyị nwere ike isoro ọmụmaatụ Ya site n’inwe ịhụnaanya, inye nkasi obi, ije ozi, na ikpe ekpere maka ndị ahụ nọ anyị nso. Anyị nwere ike ị nọ mgbe niile na-achọ ụzọ ndị esi enyere ndị ọzọ aka.

Foto, oyiyi
mmadụ abụọ na-eje ije

Ije ozi nlekọta

Mkpụrụokwu ahụ ije ozi nlekọta ka eji mee ihe na akwụkwọ nsọ niile na niime Nzukọ nsọ iji kọwaa otu anyị si elekọta onye na ibe ya. Ndị ji ọkwa nchụaja ka ana enye ọrụ dị ka ụmụnne ndị nwoke na-eje ozi nlekọta nye onye ọbụla ma ọ bụ ezi na ụlọ ọbụla nọ na ngalaba ukwu ma ọ bụ na ngalaba nta. Ụmụnne ndị nwanyị na-eje ozi nlekọta ka ana ekenye ọrụ nye dimkpa nwanyị ọbụla. Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị na-eje ozi nlekọta na-ahụ na ndị otu Nzukọ nsọ niile bụ ndị echetara ma na-elekọta.

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-akụ mkpụrụ niile

Inyere Ndị ọzọ aka Nwee Ndabere Onwe

Anyị nwere ike nyere ndị otu ezi na ụlọ na ndị enyi aka nwee ndabere onwe site na-ịgba ha ume ịchọta azịza ogologo oge nye nsogbu ha. Anyị nwere ike mesịa nyere ha aka dị ka ha na-arụ ọrụ n’elu ebumnuuche ha. Chọpụtakwuo ozi gbasara ndabere onwe niime Liahona Ọgọst 2023 edide Ntọala Ozi ọma.

Ijere Ndị ọzọ ozi

E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike i si jeere ndị ahụ nọ anyị nso ozi ma nye aka zute mkpa anụ ahụ, nke ime mmụọ, na nke uche ha. Ịmụta ihe gbasara ndị ọzọ nwere ike inyere anyị aka mara otu anyị nwere ike i si ejere ha ozi n’ụzọ kacha mma. Anyị nwekwara ike kpee ekpere maka nduzi ịmata ihe anyị nwere ike ime iji nye aka.

Foto, oyiyi
ndị mmadụ na-e kpokọta mkpụrụ

Ikesa Ihe Anyị Nwere

Anyị nwere ike jeere ndị ọzọ ozi site n’ikesa ihe Chineke jiworo gọzie anyị. Na-ịmaatụ, anyị nwere ike gbasaa aka na-inye onyinye obubu ọnụ ma ọ bụ nye ihe n’ego Enyem aka Maka Ọdịmma Ụmụ mmadụ nke Nzukọ nsọ. Anyị nwekwara ike jee ozi n’obodo anyị na niime ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ anyị.

Ọrụ niile nke Ndị ndu Nzukọ nsọ

Bishọp na-ahụ maka nlekọta nke ndị ahụ nọ na mkpa na ngalaba ukwu ya. O nwere ike were ego sitere na onyinye obubu ọnụ mee ihe iji nyere ndị otu nwere mkpa aka. Ndị ndu ndị ọzọ, tinyere ndị ndụmọdụ ya na Otu Enyem aka na otu ndịisi kworum ndị okenye, na-enyere ndị otu aka chọta akụrụngwa ndị ha nwere ike iji rụọ ọrụ iji zute mkpa ha.

Mbọ niile nke Nzukọ nsọ maka Ọdịmma Ụmụ mmadụ

Nzukọ nsọ na-enyere ndị mmadụ aka na gburugburu ụwa niile site n’ịza oku ọdụrụkụọ, prọjekets ndị dị n’obodo, na arụmarụ ndị dị ka mmiri dị ọcha na ịgba ọgwụ mgbochi. Maka ịmụtakwu, lee Dallin H. Oaks, “Inyere Ndị Ogbenye Na Ndị nọ na Mkpagbu aka,” Liahona, Nov. 2022, 6–8.

Bipụta