Come, Follow Me
Ntọghata Bụ Ebumnuche Anyị


“Ntọghata Bụ Ebumnuche Anyị,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ntọghata Bụ Ebumnuche Anyị,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

nwoke na-akuziri otu nwata inye nwa atụrụ nri

Ntọghata Bụ Ebumnuche Anyị

Ebumnuche nke ọmụmụ ihe na nkuzi niile nke ozi ọma bụ ime ka ntọghata anyị dị omimi ma nyere anyị aka ịdịkarị ka Jizọs Kraịst. Niihi ucheobi nke a, mgbe anyị na-amụ ozi ọma, anyị anaghị nnọọ achọ ozi dị ọhụrụ; anyị chọrọ ịghọ “onye ekere ọhụrụ” (2 Kọrịnt 5:17). Nke a pụtara ịdabere na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst inyere anyị aka gbanwee obi anyị, echiche anyị, omume anyị, na ezi ọdịdị anyị.

Mana ụdị ọmụmụ ozi ọma nke na-agba okwukwe anyị ume ma na-eduba n’ọrụ ebube nke ntọghata anaghị eme ha niile otu mgbe. Ọ gafere otu imeụlọklass baa niime obi na ebe obibi nke mmadụ. Ọ na-achọ mgbalị ọdịnụụdị, kwa ụbọchi iji ghọta ma bie ndụ ozi ọma. Ezi ntọghata na-achọ mmetụta nke Mmụọ Nsọ.

Mmụọ Nsọ na-edu anyị ruo n’eziokwu ma na-agba ama banyere eziokwu ahụ (lee Jọn 16:13). Ọ na-eme ka uche anyị ghọta, kpakee nghọta anyị, ma metụ obi anyị aka jiri mkpughe sitere n’aka Chineke, nsipụta nke eziokwu niile. Mmụọ Nsọ na-asacha obi anyị. Ọ na-akpake niime anyị ọchịchọ ibi ndụ site n’eziokwu, ma Ọ na-atakanyere anyị ụzọ ndị esi eme nke a. N’ezie, “Mmụọ Nsọ … ga-akuziri [anyị] ihe niile” (Jọn 14:26).

Niihi ucheobi ndị a, niime mgbalị anyị ibi ndụ, mụọ ihe, ma kuzie ozi ọma, anyị kwesịrị na mbụ na nke kachasị chọọ nsiso nke Mmụọ ahụ. Ebumnuche nke a kwesịrị ị na-achị nhọrọ anyị ma duzie echiche anyị na omume anyị. Anyị kwesịrị ịchọ ihe ọbụla nke na-akpọbata mmetụta nke Mmụọ ma jụ ihe ọbụla na-achụpụ mmetụta ahụ—niihi na anyị maara na ọ bụrụ na anyị pụrụ itozu oke nnọnye nke Mmụọ Nsọ ahụ, anyị pụkwara itozu oke ibi niihu Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst.