“Ojiji Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ojiji Bianụ, Soro M,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Ojiji Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ
Onye Ka Akụrụngwa Nke a Bụ Maka ya?
Akụrụngwa nke a bụ maka onye ọbụla chọrọ ịmụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile—onye ọbụla n’otu n’otu, dị ka ezi na ụlọ, ma niime klaasị Nzukọ nsọ niile. Ọ bụrụ ma ịmụbeghị akwụkwọ nsọ na-esepụghị aka n’oge ndị gara aga, akụrụngwa nke a nwere ike nyere gị aka malite. Ọ bụrụ na i nweworị agwa dị mma nke ịmụ akwụkwọ nsọ, akụrụngwa nke a nwere ike nyere gị aka nwetakwuo nhụmiihe ndị bara uru.
Ndị mmadụ n’otu n’otu na ndị Ezi na ụlọ N’Ebe obibi
Ebe kacha mma ịmụ ozi ọma bụ n’ebe obibi. Ndị nkuzi gị na nzukọ nsọ nwere ike kwadoo gị, ma i nwere ike nwete mgbam ume site na ndị òtù ngalaba ukwu ndị ọzọ. Mana ịnyandụ niime mmụọ, onye ọbụla niime anyị nwere mkpa ọzụzụ kwa ụbọchi site “n’okwu dị mma nke Chineke” (Moronaị 6:4; lee kwa Russell M. Nelson, “Okwu Mmalite,” Liahona, Nov. 2018, 6–8).
Jiri akụrụngwa nke a n’ụzọ ọbụla baara gị uru. Ntụpụta ndị a wepụtara ìhè ụfọdụ ezi okwu dị ebighị ebi ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile. Ha nakwa atụpụta uche na ihe omume niile iji nyere unu aka mụọ akwụkwọ nsọ n’otu n’otu, gị na ndị òtù ezi na ụlọ, ma ọ bụ gị na ndị enyi. Dị ka ị na-amụ ihe, soro odudu nke Mmụọ ahụ iji chọta eziokwu ndị dị ebighị ebi nke bara uru nye gị. Chọọ ozi ndị Chineke nwere maka gị, ma soro mkwalite niile ị natara.
Ndị Nkuzi na Ndị Ọmụmụ ihe na Nzukọ nsọ
Ọ bụrụ na ị na-akuziri klaasị Praịmarị, klas ndị ntoroọbịa ma ọ bụ klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde nke ndị dimkpa, kworum Ọkwa nchụaja Erọn, ma ọ bụ klas nke Ndịiyom Nta, a na-agba gị ume iji ntụpụta ndị dị niime akụrụngwa nke a dị ka ị na-akwado ikuzi ihe. Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ bụ kọrịkulum maka klas Sọnde gị. Nchepụta ọmụmụ ihe ndị dị niime akụrụngwa nke a ka ahaziri maka ọmụmụ ihe n’ebe obibi nakwa na nzukọ nsọ. Dị ka ị na-akwado ikuzi ihe, bido site n’inwe nhụmiihe ndị nke onwe gị niime akwụkwọ nsọ. Nkwado gị nke kachasị dị mkpa ga-eme dị ka ị na-enyochagharị akwụkwọ nsọ ma chọọ mkpatemmụọ nke onwe gị site n’aka Mmụọ Nsọ. I nwekwara ike mụọ ihe buru mkpa nke ndị ị na-akuziri ihe n’uche. Chọọ eziokwu ndị dị ebighị ebi. Bịanụ, Soro M nwere ike inyere gị aka chọpụta ụfọdụ eziokwu ndị a ma mụọ otu enwere ike isi jiri akwụkwọ nsọ mee ihe niime ndụ gị.
Buru n’uche na ọmụmụ ozi ọma, n’ụzọ ya kachasị mma, bụ nke gbadoro ụkwụ n’ebe obibi ma Nzukọ nsọ na-akwado. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, isi oke na ọrụ gị bụ ịkwado ndị ị na-akuziri ihe na mgbalị ha ịmụ ma bie ndụ ozi ọma n’ebe obibi. Enyela onwe gị nsogbu banyere inwe ọdịnaya pụrụ iche iji nye ha ihe niime klas. Kama, nye ha ohere niile iji kọrịta nhụmiihe, echiche, na ajụjụ ha banyere edereede akwụkwọ nsọ ha gụworo n’ebe obibi. Kpọkuo ha ikesa eziokwu ebighị ebi ha chọtaworo. Nke a kacha mkpa karịa ịgụcha ọtụtụ edereede akpọrọ aha.
Klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde nke Ndị Ntoroọbịa na Ndị Dimkpa.
Otu isi nzube nke n’eme anyị ji na-agbakọta na klas Ụlọ akwụkwọ Sọnde niile bụ iji kwadoo ma gbaa onye n’ibe ya ume dị ka anyị na-agbasi mbọ ike ịmata ma soro Jizọs Kraịst. Otu ụzọ dị mfe ime nke a bụ ịjụ ajụjụ dị ka “Gịnị ka Mmụọ Nsọ kuziworo gị n’izu ụka nke a dị ka ịmụrụ akwụkwọ nsọ jiri Bịanụ, Soro M?” Azịza niile nye ajụjụ nke a nwere ike duba na mkparịta ụka bara uru nke na-ewulite okwukwe niime Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya.
Mgbe ahụ i nwere ike kpalite mkparịta ụka dabeere na ntụpụta ọmụmụ ihe ahụ dị niime Bịanụ, Soro M. N’ịmaatụ, otu nchepụta ọmụmụ ihe nwere ike tụnye uche inyochagharị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:15–20, na-achọ otu Onye Nzọpụta si kọwaa ntaram ahụhụ Ya. I nwere ike rịọ ndị òtù klas ịkọwa ka ọ si metụta ha dị ka ha gụrụ nkọwapụta Ya ma kwuo okwu banyere otu nke a si emetụta ụzọ ha si eche echiche banyere Ya. Ma ọ bụ i nwere ike tinye ezigbo oge n’ịmụ amaokwu ndị a dị ka òtù klas.
Kworum ndị nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klasị niile nke Ndịiyom Nta
Mgbe kworum niile nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klasị niile nke Ndịiyom Nta zukọtara na Sọnde niile, nzube ha dịtụ iche site na klas nke Ụlọ akwụkwọ Sọnde. Na mgbakwunye inyere onye n’ibe ya aka mụọ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, òtù ndị a na-ezukọkwa ịtụkọta uche banyere imejupụta ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee Akwụkwọ ntụziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 1.2), dị ka esi tuzie aka site n’aka òtù ndịisi kworum ma ọ bụ klas ha.
Niihi nke a, nzukọ kworum ma ọ bụ klas ọbụla kwesịrị iji onye òtù onye òtù ndịisi kworum ma ọ bụ klas malite idu mkparịta ụka banyere mgbalị ha. N’ịmaatụ, ha nwere ike nyekọrịta ndụmọdụ ọnụ banyere mgbalị ha iji bie ndụ ozi ọma, jeere ndị nọ na mkpa ozi, kesaa ozi ọma, ma ọ bụ sonye na ọrụ tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.
Mgbe oge ndụkọrịta ọdụ nke a gasịrị, onye nkuzi na-edu klas ma ọ bụ kworum na-ịmụkọrịta ozi ọma ọnụ. Ndị ndu ndị dimkpa ma ọ bụ ndị òtù nke klas ma ọ bụ kworum ka enwere ike ikenye ikuzi ihe. Otù ndịisi klas ma ọ bụ kworum, na-ịjụta ndị ndu ndị dimkpa, na-arụ ọrụ ndị ekenyere.
Ndị ekenyere ikuzi ihe kwesịrị ikwado site n’iji arọ ọmụmụ ihe niile dị niime ntụpụta kwa izu ụka nke Bịanụ, Soro M. Niime ntụpụta nke ọbụla, akara ngosi nke a na-egosipụta ihe omume nke kachasị baa uru nye ndị ntoroọbịa ma daba adaba niihe ha na-amụ na semịnarị. Kosiladị, arọ ọbụla niime ntụpụta ndị a edepụtara ka enwere ike iji mee ihe dị ka ihe omume ọmụmụ ihe maka ndị ntoroọbịa.
Maka ajenda ịmaatụ maka nzukọ kworum na klas, lee appendix D.
Praịmarị
Nkwado gị ikuziri ndị Praịmarị ihe na-ebido dị ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ n’onwe gị na gị na ezi na ụlọ gị. Dị ka ị na-eme otu a, dịrị njikere ịnata mmetụta na nghọta nke ime mmụọ site n’aka Mmụọ Nsọ banyere ụmụ ntakịrị nọ niime klas Praịmarị gị. Dịrị ike n’ekpere. Mmụọ ahụ nwere ike kpatee gị jiri nchepụta niile iji nyere ha aka mụta ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Dị ka ị na-akwado ikuzi ihe, i nwere ike nwetekwuo mkpatemmụọ ndị ọzọ site n’inyocha nchepụta maka ikuzi ihe dị niime akụrụngwa nke a. Ntụpụta nke ọbụla dị niime Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ nwere nkeji akpọrọ “Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe.” Chee echiche maka nchepụta ndị a dị ka arọ ndị eji akpalite mkpatemmụọ gị. Ị maara ụmụntakịrị nọ niime klas Praịmarị gị—ma ị ga-abịa mata ha ọbụna karịa dị ka gị na ha na-akparịta ụka niime klas. Chineke makwa ha, ma Ọ ga-akpatemmụọ gị jiri ụzọ ndị kachasị mma iji kuziere ha ihe ma gọzie ha.
Ụmụntakịrị nọ niime klas gị nwere ike ha emeworịị ụfọdụ niime ihe omume ndị dị niime Bịanụ, Soro M ha na ezi na ụlọ ha. Nke ahụ Dị Mma. Kwu nkwugharị dị mma. Tulee ikpọku ụmụntakịrị ikesara ibe ha ihe ha mụrụ n’ebe obibi. I kwesịkwara ịtụ atụmatụ ụzọ ndị ụmụntakịrị ga-esi esonye eme ihe ọbụrụgodu na ha anaghị amụ ihe n’ebe obibi. Ụmụntakịrị na-amụ eziokwu niile nke ozi ọma n’ụzọ kacha baa uru mgbe a na-akuzi eziokwu ndị a ugboro ugboro site n’ihe omume dị iche iche. Ọ bụrụ ma ị chọta na otu ihe omume nke ọmụmụ ihe bara uru maka ụmụntakịrị, tulee imegharị ya, kachasị ọ bụrụ na ị na-akuziri ụmụntakịrị kacha obere.
Niime ọnwa ndị nwere Sọnde ise, ndị nkuzi Praịmarị ka a na-agbaume idochi nhazi Bịanụ, Soro M atụpụtara na Sọnde nke ise jiri otu ihe omume ma ọ bụ karịa dị niime “Appendix B: Maka Praịmarị—Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ n’Ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”