“Jun 16–22: ‘Onyenwe anyị Na-achọ Obi na Uche Dị Njikere’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64–66,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64–66,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jun 16– 22: “Onyenwe anyị Na-achọ Obi na Uche Dị Njikere”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64–66
Na okpom ọkụ nhụsianya nke Ọgọst 1831, ọtụtụ ndị okenye naara eme njem laghachi azụ na Kirtland site n’ala nke Zayọn dị na Missouri. Ndị njem ahụ nwere ekpo ọkụ ma ike gwụrụ ha, ma obi iko n’elu ngwangwa tụgharịrị ghọọ esemokwu. Ọ dịịrị ka iwulite Zayọn, obodo ukwu nke ịhụnaanya, ịdị n’otu, na udo, na-aga iwe ogologo oge.
Na-ịdaba nke ọma, iwulite Zayọn—niime Missouri na 1831 ma ọ bụ niime obi anyị, ezi na ụlọ niile, ngalaba ukwu anyị taa—anaghị achọ ka anyị zuo oke. Kama, “n’aka gị a chọrọ ka ị gbaghara,” ka Onyenwe anyị kwuru (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:10). Ọ na-achọ “obi na uche dị njikere” (amaokwu 34). Ma Ọ na-achọ ndidi na nrụsị ọrụ ike, niihi na a na-ewu Zayọn na ntọala nke “ihe ndị dị obere” emejupụtara site n’aka ndị ahụ ndị “na-adịghị ada mba na-ime ihe ọma” (amaokwu 33).
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:133–34, 136–37.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:1–11
“Gbagharanụ ibe unu.”
Tulee ihe ndị a sotere dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:1–11:
-
Chee banyere oge mgbe Onyenwe anyị gbaghaara gị. Olee otu o si metụta gị?
-
E nwere onye i kwesịrị ịgbaghara? Gịnị mere ịgbaghara ndị ọzọ si esi ezigbo ike? Kedụ ihe na-enyere gị aka merie isi ike ndị a?
-
Kedụ eziokwu ndị gbasara mgbaghara dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:1–11 dịịrị ka ọ dị gị mkpa? Gịnị mere i ji chee na Onyenwe anyị na-enye anyị iwu “ịgbaghara onye niile”? (amaokwu 10).
Ọ bụrụ na ị na-adọlị ịgbaghara, tụlee uche ịmụ ozi nke Okenye Jeffrey R. Holland “Ije ozi nke Mmezi” (Liahona, Nov. 2018, 77–79) ma ọ bụ ozi nke Kristin M. Yee “Ịma mma maka Ntụ niile: Ụzọ Ọgwụgwọ nke Mgbaghara” (Liahona, Nov. 2022, 36–38). Gịnị ka ị na-amụ banyere otu Kraịst nwere ike i si nyere gị aka gbaghara?
Mmekọrịta ezi na ụlọ niile nwere ike wete ọtụtụ oghere iji gbaghara. Chee maka ndị otu ezi na ụlọ gị. Onye ka i kwesịrị ịgbaghara? Olee otu anyị si “ata ahụhụ” (amaokwu 8) mgbe anyị agbagharaghị ibe anyị? Olee otu mgbaghara si emetụta mmekọrịta niiile nke ezi na ụlọ gị?
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mgbaghara,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Mgbaghara: “Ibu M Ka E Mere Ịdị Mfe” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:31–34
Onyenwe anyị rịọrọ maka “obi na uche m dị njikere.”
Ọ dịtụla mgbe ị “dara mba n’obi” nihi “ime ihe ọma” niile ị na-anwa imezu? Chọọ maka ozi nke Onyenwe anyị nye gị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:31–34. Kedụ ihe Onyenwe anyị chọrọ ka gị mee iji wete na mmezu “nnukwu ọrụ” Ya?
Chee maka ihe eji amụ ihe nke ga-egosipụta amaokwu 33—ihe buru ibu nke ihe mejuru ya bụ ụmụ obere ihe, dị ka mozayik ma ọ bụ ụlọ brick. Kedụ “ụmụ obere ihe” i nwere ike ime ụbọchi niile iji “[tụọ] ntọala” nke nnukwu ọrụ nke Chineke? Gịnị bụ ụfọdụ ọmụmaatụ nke “nnukwu ọrụ” nke Onyenwe anyị nyeworo gị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:31–34
“Obi na uche dị njikere”
Okenye Donald L. Hallstrom tụrụ ero na nke a nwere ike ịbụ ihe nkebiokwu “obi na uche dị njikere” pụtara:
“Obi bụ keọdịmara ịhụnaanya na mkpebi. Anyị na-achụ aja ma na-ebu ibu arọ niile maka ndị ahụ anyị hụrụ naanya nke anyị agaraghị anagide niihi nzube ọbụla ọzọ. Ọ bụrụ na ịhụnaanya adịghị ire, mkpebi anyị na-ebelata. …
“Inwe ‘uche dị njikere’ gụnyekwara inye mgbalị anyị kachasị mma na echiche makasịrị ma na-achọ amamiihe nke Chineke. Ọ na-atụ ero na ọmụmụ ihe oge ndụ anyị nke anyị tinyechasịrị obi kwesịrị ịbụ ihe ndị nwere ọdịdị ebighị ebi. Ọ pụtara na a ga-enwerịrị mmekọrịta n’enweghị ike mgbaghapụ n’etiti ịnụ okwu Chineke na irube isi na ya” (“Obi na Uche Dị njikere,” Ensign, Jun 2011, 31–32).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:41–43
Zayọn ga-abụ “ensign nye ndị mmadụ.”
Ensign bụ “ọkọlọtọ ma ọ bụ ụkpụrụ nke ndị mmadụ na-agbakọta n’ọnọdụ ịdị n’otu nke ebumnuche ma ọ bụ nke njirimara” (Odudu nke Akwụkwọ nsọ, “Ensign,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Olee otu Zayọn—ma ọ bụ Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị—siworo dị ka ensign nye gị? Tụlee uche n’ọmụmaatụ ndị ọzọ ndị a bụ ndị ndị eweliri elu, dị ka ensign, iji gọzie ndị mmadụ: Ọnụọgụgụ 21:6–9; Matiu 5:14–16; Alma 46:11–20. Chọọ ụzọ ndị ọzọ Onyenwe anyị si akọwa Zayọn niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:41–43.
Lee kwa “Kwe Zayọn niime Ịma mma Ya Bilie,” Abụ niile, no. 41.
Alaeze Chineke n’elu ụwa na-akwado ndị ụwa maka nlọghachi nke Onye Nzọpụta.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 65 na-enye nkọwa na-akpatemmụọ nke ozi nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị n’ụbọchi ikpeazụ ndị a. Tụlee inyochagharị nkeji nke a, na-achọ azịza nye ajụjụ niile dị ka ndị a: Gịnị ka Onyenwe anyị chọrọ ka alaeze Ya mezuo n’ụwa? Gịnị ka Ọ chọrọ ka m mee iji nye aka?
Lee kwa “Kwadoo Taa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.
Onyenwe anyị maara echiche niile nke obi m.
Obere oge mgbe nsonye na Nzukọ nsọ gasịrị, William E. McLellin rịọrọ Josef Smith ikpughe uche Chineke maka ya. Josef amaghị ya, mana William nwere ajụjụ ise nke onwe ọ naara atụanya na Onyenwe anyị ga-aza ya site n’aka Onye Amụma Ya. Anyị amaghị ihe ajụjụ niile nke Williams bụụrụ, mana mkpughe enyere maka ya, ugbu a Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 66, zara ajụjụ nke ọbụla ruo “n’afọ ojuju zuru oke n’ụzọ niile” nke Williams (“Ajụjụ Ise nke William McLellin,” niime Mkpughe nille dị N’ọnọdụ, 138).
Dị ka ị na-agụ nkeji 66, chee banyere ihe Onyenwe anyị maara banyere William McLellin na nchegbu niile na nzube niile nke obi ya. Olee otu Onyenwe anyị siworo gosi gị na Ọ maara gị? Ọ bụrụ na i nwere ngọzi nke onye petrak, tulee ịmụ ya. Dị ka ị na-eme ya, gịnị ka Mmụọ Nsọ na-enyere gị aka ghọta banyere uche nke Chineke maka gị?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:7–10
Jizọs Kraịst chọrọ ka m gbaghara onye niile.
Hụba ama: Dị ka ị na-akuziri ụmụ gị banyere iwu nke Onyenwe anyị “ịgbaghara ndị niile,” i nwere ike chọọ idokwu anya na ịgbaghara apụtaghị ikwe ka ndị mmadụ na-emerụ anyị ahụ. Gbaa ha ume ịgwa dịmkpa kwesịrị ntụkwasị obi ma ọ bụrụ ma mmadụ mee ha ihe ọjọọ ma ọ bụ metụ ha aka ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.
-
Mgbe ị gụsịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:10 gị na ụmụ gị, soro ha kwuo okwu banyere ihe ọ pụtara ịgbaghara mmadụ. I nwere ike kesaa ọmụmaatụ ole ma ole dị mfe. Elemaanya ha nwere ike jijee ọmụmaatụ ndị a iji mụọ ịgbaghara.
-
I nwere ike gwa ụmụ gị ịtụ atụmatụ otu ha ga-esi akuziri mmadụ ihe—dị ka nwanne nke ọ tọrọ—banyere ịgbaghara ndị ọzọ Nyere ha aka chọta nkebiokwu niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:7–10 ndị ha nwere ike iji mee ihe dị ka ha na-akuzi ihe.
-
Gụọnu otu egwu banyere mgbaghara, dị ka “Nyere M aka, Ezi Nna” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 99). Gịnị ka egwu nke a na-akuziri anyị banyere ịgbaghara ndị ọzọ?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:33
“Nnukwu ọrụ” nke Chineke ka ewuru n’elu “ụmụ obere ihe.”
-
I nwere ike gosi ụmụ gị ụfọdụ ihe nke ejiri ururu ihe mee, dị ka puzzle ma ọ bụ rug. Mgbe ahụ unu nwere ike gụkoọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:33. Gịnị bụ “nnukwu ọrụ” nke Chineke? Gịnị bụ “ururu ihe” ndị anyị nwere ike ime nke ga-enye aka?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:34
Enwere m ike isoro Jizọs jiri obi na uche m.
-
Dị ka ị na-agụrụ ụmụ gị site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:34, i nwere ike metụ obi na isi gị aka dị ka ị na-agụ “obi” na “uche,” ma kpọkuo ụmụaka ahụ isoro gị mee ya. Olee otu anyị nwere ike i si nyefee obi anyị (ọchịchọ niile) na uche (echiche niile) n’aka Onye nzọpụta?
Onyenwe anyị maara onye m bụ ma hụ m naanya.
-
Nyere ụmụ gị aka ghọta na William E. McLellin nwererịị ajụjụ ise maka Onyenwe anyị. Josef Smith natara azịza niile nye ajụjụ ndị a ọbụna agbanyeghị ọ maghị ihe ajụjụ ndị nke William bụụrụ. Gwa ụmụ gị banyere oge mgbe Onyenwe anyị gosiri gị ihe Ọ chọbuuru gị ime, ma kwuo okwu banyere ngọzi niile nke bịara site na-isoro ntụzi aka Ya. I nweziri ike gụkọọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 66:4 ọnụ ma kpọkuo ụmụ gị ịchọ oghere niile iji ghọta ihe Onyenwe anyị chọrọ ha ime.
E nwere m ike kwadoo ụwa ịnata Jizọs Kraịst.
-
Dị ka ụmụ gị na-ele anya na foto nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta, rịọ ha ịkọwa ihe ha hụrụ ma ọ bụ ihe ha maara banyere ihe omume nke a. I nwekwara ike nye ụmụ gị mkpụrụ okwu niile na nkebiokwu niile banyere Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ịchọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 65. Gịnị ka mkpụrụ okwu na nkebiokwu ndị a na-akuziri anyị? Olee otu anyị nwere ike i si kwadoo maka nlọghachi nke Onye Nzọpụta?