“Me 26– Jun 1: ‘Onye nlekọta Kwesịrị ntụkwasị obi, Zie ezie, ma Mara ihe’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51–57,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51–57,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Me 26–Jun 1: “Onye nlekọta Kwesịrị ntụkwasị obi, Zie ezie, ma Mara ihe”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51–57
Maka ndị otu Nzukọ nsọ niime afọ 1830 gaaniihu, ikpokọta Ndị nsọ na iwu obodo ukwu nke Zayọn bụụrụ ọrụ nke ime mmụọ nakwa nke anụ ahụ, ebe e nwere ọtụtụ mkpa a na-ahụ anya a ga-ahazi: Mmadụ kwesịrị ịzụta ala ebe Ndị Nsọ ga-ebi. Mmadụ kwesịrị ibipụta akwụkwọ niile na mbipụta ndị ọzọ. Ma mmadụ kwesịrị ị na-azụ ahịa iji wetere ndị mmadụ nọ niime Zayọn ngwongwo. Niime mkpughe ndị edekọrọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51–57, Onyenwe anyị họpụtara ma nye ndị mmadụ iwu ịrụ ọrụ ndị a.
Mana ebe nka niile dị n’ụdị ihe ndị a ka achọrọ niime Zayọn, mkpughe ndị a nakwa akuzi na Onyenwe anyị na-achọ ka Ndị nsọ Ya tozuo oke niime mmụọ ka akpọọ ha ndị Zayọn—ndị Ya. Ọ na-akpọ onye ọbụla niime anyị ị bụ “onye nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi, zie ezie, ma mara ihe” na-enwe obi dị nchegharị, “na-eguzo[si] ike” n’oke na ọrụ ndị a họpụtaara anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51:19; 52:15; 54:2). Ọ bụrụ ma anyị nwee ike ime nke ahụ—na-agbanyeghị aka nka anụ ahụ anyị—Onyenwe anyị pụrụ iji anyị wuo Zayọn.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Onyenwe anyị chọrọ ka m bụrụ onye nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi, zie ezie, ma mara ihe.
Ọ bụrụ na gị bụụrụ onye otu Nzukọ nsọ nafọ 1831, e nwere ike akpọkuwo gị ibi ndụ iwu nnyefechasi site n’inyefe arịa gị n’aka Nzukọ nsọ site n’okpuru bishọp. Ọ gazi eweghachitere gị, n’ọtụtụ ọnọdụ, ihe i nyere, mgbe ụfọdụ jiri ihe karịrị akarị. Mana ọ bụghị kwa nnọọ ihe onwunwe gị—ọ bụ ọrụ nlekọta gị.
Taa usoro ndị ahụ dịcha iche iche, mana ụkpụrụ niile ahụ ka dị oke mkpa nye ọrụ nke Onyenwe anyị. Dị ka ị na-agụ nkeji 51, chee banyere ihe Chineke nyefeworo gị n’aka ilekọta. Kedụ ihe mkpụrụ okwu ndị a “onye nlekọta” (amaokwu 19) na “nnyefechasị” (amaokwu 5) na-egosi banyere atụmanya niile nke Chineke maka gị?
Onyeisi Spencer W. Kimball kọwara: “Niime Nzukọ nsọ ọrụ nlekọta bụ ntụkwasị obi ime mmụọ na nke anụ ahụ dị nsọ nke ana enwe ịza ajụjụ. Niihi na ihe niile bụ nke Onyenwe anyị, anyị bụ ndị nlekọta nke anụ ahụ, uche, ezi na ụlọ niile, na ihe arịa anyị niile. (Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 104:11–15). Onye nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi bụ onye na-achị ọchịchị n’ezi omume, na-elekọta ndị nke ya, ma na-elekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa” (“Ozi Ọdịmma niile: Ozi ọma n’Omume,” Ensign, Nov. 1977, 78).
Lee kwa “Iwu nke Nnyefechasi” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:9–11, 22–27
E nwere m ike ikpọku ndị ọzọ ịbakwute Kraịst ebe ọbụla m gara.
Mgbe Onyenwe anyị zigara ọtụtụ ndị ndu Nzukọ nsọ na Missouri, ọ gwara ha iji oge ha tinyere na-ime njem ma “kwusaa ozi ọma n’ụzọ” (amaokwu 25-27). Olee otu i nwere ike i si kesaa ozi ọma “n’ụzọ,” ma ọ bụ n’oge ihe omume ndị na-emekaarị na ndụ gị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14–19
Onyenwe anyị na-enyere m aka izere nduhie.
Ebe ọtụtụ mmadụ na-eche na ha nwere ngosipụta nke ime mmụọ, Ndị nsọ isimbụ nweere nchegbu banyere ịbụ ndị edufuru. Kedụ ịdọ aka na ntị Onyenwe anyị nyere ha niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14? Gịnị bụ aziza Ya? (lee amaokwu 14-19).
Usoro bụ ihe na-emegharị mgbe niile, n’ụzọ i siri chee ya. Ọmụmaatụ gụnyere ịgụ ọnụ site na ọnụọgụgụ ha otu ma ọ bụ anyanwụ na-awa awa ma na-ada ada ụbọchi ọbụla. Kedụ ọmụmaatụ ndị ọzọ i nwere ike iche maka ya? Dị ka ị na-enyocha Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14–19, chọpụta usoro nke Onyenwe anyị maka izere nduhie. O nwere ike nye aka ịmata na “ịdị nchegharị” na-egosi mmetụta nke obi umeala na nchegharị; “dị nwayọ” na-atụpụta ịdị nwayọọ na njikpa onwe; ma “iwulite” pụtara ikuzi, imelite, ma ọ bụ iwulite elu. Gịnị mere i ji eche na usoro nke Onyenwe anyị gụnyere njirimara ndị a, ya na nrube isi? Olee otu i nwere ike i si tinye n’ọrụ usoro nke a iji zere nduhie?
Kedụ ụfọdụ ọmụmaatụ nduhie ndị dị n’ụbọchi anyị taa? Olee otu anyị nwere ike i si mara mgbe a na-eduhie anyị?
N’ịmaatụ, i nwere ike tulee inyochagharị nhọrọ gị niile gbasara ihe nkiri, egwu, na mgbasa ozi ọha dabeere n’ụkpụrụ ndị dị niime “Jee ije n’ìhè nke Chineke” niime Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 16–21.
Lee kwa Gary E. Stevenson, “Eduhiekwala M,” Liahona, Nov. 2019, 93–96; “Duruo M na Gị,” Abụ niile, no. 101; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ị na-achọ Eziokwu na Izere Nduhie,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
E nwere m ike ichigharị n’ebe Onyenwe anyị nọ mgbe nhọrọ nke ndị ọzọ na-enye m nsogbu.
Enwewo mgbe ị tara ahụhụ ndakpọ olileanya mgbe onye ị dabeere na ya emeghị mkpebi ha? Nke a mere Ndị nsọ sitere na Colesville, New York, ndị tụrụanya ibi n’ala nke Leman Copley dị na Ohio. Ịmụta ihe site na nhụmiihe nke a, tulee inyochagharị isi mbido nke nkeji 54 (lee kwa Ndị nsọ, 1:125–28; “Otu Bishọp nye Nzukọ nsọ,” niime Mkpughe ndị Dị n’ọnọdụ, 78–79). Ọ bụrụ ma i nwebuuru otu enyi n’etiti Ndị nsọ nke Colesville, kedụ ndụmọdụ i nwere ike ịchọta niime nkeji 54 iji kesaara ha?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 56:14–20
Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi.
Niime amaokwu ndị a, Onyenwe anyị gwara ma ọgaraanya ma ogbenye okwu; o nwere ike dị mmasị iji tụnyere ndụmọdụ Ya nye otu abụọ ndị a. Kedụ ihe niime amaokwu ndị a dịịrị gị mkpa n’onwe gị?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51:9
Enwere m ike ị na-akwụwa aka ọtọ.
-
Iji nyere ụmụ gị aka mụọ ihe ọ pụtara ị na-akwụwa aka ọtọ, unu nwere ike gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51:9 ma kọọ akụkọ niile banyere ụmụntakịrị ndị zutere mkpebi banyere ịkwụwa aka ọtọ. I nwere ike jiri foto niile sock puppet niile, ma ọ bụ nwabebi eji akwụkwọ mee iji mee akụkọ ndị ahụ tọọ ụtọ karịa. Olee otu Onyenwe anyị si na-agọzi anyị dị ka anyị na-agbalị ịdị na-akwụwa aka ọtọ?
-
Tulee igwu egwuregwu gị na ụmụ gị. Emesịa, kparịta ụka otu egwuregwu ahụ gaara esi adị iche ọ bụrụ ma enwere onye ghọrọ aghụghọ. Gịnị mere o ji dị mkpa “ime ihe n’ụzọ kwụ ọtụ” gị na ndị ọzọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:10; 53:3; 55:1
Ana m anata onyinye nke Mmụọ Nsọ site na ntụkwasị aka n’isi.
-
Ịnata Mmụọ Nsọ site na ntụkwasị aka n’isi ka akpọpụtara ọtụtụ oge niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 51–57. Nke a nwere ike bụrụ ohere ọma iji kuziere ụmụ gị banyere emume nsọ nke a. N’ịmaatụ, ha nwere ike lee anya n’otu foto nke nwata a na-anabata ma kọwaa ihe na-eme na foto ahụ. Gwa ha kụọ aka ha mgbe ha nụrụ “ntụkwasị aka na” ma ọ bụ “ịtụkwasị aka na” ebe ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:10; 53:3; 55:1.
-
I nwekwara ike kwee “Mmụọ Nsọ Ahụ” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 105) ma ọ bụ egwu yiri ya. Nyere ụmụ gị aka chọta mkpụrụokwu niile na nkebiokwu niile niime egwu ahụ nke na-akuzi banyere onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14–19
Chineke nwere usoro iji nyere m aka ka a ghara idufu m.
-
Ikuzi ihe banyere usoro nke Onyenwe anyị maka izere nduhie, i nwere ike malite site na-inyere ụmụ gị aka chọta ọmụmaatụ nke usoro niile—dị n’eke, dị na blanket niile ma ọ bụ uwe tụrụ agwa, ma ọ bụ na ndụ kwa ụbọchi. Nyere ha aka chọta usoro Onyenwe anyị nyere niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:14–15. Hụ na ha ghọtara mkpụrụokwu ọbụla a na-amachaghị dị niime amaokwu ndị a. Olee otu anyị nwere ike i si jiri usoro nke a mata eziokwu?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 54:4–6
E kwesịrị m idobe ọgbụgba ndụ m niile oge niile.
-
Na mkpụrụokwu ndị nke gị, kọwaara ụmụ gị ihe mere Ndị nsọ ndị bịara ibi nala nke Leman Copley (lee isi mbido nke nkeji 54). Ụmụ gị nwere ike mee ka aga asị na ha bụ onye otu Nzukọ nsọ onye bịaruru na Ohio. Olee otu ọ gaara adị ha mgbe Leman mebiri ọgbụgba ndụ ya? Kedụ ihe nke a na-akuziri anyị banyere idebe ọgbụgba ndụ ma ọ bụ nkwa anyị? Gụkọtanụ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 54:6 iji chọpụta ngọzi niile maka ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 55:1–4
E nwere m ike jiri ngọzi niile Chineke nyeworo m wee gọzie ndị ọzọ.
-
Iji dubata nkeji 55, i nwere ike chọọ ịkọwa na William W. Phelps bụ onye na-ebipụta akwụkwọ ozi onye matara banyere ozi ọma ma sonye Nzukọ nsọ. Gị na ụmụ gị gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 55:1–4, ma nyere ha aka chọta ihe Chineke chọrọ ka William mee. Olee otu O si tụọ iji onyinye chi nke Williams mee ihe? Nke a nwere ike duba na mkparịta ụka banyere otu Chineke nwere ike i si kpọkuo anyị iji onyinye chi anyị wee gọzie ụmụ Ya.