“Me 19–25: ‘Nke Ahụ Bụ nke Chineke Bụ Ìhè’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49–50,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49–50,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Me 19– 25: “Nke Ahụ Bụ nke Chineke Bụ Ìhè”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49–50
Onye Nzọpụta bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma” anyị (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:44). Ọ maara na mgbe ụfọdụ na atụrụ na-akpafu ma alaịkpa nwere ọtụtụ ihe egwu. Ya mere Ọ na-edu anyị n’ịhụnaanya ruo nchekwa nke ozizi Ya. Ọ na-edupụta anyị site n’ihe egwu dị ka “mmụọ ụgha, nke gagharịworo niime ụwa, na-eduhie ndị bi n’ụwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:2). Ị na-eso Ya mgbe mgbe pụtara ịhapụ nchepụta ma ọ bụ omenaala ndị n’ezighị ezi. Nke ahụ bụ eziokwu maka Leman Copley na ndị ọzọ nọ na Ohio. Ha anabatawo ozi ọma eweghachitere mana ka jigidesiri ike ụfọdụ nkwenye ndị na-ezighị ezi nnọọ. Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49, Onyenwe anyị mara ọkwa eziokwu ndị meziri nkwenye ndị Leman nweburu mgbe gara aga banyere isiokwu ndị dị ka alụmalụ na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Ma mgbe ndị ntọghata Ohio “natara … mmụọ nke [ha] enweghi ike ịghọta,” Onyenwe anyị kuziiri ha otu e si aghọta ezi ngosipụta niile nke Mmụọ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:15). Onye ọzụzụ atụrụ Ọma na-enwere anyị ndidi, “ụmụ ntakịrị” Ya ndị “na-ahaghị ito na amara na niime mmata ihe nke eziokwu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:40).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49; 50:24
Jizọs Kraịst chọrọ ka m nabata eziokwu niile nke ozi ọma Ya.
Tupu isonye Nzukọ nsọ, Leman Copley buwooro onye otu otu okpukperechi a maara dị ka Otu Jikọtara ọnụ nke Ndị Kwere ekwe niime Mpụta ihe nke Ugboro Abụọ nke Kraịst, nke a makwaara dị ka Shakers. Mgbe ọ kpasịrị nkata ya na Leman, Josef Smith chọrọ nkọwa site naka Onyenwe anyị banyere ụfọdụ nkuzi nke ndị Shakers. Onyenwe anyị zaghachiri site na mkpughe dị niime nkeji 49. Ụfọdụ niime nkwenye nke ndị Shakers ka a kpọrọ aha n’isi nkeji ahụ.
Gịnị ka Onyenwe anyị kuziri niime nkeji 49 iji mezie nkwenye niile nke ndị Shakers. Kedụ ihe aka ebe ị na-ahụ niime mkpughe nke a banyere ịhụnaanya na nchegbu Ya maka ndị mmadụ ndị na-enweghị eziokwu Ya n’uju? Olee otu i ga-esi ezute ha jiri ịhụnaanya na nchegbu?
Gịnị na-amasị gị banyere nleba anya nke Onyenwe anyị niime amaokwu nke 2? I nwere ike tụnyere nke a na ihe na-eme ọ bụrụ ma gị lee naanị otu akụkụ ihe nkiri, lee otu iberibe nke puzzle, ma ọ bụ nụrụ otu akụkụ arụmarụ. Olee otu ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị si metụta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:24? Tulee ihe ị na-eme iji natakwuo ìhè site n’aka Onyenwe anyị.
Lee kwa “Leman Copley na ndị Shakers,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 117–21.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15–17
Alụmalụ n’etiti nwoke na nwanyị dị oke mkpa nye atụmatụ nke Chineke.
Na mgbalị iji megide atụmatụ nke Nna nke Eluigwe, Setan na-achọ ihiwe mgbagwoju anya banyere alụmalụ. Onyenwe anyị, n’aka nke ọzọ, na-aganiihu ikpughe eziokwu banyere alụmalụ site na ndị amụma Ya. I nwere ike chọta ụfọdụ eziokwu nke a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15–17; Jenesis 2:20–24; 1 Ndị Kọrịnt 11:11; na “Ezi na Ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa.” Depụta eziokwu ndị ị chọtara. Gịnị mere alụmalụ si dị oke mkpa nye atụmatụ nke Chineke?
Okenye Ulisses Soares kuziri na “ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere na-ama ọkwa ụkpụrụ nke uju mmekọrịta dị n’etiti nwanyị na nwoke, ma na ndụ anụ ahụ ma na mgbe ebighị ebi niile” (“Na Mmekọrịta anyị na Onyenwe anyị,” Liahona, Nov. 2022, 42). I nwere ike mụọ ozi ya, na-achọ ụkpụrụ niile “nke na-enye mmekọrịta n’etiti nwoke na nwanyị mgbam ume.” Olee otu i nwere ike i si tinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ niime ndụ gị? Ọ bụrụ ma otu onye si na okpukperechi ọzọ jụrụ gị ihe kpatara alụmalụ si dị mkpa, olee otu ị ga-esi azaghachi? Gịnị mere i jiri nwee obi ekele maka nghọta nke a?
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Alụmalụ,” “Ezi na ụlọ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Devid A. Bednar, “Alụmalụ Dị Mkpa nye Atụmatụ Ebighị ebi Ya,” Ensign, Jun 2006, 83–84; “Renaissance of Marriage” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Nkuzi niile nke Onyenwe anyị nwere ike ichekwa m site na nduhie niile nke Setan.
Ndị otu Nzukọ nsọ ọhụrụ nọ na Ohio nọọrọ n’oke agụụ ịnata ngosipụta nke ime mmụọ ekwere nkwa niime akwụkwọ nsọ. Setan, kosiladị, dịịrị njikere iduhie ha. Ọ bụrụ ma a rịọrọ gị inyere ndị otu ndị a aka ghọta otu e si amata ezigbo ngosipụta niile nke Mmụọ Nsọ, kedụ ụkpụrụ ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50 ị ga-akọwa? (lee kachasị amaokwu nke 22–25, 29–34, 40–46). Olee otu Onye Nzọpụta siworo nyere gị aka mata ndịiche dị n’etiti eziokwu na mperi?
Lee kwa 1 Ndị Kọrịnt 14:1–28; 2 Timoti 3:13–17.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:13–24
Ndị nkuzi na ndị na-amụ ihe ka ewulitere elu site n’aka Mmụọ.
Ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-ewete ọtụtụ ohere ịbụ ndị nkuzi na ndị na-amụ ihe, ma n’ebe obibi ma na Nzukọ nsọ. Otu ụzọ i nwere ike i si mụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:13–24 bụ ise otu foto nke onye nkuzi na onye na-amụ ihe. Na-esote nke ọbụla, depụta mkpụrụokwu na nkebiokwu niile sitere na amaokwu ndị a na-akuziri gị otu ihe banyere ọmụmụ na nkuzi nke ozi ọma. Olee mgbe ị nweteworo nhụmiihe nke kuziiri gị mkpa Mmụọ dị n’ikuzi nkuzi na ọmụmụ ihe? Tulee ihe i nwere ike ime iji mee ka mgbalị gị dị ka onye ọmụmụ ihe na onye nkuzi nke ozi ọma dịkwuo mma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:23–25
“Nke ahụ bụ nke Chineke bụ ìhè.”
Dị ka ị na-atule okwu niile nke Onye Nzọpụta dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:23–25, chee banyere otu i si nata ìhè nke Chineke niime ndụ gị na otu i si “achụpụ ọchịchịrị”. N’ịmaatụ, olee otu amaokwu ndị a si edu nhọrọ gị niile banyere otu i si eji oge gị eme ihe? ụdị ntụrụndụ ma ọ bụ midia ị ga-achọ? Ụdị mkparịta ụka nke i ga-etinye ọnụ na ya? Kedụ mkpebi ndị ọzọ amaokwu ndị a nwere ike inyere gị aka na ha? Abụ dị ka “Onyenwe anyị Bụ Ìhè M” (Abụ niile, nọ 89) nwere ike kpatee mmụọ mgbakwunye ọtụtụ echiche.
Lee kwa “Jee ije n’ìhè nke Chineke,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ, 16-21.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:12–14
E nwere m ike i soro Jizọs Kraịst.
-
Ikuziri ụmụ gị ụkpụrụ ndị dị niime amaokwu ndị a, i nwere ike ikwado akara nzọụkwụ anọ na foto anọ nke ga-anọchite anya okwukwe niime Jizọs Kraịst, nchegharị, baptizim, na ịnata Mmụọ Nsọ (lee foto niile dị niime ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a). Ụmụ gị nwere ike debe akara nzọụkwụ ahụ na ala debe foto ndị ahụ n’akụkụ ha. Emesịa ha nwere ike na-atụgharị ohere ije ije na akara nzọụkwụ niile mgbe ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:12–14. Nyere ha aka ghọta na mgbe anyị na-eme ihe ndị dị niime foto ndị a, anyị na-eso Jizọs Kraịst.
-
I nwekwara ike kpọkuo ụmụ gị ịtụnyere Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:12–14 na Ọrụ 2:38 nakwa ndepụta nke okwukwe nke anọ. Kedụ myiri ndị ha ga-achọta? Gịnị mere eziokwu ndị a si dị mkpa?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15–17
Alụmalụ n’etiti nwoke na nwanyị dị oke mkpa n’atụmatụ nke Chineke.
-
Iji dubata amaokwu ndị a, i nwere ike kọwaa na ndị Shakers bụụrụ otu okpukperechi kwenyere na ndị mmadụ ekwesịghị ịlụ di na nwunye (lee isi nkeji nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49). Kpọkuo ụmụ gị ịchọta ihe niile Onyenwe anyị kuziworo banyere alụmalụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 49:15–17. Kedụ ihe ọ pụtara na “alụmalụ bụ ihe Chineke kwadoro”? Ikekwe unu nwere ike gụkọta ọnụ nkeji edemede mbụ atọ nke “Ezi na ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa.” Emesịa kwuo banyere ihe kpatara alụmalụ na ezi na ụlọ si dị mkpa nye Nna nke Eluigwe.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:23–25
“Nke ahụ bụ nke Chineke bụ ìhè.”
-
Iji dubata Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:23–25, gị na ụmụ gị kwuo banyere ndịiche dị n’etiti ìhè na ọchịchịrị. Gịnị mere anyị jiri chọọ ìhè? Unu nwere ike gụkọta ọnụ nkeji edemede mbụ nke “Jee ije n’ìhè nke Chineke” niime Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ihe Nhọrọ niile (ihu akwụkwọ 17) ya na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:23–25. Kwuo banyere ụzọ niile anyị si anata ìhè nke Chineke na ụzọ niile anyị nwere ike i si chufuo ọchịchịrị. Unu nwere ike gụkọọ ọnụ otu egwu banyere ìhè nke ime mmụọ ha, dị ka “Na Amuke” (Akwụkwọ Abụ Ụmụ ntakịrị, 144).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:40–46
Jizọs Kraịst bụ Ọnye ọzụzụ atụrụ Ọma m.
-
Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi Ọgbụgba ndụ niile 50:40–46 ọnụ, i nwere ike gosi foto nke Onye Nzọpụta na ngwụcha nke ndepụta nke a ma jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a: Olee otu onye ọzụzụ atụrụ si enwe mmetụta maka atụrụ Ya? Olee otu Onye Nzọpụta si dị ka onye ọzụzụ atụrụ nye anyị?