Come, Follow Me
Me 12–18: “Chọsienu ike Onyinye ndị Kachasị Mma”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46–48


“Me12–18: ‘Chọsienu ike Onyinye ndị Kachasị Mma’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46–48,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46–48,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

nzukọ nakụkụ osimiri

Nzukọ Kampụ, site n’aka Worthington Whittredge

Me 12– 18: “Chọsienu ike Onyinye ndị Kachasị Mma”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46–48

Dị ka Parley P. Pratt, Oliver Cowdery, Ziba Peterson, na Pita Whitmer Nta, hapụrụ Kirtland ma gaaniihu ikwusa ozi ọma, ha hapụrụ ihe karịrị ndị otu Nzukọ nsọ ọhụrụ dị 100 ndị nwere nnukwu ọnụnụ ọkụ n’obi mana obere nhumiihe ma ọ bụ ntuziaka. Ha enweghị akwụkwọ nke ntuziaka ọbụla, enweghị nzukọ ọzụzụ ịbụ onye ndu, enweghị nzipụ ozi ọgbakọ zuru ọha n’ikuku—n’ezie, ha enweghị ọbụna kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn ga-ezu ịga gburugburu. Ọtụtụ niime ndị kwere ekwe ọhụrụ ndị a ka akpọbataworo n’ozi ọma eweghachitere site na nkwa nke ngosipụta mmụọ dị ebube, kachasị ndị ahụ akọwara niime Agba Ọhụrụ (lee, maka ọmụmaatụ, 1 Ndị Kọrịnt 12:1–11). Mana ọtụtụ ka ọ rara ahụ ịchọpụta ezi ngosipụta nke Mmụọ. Na-ịhụta mgbagwoju anya ahụ, Josef Smith kpere ekpere maka enyemaka. Azịza nke Onyenwe anyị bụ ihe bara uru taa, mgbe ndị mmadụ na-agọnarị ma ọ bụ eleghara ihe niile nke Mmụọ anya. O kwusiri ike na ngosipụta nke ime mmụọ bụ ihe ziri ezi. O mekwara ka o doo anya ihe ha bụ: onyinye sitere na Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya, “a na-enye maka uru nke ndị ahụ hụrụ [Ya] naanya ma na-edebe iwu nsọ [Ya] niile, na ya onye na-achọ ime otu ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:9).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:1–7

Onye Nzọpụta na-anabata ndị niile chọrọ ife ofufe niime Nzukọ nsọ Ya.

Ọ dị gị ka na ndị enyi gị na ndị bi niime agbata obi gị na-enwe mmetụta nnabata na nzukọ ofufe nke ngalaba ukwu gị? Kedụ ihe ị na-eme iji mee nzukọ niile nke Nzukọ nsọ gị ebe ndị mmadụ ga-achọ ịlọghachi? Tulee otu i nwere ike isi tinye n’ọrụ ndụmọdụ nke Onyenwe anyị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:1–7 (lee kwa 2 Nifaị 26:24–28; 3 Nifaị 18:22–23).

I nwekwara ike chee banyere mgbe ị gara nzukọ niile nke Nzukọ nsọ—ma ọ bụ nzukọ nke otu ndị ọzọ—oge mbụ. Gịnị ka ndị mmadụ mere iji nyere gị aka nwee mmetụta nnabata?

Lee kwa Moronaị 6:5–9; “’Ọ Dị Ụtọ Ikwe ukwe Ịhụnaanya Na-enweghị atụ,” Abụ niile, no. 177; “Nnọọnụ” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

1:5

Welcome | Comeuntochrist.org

Welcome to a community where everyone is trying to live as Jesus taught. Come and see what we believe at comeuntochrist.org

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:7–33

akara ngosi semịnarị
Nna nke Eluigwe na-enye m onyinye ime mmụọ iji gọzie ndị ọzọ.

Ndị nsọ isimbụ kwenyere na onyinye ime mmụọ mana chọọ enyemaka ịmata ha ma ghọta ebumnuuche ha. Dị ka ị na-amụ ihe banyere onyinye niile nke Mmụọ dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:7–33, tulee ebumnuche nke “e [jiri] nye ha” (amaokwu 8). Kedụ ihe ị na-amụ banyere Chineke—onye na-enye onyinye ndị a?

I nwere ike chee maka ọmụmaatụ ndị i huworo nke ndị mmadụ na-eji onyinye ime mmụọ ndị a ma ọ bụ ndị ọzọ mee ihe? Olee otu ha si “bụrụ uru … nye ụmụ Chineke”? (amaokwu 26). I nwekwara ike lee ma i nwere ike ịmata ọmụmaatụ ndị nke onyinye ime mmụọ dị niime akwụkwọ nsọ dị ka ndị a: 1 Ndị Eze 3:5–15; Daniel 2:26–30; Ọrụ 3:1–8; Helaman 5:17–19; Mọmọn 1:1–5; Ita 3:1–15; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:10–12; Moses 7:13.

Ọmụmụ ihe gị nke onyinye ime mmụọ nwere ike duba gị itule ụdị onyinye ndị Chineke nyeworo gị. Olee otu i nwere ike i si jiri onyinye ndị a wee gọzie ụmụ Ya? Ọ bụrụ na i nwere ngọzi onye petrak, o nwere ike ịchọpụta onyinye ndị e nyeworo gị. Ịgụ ozi nke Okenye Jọn C. Pingree Nta “E nwere M Ọrụ maka Gị” nwekwara ike meghee uche gị nye onyinye ndị ị na-echebeghị echiche maka ha (Liahona, Nov. 2017, 32–35).

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịmụ ihe banyere otu e si azụlite onyinye ime mmụọ niile, nsikwu dị na mmalite ozi nke Okenye Juan Pablo Villar “Itinye n’ọrụ Agbamume Ime Mmụọ Anyị” nwere ike nye aka (Liahona, Me 2019, 95). Kedụ “ọrụ ndị” nwere ike inyere gị aka zulite onyinye ime mmụọ gị?

Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mmụọ Nsọ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47

Onyenwe anyị chọrọ ka Nzukọ nsọ Ya debe agụgụala.

Ọkpụkpọ oku nke John Whitmer idebe agụgụala nke Nzukọ nsọ garaniihu idebe omenaala ochie nke ndị ndekọihe netiti ndị nke Chineke. Gịnị mere i ji chee na idebe agụgụala dị oke mkpa nye Onyenwe anyị? Tulee nke a dị ka ị na-agụ nkeji 47 nakwa ntuziaka ndị yiri ya niime 2 Nifaị 29:11–12; Moses 6:5; Abraham 1:28, 31. Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị chọrọ ka gị dekọọ banyere ndụ gị?

Niime FamilySearch, i nwere ike idekọ ncheta niile na nhụmiihe niile sitere na ndụ gị—na ndụ nke ndị nna nna ochie gị ha (lee FamilySearch.org).

Lee Henry B. Eyring, “O Cheta, Cheta,” Liahona, Nov. 2007, 66–69.

John Whitmer

John Whitmer

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47

Mmụọ Nsọ nwere ike iduzi m dị ka m na-emejupụta ọkpụkpọ oku m.

E nwere ike gị arụtụ aka na mmetụta nke John Whitmer mgbe ọ chọrọ mmasịgharị obi ike na ọkpụkpọ oku ya sitere n’aka Chineke bịa. Gịnị ka Onyenwe anyị kwuru niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47 nye Jọn Whitmer—ma nye gị—iji kpalitemmụọ obisike na-imejupụta ọkpụkpọ oku ndị Ọ na-enye?

Ọrụ nke onye nkuzi. Ikuzi ihe karịrị igosipụta ozi. Ọ gụnyere ihiwe ọnọdụ ebe ndị otu klas nwere ike ịmụ ihe ma chọpụta eziokwu n’onwe ha ma kesaa ihe ha muworo nye otu onye n’ibe ya (lee Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 26).

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:2–6

E nwere m ike inyere ndị ọzọ aka nwee mmetụta nnabata na nzukọ nsọ.

  • Mgbe gị na ụmụ gị gụsịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:5 kwuo banyere otu Onye Nzọpụta si chọọ ka ndị mmadụ chee mgbe ha bịara Nzukọ nsọ Ya. Kpọkuo ụmụ gị iche echiche na ha hụrụ otu onye na nzukọ nsọ oge nke mbụ. Nyere ha aka mụọ ụzọ ndị e si enyere onye a aka nwee mmetụta nnabata.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:7–26

Nna nke Eluigwe na-enye m onyinye ime mmụọ iji gọzie ndị ọzọ.

  • Iji nyere ụmụ gị aka mụọ ihe banyere onyinye ime mmụọ akọwara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:13-26, tulee nchepụta nke a. I nwere ike dee onyinye ndị ahụ na mpempe akwụkwọ ma zoo ha na gburugburu ime ụlọ. Dị ka ụmụ gị na-achọta akwụkwọ nke ọbụla, nyere ha aka chọta ebe akpọrọ onyinye ahụ niime nkeji 46. Maka onyinye nke ọbụla, gị na ha kwuo banyere otu e si eji ya agọzi ndị ọzọ (nkọwa niile niime “Isi nke 20: Onyinye niile nke Mmụọ,” niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 77–80, nwere ike inye aka).

    2:19

    Chapter 20: Gifts of the Spirit: 8•March 1831

  • Gwa ụmụ gị banyere onyinye ndị i chere Nna nke Eluigwe nyeworo ha, ma kwe ka ha kwuo banyere onyinye ha hụtara nime ibe ha. Dị ka otu Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:8–9, 26, siri dị, gịnị kpatara Nna nke Eluigwe na-eji enye anyị onyinye ime mmụọ? Olee otu anyị nwere ike i si jiri onyinye anyị nyere ndị ọzọ aka?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47:1, 3

E nwere m ike idekọ agụgụala m.

  • Kwe ka ụmụ gị chọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka Jọn Whitmer mee niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47:1, 3. Unu nwekwara ike kesaara ibe unu akụkọ ndị kacha amasị sitere n’akwụkwọ nsọ. Kwupụta na anyị maara banyere akụkọ ndị a niihi na mmadụ dekọrọ ha.

  • Tulee otu i nwere ike i si kpateemmụọ ụmụ gị idekọ agụgụala niile nke onwe ha. I nwekwara ike kesaa ụfọdụ ihe ndị edere sitere na jonaalụ nke onwe gị ma ọ bụ otu akụkọ banyere otu nna nna ochie (lee FamilySearch.org ma ọ bụ app Memories). I nwere ike wete ụfọdụ ihe mkpali jonaalụ, dị ka “Gịnị mere nizu ụka nke a nke ị ga-achọ ka ụmụ ụmụ gị mara maka ha?” ma ọ bụ “Olee otu i si hụ aka nke Onyenwe anyị niime ndụ gị n’izu ụka nke a?” Obere ụmụaka nwere ike see ihe osise nke nhụmiihe ha, ma ọ bụ i nwere ike mee rekọọdụ ka ha na-akọ akụkọ ha. Kedụ ngọzi ndị na-abịa site na-idebe “agụgụala mgbe niile”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 47:1).

nwantakịrị nwanyị na-ede ihe niime jonaalụ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 48:2–3

E nwere m ike inyere ndị ọzọ aka site na-ikesa ihe enyeworo m.

  • Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 48:2–3 gị na ụmụ gị, o nwere ike i kwesịrị ịkọwa na ndị mmadụ naara abịa Ohio site na Ọwụwa anyanwụ, ma ha enweghị ebe ha ga-ebi. Gịnị ka Onyenwe anyị rịọrọ Ndị nsọ ime iji nyee aka? Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị Chineke nyeworo ha nke ha nwere ike ikesara ndị ọzọ. I nwekwara ike soro ha gụọ egwu dị ka “‘Nye,’ Ka Iyi Nta ahụ Kwuru” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 236).

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Ndị otu Nzukọ nsọ na-ekele ibe ha

Ndị niile chọrọ ife Onye Nzọpụta ofufe ka a na-anabata niime nzukọ niile nke Ndị nsọ Ya.

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị