Come, Follow Me
Me 5–11: “Nkwa niile Ahụ … Ka A Ga-emejupụta”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45


“Me 5-11: ‘Nkwa niile … Ka A Ga-emejupụta’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45,’ Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

ezi na ụlọ nọ na tempụl

Me 5–11: “Nkwa niile Ahụ … Ka A Ga-emejupụta”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45

Mkpughe dị niime nkeji 45 ka anatara, dị ka otu nkọwa isi nkeji siri dị, “nye ọńụ nke ndị Nsọ.” Ma enwere ọtụtụ ihe eji na-aṅụrị ọṅụ maka ya niime mkpughe nke a. Niime ya Onye Nzọpụta nyere nkwa Ya dị nro iji rịọrọ anyị niihu Nna (lee amaokwu 3–5). Ọ na-ekwu maka ọgbụgba ndụ ebighị ebi Ya na-agbasa gburugburu ụwa niile, dị ka “onye ozi … iji bu ụzọ kwadooro [Ya] ụzọ” (amaokwu 9). Ma Ọ na-ebu amụma nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya dị ebube. Onye Nzọpụta na-eme ihe ndịa niile nakwa anakwere na ndị a bụ oge juputara na nsogbu (lee amaokwu 34), n’otu akụkụ niihi oke egwu niile ga-eme tupu ọbịbịa Ya. Mana oke egwu ahụ, ọchịchịrị ahụ esighị ike nke ọma iji gbanyụọ ìhè nke olileanya. “Niihi n’ezie a sị m unu,” ka Onyenwe anyị mara ọkwa “na m bụ … ìhè na-amụke niime ọchịchịrị” (amaokwu 7). Nke ahụ naanị bụ ihe kpatara eji anata mkpughe nke a—jiri ndụmọdụ na ịdọ aka na ntị na eziokwu nke ọbụla Ọ chọrọ inye—jiri ọńụ.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:1–5

akara ngosi semịnarị
Jizọs Kraịst bụ Onye Nkwuchite ọnụ m n’ebe Nna nọ.

Mgbe anyị na-enwete mmetụta etorughi etoru ma ọ bụ etozughị oke niihu Chineke, anyị nwere ike nweta mmasị obi ike site na okwu nke Onye Nzọpụta niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:1–5. Dị ka ị na-achọgharị amaokwu ndị a, tulee ajụjụ dị ka ndị a:

  • Kedụ mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị dị niime amaokwu ndị a kachasị adị ka ọ baara gị uru?

  • Onye nkwuchite ọnụ bụ onye na-akwado ma ọ bụ na-akwanye mmadụ ma ọ bụ ihe niihu ọha. Dị ka otu amaokwu ndị a siri dị, olee otu Jizọs Kraịst si eme nke a maka gị? Kedụ ihe mere O ji tozuo oke iji mee ya?

  • Kedụ ihe na-enye gị obi ụtọ banyere okwu niile nke Onye Nzọpụta nye Nna? (amaokwu 4-5).

I nwekwara ike mụọ ihe Okenye Dale G. Renlund kuziri banyere Jizọs Kraịst, Onye nkwuchite ọnụ anyị, niime “Họrọnụ n’Ụbọchị Taa” (Liahona, Nov. 2018, 104–5). Dị ka otu Okenye Renlund siri kwuo, olee otu esi eji ebemnuuche nke Onye Nzọpụta atụnyere nke Lusifa?

Edereede ndị a sotere nwere ike gbakwunye na nghọta gị banyere ọrụ nke Onye Nzọpụta dị ka Onye nkwuchite ọnụ. Dị ka ị na-amụ ha, tulee idedata nkebiokwu niile ma ọ bụ eziokwu ndị i nwere ike ikesara ndị ọzọ: 2 Nifaị 2:8–9; Mozaya 15:7–9; Moronaị 7:27–28; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:5; 62:1. Gịnị mere nkebiokwu ndịa jị baara gị uru?

Lee kwa “E Guzoro M N’ịtụnaanya KpamKpam,” Abụ niile, no. 193; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Onye ogbugbo” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

10:47

The Mediator

A portrayal of the analogy Elder Boyd K. Packer used in his April 1977 general conference address. A young man who fails to pay a debt is saved from the grasp of justice through the mediation of a friend.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:9–10

Ozi ọma bụ ihe atụ nye mba niile.

Mgbe gboo, ihe atụ bụ ọkọlọtọ a na-ebu banye agha eji akpọkọta ma na-ejikọta otu ndị agha. Ihe atụ bụkwa ọmụmaatụ ma ọ bụ usoro esi eme nke enwere ike iji ihe ndị ọzọ tụnyere na ya. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:9–10, tụgharịa uche otu ọgbụgba ndụ gị na Onyenwe anyị niile siworo bụrụ ihe atụ nye gị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:11–75

Jizọs Kraịst ga-alọghachi n’ebube.

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị ka akọwaworo dị ka “ịdị ukwuu” ma “ịdị egwụ” (Malakaị 4:5). Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45, nkọwa abụọ ndị ahụ yiri ka ọ dabara adaba. Mkpughe nke a gụnyere ma ịdọ aka na ntị niile naanya udo na nkwa niile jupụtara n’olileanya banyere ọbịbịa nke Onyenwe anyị. Dị ka ị na-amụ amaokwu 11–75, tụgharịa uche otu i nwere ike isi kwadoo maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ jiri okwukwe niime Kraịst karịa ịtụ egwu. Dekọọ ihe ị chọpụtara niime tebụlụ dị ka nke a:

Amụma ma ọ bụ nkwa

Gịnị ka m nwere ike ime

Amụma ma ọ bụ nkwa

Ìhè (ozi ọma ahụ) ga-abịakwute ndị ahụ nọdụrụ niime ọchịchịrị (amaokwu 28)

Gịnị ka m nwere ike ime

Nata ìhè ahụ—ma kesaa ya (amaokwu 29)

Amụma ma ọ bụ nkwa

Gịnị ka m nwere ike ime

Amụma ma ọ bụ nkwa

Gịnị ka m nwere ike ime

Amụma ma ọ bụ nkwa

Gịnị ka m nwere ike ime

Niime vidiyo “Obi Ụmụ mmadụ Ga-adanarị Ha” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma), kedụ ndụmọdụ Onyeisi Russell M. Nelson nyere iji nyere anyị aka were udo zute ọnọdụ ndị jupụtara n’ihe egwu?

3:24

Men's Hearts Shall Fail Them

Elder Russell M. Nelson shares a personal story to give encouragement for when we feel "weak in the heart."

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:31–32, 56–57

A pụrụ m “iguzo n’ebe niile dị nsọ” ma ghara ịdapụ.

Kedụ ihe ị na-amụta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:31–32, 56–57 banyere ịkwado maka ọbịbịa nke Onyenwe anyị? Kedụ ebe bụ “ebe nsọ” gị niile? Kedụ ihe ọ pụtara “ịghara ịdapụ”? Olee otu i nwere ike isi mee ebe ị nọ ịdị nsọ karịa?

Mata na Onyenwe anyị rụtụrụ aka na nkọnilu nke ụmụagbọghọ iri na-amaghị nwoke, na-atụnyere mmanụ dị niime nkọnilu ahụ na eziokwu na Mmụọ Nsọ. Tulee ịgụ nkọnilu ahụ niime Matiu 25:1–13 buru nke ahụ n’obi. Kedụ nghọta ndị i nwetere?

Lee kwa David A. Bednar, “Ọbụrụ na Ị Maara M,” Liahona, Nov. 2016, 102–5.

ụmụagbọghọ ise na-amaghị nwoke maara ihe

Nkọnilu nke Ụmụagbọghọ Iri Na-amaghị nwoke, site n’aka Dan Burr

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:11–15, 66–71

Zayọn bụ ebe nchekwa nye Ndị nsọ nke Chineke.

Ndị nsọ n’oge Josef Smith nwere oke agụụ iwu Zayọn, Jerusalem Ọhụrụ (lee Ita 13:2–9; Moses 7:18, 62–64). Kedụ ihe ị na-amụ banyere Zayọn—ma obodo ukwu mgbe ochie nke ụbọchi Ịnọk na obodo ukwu ụbọchi ikpeazụ a—sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:11–15, 66–71? Taa iwu ihiwe Zayọn rụtụrụ aka na-ihiwe alaeze nke Chineke ebe ọbụla anyị bi. Kedụ ihe i nwere ike ime iji nyee aka wuo Zayọn ebe ọbụla unu bi?

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:3–5

Jizọs Kraist bụ Onye Nkwuchite ọnụ m ebe Nna nọ.

  • I nwere ike chọọ inyere ụmụ gị aka ghọta na onye nkwuchite ọnụ bụ onye na-akwado onye ọzọ. Emesịa i nwere ike kwuo banyere ọmụmaatụ niile nke ịbụ onye nkwuchite ọnụ nke ka ha wee yie ihe ha ma (dị ka ikwuchitere otu enyi). Dị ka ị na-agụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:3–5 ọnụ, nyere ụmụ gị aka chọpụta onye Onye Nkwuchite ọnụ anyị bụ na otu O si enyere anyị aka.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:32

A pụrụ m “iguzoro n’ebe niile dị nsọ.”

  • O nwere ike bụrụ ihe obi ụtọ idebe foto niile nke ebe obibi, ụlọ Nzukọ nsọ, na otu nke tempụl na gburugburu ime ụlọ ahụ. Emesịa i nwere ike tụọrọ ụmụ gị elo na-akọwa ebe ndị a ma kpọkuo ha ịguzo nso na foto ahụ ị na-akọwa. Rịọ ha ịguzo dere duu mgbe ị na-agụ ahịrị nke mbụ sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:32. Kedụ ụfọdụ ebe ndị dị nsọ Chineke na-enye anyị? Nyere ụmụ gị aka ghọta na “iguzo n’ebe ndị dị nsọ, ma … ghara ịdapụ” pụtara ịhọrọ ezi ihe oge niile, na-agbanyeghị ihe na-eme. Olee otu anyị nwere ike isi mee ebe obibi anyị ebe dị nsọ karịa?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:9

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ihe atụ nye ụwa.

  • I nwere ike kọwaara ụmụ gị na mgbe gboo, ihe atụ bụ ọkọlọtọ ma ọ bụ flag a na-ebu banye niime agha. Ọ enyeere ndị agha aka mara ebe ha ga-agbakọ na ihe ha ga-eme. Gụkọtanụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:9 ọnụ, ma kpaa ụzọ niile ozi ọma sị dịrị ka ihe atụ. Ụmụ gị nwere ike nwee ọńụ imepụta ihe atụ ma ọ bụ ọkọlọtọ nke ha, tinyekwara oyiyi niile ma ọ bụ mkpụrụokwu ndị na-egosipụta mmetụta ha banyere Onye Nzọpụta.

iwelite ihe atụ

Ozi ọma dị ka ihe atụ, ma ọ bụ ọkọlọtọ ma ọ bụ flag.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:44–45

Jizọs Kraịst ga-abịa ọzọ.

  • Mbibi ahụ nke ga-eme tupu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nwere ike menye ụmụntakịrị ụjọ. Ịtụrụ ha aka na Jizọs Kraịst nwere ike nyere ha aka tụọ anya n’okwukwe! Tulee ịkpọku ha iche echiche banyere otu o si emetụta ha mgbe otu onye pụrụ iche na-abịa nleta, dị ka papa na mama nke ukwu ma ọ bụ enyi. Olee otu ha si akwado maka nleta ahụ? Mgbe ahụ i nweziri ike gosi otu foto nke Onye Nzọpụta ma gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:44–45. Kesaara onye n’ibe ya otu o si emetụta gị banyere ọbịbịa nke Onye Nzọpụta.

  • Iji nyere ụmụ gị aka nwee mmetụta obi ụtọ banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta, i nwere ike denye na slip akwụkwọ niile ụfọdụ niime nkwa ndị jupụtara n’olileanya site na nkeji 45 (lee, n’ịmaatụ, amaokwu 44–45, 51–52, 55, 58–59, 66–71). Nye ụmụ gị akwụkwọ ndị ahụ ma rịọ ha iwelite aka ha mgbe a kpọrọ nkwa ndị ha ji n’aka aha dị ka ị na-agụ amaokwu niile ahụ. Kparịta ihe nkwa ndịa pụtara. I nwekwara ike soro ụmụ gị gụọ otu egwu banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta, dị ka “Mgbe Ọ Na-abịa Ọzọ” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 82–83).

Nyere ụmụntakịrị aka kọta Mmụọ ahụ. Dị ka ị na-akuziri ụmụ gị, gwa ha mgbe i nwetere mmetụta Mmụọ Nsọ. Kwuo banyere otu i si amata ike mmetụta Ya. N’ịmaatụ, i nwere ike nwee mmetụta jupụtara n’udo ma ọ bụ jupụtara n’ọńụ mgbe ị na-agụ otu egwu banyere Onye Nzọpụta.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, site n’aka Harry Anderson

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị