Ọgbakọ Zuru ọha
Mma maka Ntụ: Ụzọ Ọgwụgwọ nke Mgbaghara
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Mma maka Ntụ: Ụzọ Ọgwụgwọ nke Mgbaghara

Ibi ndụ n’ụzọ nke ị na-enye ịma mma maka ntụ nke ndụ gị bụ omume nke okwukwe nke na-agbaso Onye Nzọpụta ahụ.

Akwụkwọ nke 1 Samuel na agụnye akụkọ a na-akachaghị ama nke David, eze Israel n’ọdịnihu, na otu nwanyị aha ya bụ Abigail.

Mgbe Samuel nwụsịrị, David na ndị ikom ya si n’ebe Eze Saul nọ pụọ, onye chọrọ ndụ David. Ha na-elekọta igwe atụrụ na ndị ohu otu ọgaranya aha ya bụ Nabal, bụ onye obi tara mmiri. David zipụrụ mmadụ iri nime ndị ikom ya ka ha kelee Nabal ma rịọ ya ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Nabal wee were mkparị zaa arịrịọ David ma zipụ ndị ikom ya n’aka efu.

Na iwe, David kwadoo ndị ikom ya ka ha rigo megide Nabal na ụlọ ya, nasị, “O nyeghachim ihe ọjọ n’ọnọdụ ezi ihe.”1 Otu odibo gwara Abigail, nwụnye Nabal, gbasara ajọ omume ndị ikom nke David mesoro di ya. Abigail ji ngwa ngwa chịkọta nri na ihe ndị dị mkpa wee gaa ịrịọchitere ya.

Mgbe Abigail zutere ya, “o wee daa kpue ihu ya n’ala n’iru David, kpọ isi ala.

“O wee daa n’ala n’ụkwụ ya, ma si, onye nwem, ka ajọ omume a dakwasim. …

“Ya mere ugbua, … Onyenwe anyị egbochiwo gị ibia ịwufu ọbara, na ịbo ọbọ n’onwe gị site n’aka nke gị. …

“… Ugbu a ngọzi a nke oru gị nwanyị wetara onyenwe m, ka enye ya ụmụ okorọbịa. …

“A rịọ m gị, gbaghara ajọ omume nke oru gị. …

“Ma David wee si Abigail, Onye agọziri agọzi ka Onyenwe anyị Chineke nke Israel bụ, onye zitere gị taa izute m:

“Ma ngọzi dịrị ndụmọdụ gị, ma ngọzi dịkwara gị, onye nke gbochiworo m taa ị bịa ịwufu ọbara, na ịbo ọbọ n’onwe m site n’aka nke m. …

“Ya mere David wee nara ya ihe o wetara ya, ma si ya, Rigoro ụlọ gị n’udo; … E gewo m ntị n’olu gị, ma nabata gị.”2

Ha abụọ wee laa n’udo.

Nime akụkọ a, enwere ike hụụ Abigail dịka ihe siri ike ma ọ bụ ihe nnọchianya nke Jizọs Kraịst.3 Site na aja mgbaghara mmehie Ya, O nwere ike ị tọhapụ anyị site na mmehie na ịdị arọ nke obi na-alụ ọgụ ma nye anyị nkwado dị anyị mkpa.4

Dịka Abigail siri dị na njikere iburu mmehie Nabal n’onwe ya, otu ahụ ka Onye Nzọpụta mere—na ụzọ a na-apụghị ike ịghọta—bukwasi Ya mmehie anyị nile na mmehie nile ndị merụrụ ma ọ bụ mejọọ anyị. 5 Na Getsemani na n’obe, Ọ nyakwasịrị onwe ya mmehie ndị a. O mere ụzọ anyị ga-esi hapụ obi nke na- abọ ọbọ. “Ụzọ” ahụ bụ site na n’ịgbaghara—nke nwere ike ịbụ otu nime ihe ndị kacha isi ike anyị na-eme na otu nime ihe ndị kacha nsọ anyị ga-enwete nhụmịhe ya. N’ụzọ nke mgbaghara, ike mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere ike ịgbaba nime ndụ anyị ma wee malite ịgwọ ọgbaghara miri emi nke obi na mkpụrụ obi.

Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo na Onye-nzọpụta na-enye anyị ikike ịgbaghara:

“Site na Aja mgbaghara mmehie agwụghị agwụ Ya, ị nwere ike ịgbaghara ndị ahụ mejọrọ gị ma ndị n’achọghị ị kwete na ha mere gị ezigbo ịhe ọjọọ.

“Ọ na-adịkarị mfe ịgbaghara onye ahụ ji obiọacha na umeala chọọ mgbaghara gị. Mana Onye nzọpụta ga-enye gị ike iji gbaghara onye ọbụla onye kpasịrị gị agwa ojoo n’ụzọ ọbụla. Mgbe ahụ ajọ omume ha apụghịkwa ime ka mkpụrụ obi gị dajụọ.”6

Ụba nri na ihe enyemaka Abigail wetara nwere ike ịkụziri anyị na Onye Nzọpụta na-enye ndị e merụrụ ahu ihe na enyemaka ahụ anyị chọrọ iji gwọọ ma mee ka anyị dị mma.7 A hapụghị anyị ịhụ maka nsonazụ nile nke omume ndị ọzọ n’onwe anyị; enwekwara ike ime ka anyị zuo oke ma nwee ohere ịzọpụta anyị site na ibu arọ nke obi na-alụ ọgụ na omume ọbụla nile nwere ike isochi azụ.

Onyenwe anyị kwuru, “Mụ, Onye-nwe, ga agbaghara onye m chọrọ ị gbaghara, mana nye unu a chọrọ ka unu gbaghara mmadụ nile.”8 Onyenwe anyị chọrọ ka anyị gbaghara maka ọdịmma anyị.9 Mana Ọ dịghị asị anyị mee ya n’enweghị enyemaka Ya, ịhụnaanya Ya, nghọta Ya. Site na ọgbụgba ndụ nile anyị na Onyenwe anyị, onye ọbụla nime anyị nwere ike ịnata ume, nduzi, na enyemaka anyị chọrọ iji gbaghara ma nata mgbaghara.

Biko mara na ịgbaghara mmadụ apụtaghị na ị ga-etinye onwe gị n’ọnọdụ ebe ị ga-anọgide na mmerụ ahụ. “Anyị nwere ike ịrụ ọrụ ịgbaghara mmadụ ma ka na-enwe mmetụta nke Mmụọ nsọ ịnọpụ ebe ha nọ.”10

Ka Abigail si nyere Devid aka ka ọ ghara inwe “iwe nke obi”11 ma ị nweta enyemaka ọ chọrọ, otu ahụ ka Onye Nzọpụta ga-esi nyere gị aka. Ọ hụrụ gị n’anya, ma Ọ na-ezutekwa gị n’ụzọ gị “jiri ọgwụgwọ na nku ya.”12 Ọ chọrọ udo gị.

Mụ onwe m ahụla ọrụ ebube nke Kraịst na-agwọ obi m na-alụ ọgụ. Site na ikike nke nna m, a na m agwa unu na m tolitara n’ụlọ ebe ọ na-adịghị m mma mgbe nile n’ihi mmeso ọjọọ nke mmetụta uche na nke ọnụ. Na oge m bụ nwanta na oge ntorobịa, A dara m nna m iwe ma nwee iwe nime obi m nihi ihe ọjọọ ahụ.

Nime ọtụtụ afọ na mbọ m na-agba ịchọta udo na ọgwụgwọ n’ụzọ ahụ nke mgbaghara, a bịara m ghọta n’ụzọ miri emi na nwa nke Chineke ahụ nke kpuchiri mmehie m nile, bụ otu Onye Mgbapụta ahụ nke ga-azọpụta ndị mejọrọ m nke ukwuu. E nweghị m ike ikwere eziokwu nke mbụ na ekwenyeghị na nke abụọ.

Dịka ịhụnaanya m maka Onye Nzọpụta torola, otua ka ọchịchọ m iji bam ọgwụgwọ Ya dochie imerụ ahụ na iwe. Ọ bụrụla usoro nke ọtụtụ afọ, na-achọ obi ike, adịghị ike, ntachi obi, na ịmụta ịtụkwasị obi na ike dị nsọ nke Onye Nzọpụta ịzọpụta na ịgwọ ọrịa. A ka m nwere ọrụ ịrụ, kama obi m anọghịzi n’okporo ụzọ agha. E nyela m “obi ọhụrụ”13—nke nwere mmetụta ịhụnaanya miri emi na nke na-adịgide nke Onye Nzọpụta nke onwe, onye nọdụrụ m n’akụkụ, onye jiri nwayọ na ndidi duga m n’ebe dị mma, onye soro m bee akwa, onye matara mwute m.

Onyenwe anyị eziteworu m ngọzi nkwụghachi ụgwọ dịka Abigail wetara ihe dị David mkpa. O zitewo ndị ndụmọdụ na ndụ m. Ma nke kachasị ụtọ na nke na-agbanwe agbanwe bụ mmekọrịta mụ na Nna m nke Eluigwe. Site n’aka Ya, ejiwo m obi ekele mata ịhụnaanya di nrọ, nchekwa, na nduzi nke Nna zuru oke.

Okenye Richard G. Scott siri: “Ị pụghị ihichapụ ihe e merela, ma ị nwere ike ịgbaghara.14 Mgbaghara na agwọ ọnya jọgburu onwe ya, n’ihi na ọ na-enye ohere ka ịhụnaanya nke Chineke sachapụ obi gị na uche gị n’ihe ọjọọ nke ịkpọasị. Ọ na-asachapụ uche gị nke ọchịchọ imegwara. Ọ na-arọpụta ebe maka nsachapụ, ọgwụgwọ ọrịa, iweghachi ịhụnaanya nke Onyenwe anyị.”15

Nna m nke ụwa enwekwala mgbanwe dị ebube nke obi n’afọ ndị na-adịbeghị anya ma wee bịakwute Onyenwe anyị—ihe m na-agaghị atụ anya na ndụ a. Ọgbụgba ama ọzọ nye m maka ike zuru oke na mgbanwe nke Jizọs Kraịst.

A mara m na O nwere ike ịgwọ onye mmehie na ndị emehiere. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa, onye tọgbọrọ ndụ Ya ka anyị wee dị ndụ ọzọ. Ọ sịrị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyeere m, niihi na o tewo m mmanụ ikuziri ndị ogbenye oziọma; o zitewo m ịgwọ obi tiwara etiwa, ikwusa nnapụta nye ndị a dọkpụụrụ n’agha, na ime ka onye isi hụ ụzọ, na ime ka ndị a na-echi ọnụ n’ala nwere onwe ha16

Nye ndị nile obi ha tiwara etiwa, ndị a dọọrọ n’agha, ndị e chifịa, na ikekwa kpuo isii site na ịmeru ahụ ma ọ bụ mmehie, Ọ na-enye ọgwụgwọ, mgbake, na mgbapụta. A na m agba ama na ọgwụgwọ na mgbake Ọ na-enye dị adị. Oge ahụ nke ịgwọ ọrịa bụ nke onye, ma anyị enweghị ike ikpe onye ọzọ ikpe na oge ya. Ọ dị mkpa ka anyị nye onwe anyị oge dị mma iji gwọọ ọrịa ma na-emere onwe anyị ebere na usoro ahụ. Onye Nzọpụta na-enwe obi ebere ma na-ańa ntị ma na-adị njikere inye enyemaka anyị chọrọ.17

N’ụzọ nke mgbaghara na ọgwụgwọ ka edobere nhọrọ ịghara ịdịgide ụkpụrụ nile ma ọ bụ mmerịkọta nile na-adịghị mma na ezinaụlọ anyị nile ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ. Nye ndị nile anyị na-enwe mmetụta, anyị nwere ike inye obi ebere maka obi ọjọọ, ịhụnaanya maka ịkpọasị, ịdị nwayọ maka mkpasu iwe, enweghị nsogbu maka nsogbu, na udo maka esemokwu.

Ịnye ihe a gọnarị gị bụ akụkụ dị ike nke ọgwụgwọ ọrịa Chineke nke ga-ekwe omume site na okwukwe nime Jizọs Kraịst. Ibi ndụ n’ụzọ nke ị na-enye, dịka Aịsaịa kwuworo, ịma mma maka ntụ nke ndụ gị18 bụ omume nke okwukwe nke na-agbaso ihe atụmatụ kachasị nke Onye Nzọpụta onye tara ahụhụ nile ka O wee nyere mmadụ nile aka.

Josef nke Ijipt biri ndụ na ntụ. Ụmụnna ya kpọrọ ya asị, rara ya nye, ree ya ka ọ bụrụ ohu, tụọ ya mkpọrọ n’ụzọ na-ezịghị ezi, ma chefuo ya site n’aka onye kwere nkwa inye aka. Ma ọ tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị. “Onyenwe anyị nọnyere Josef”19 ma doo ọnwụnwa ya nile nsọ maka ngọzi na uto nke ya— na maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya na Ijipt nile.

Mgbe Josef zutere ndị nwanne ya nwoke dịka nnukwu onye ndu n’Ijipt, mgbaghara ya na echiche ziri ezi pụtara ihe n’okwu amara o kwuru.

“Ma ugbu a unu ewekwala iwe, ma ọbụ were onwe unu iwe, na unu rere m n’ebe a: n’ihi na Chineke zitere m n’iru unu ichebe ndụ. …

“Ya mere ugbu a ọ bụghị unu zitere m n’ebe a, kama ọ bụ Chineke.”20

Site n’aka Onye Nzọpụta, ndụ Josef bụrụ “mma maka ntụ.”21

Kevin J. Worthen, onyeisi nke BYU kwuru na Chineke “pụrụ ime ihe ọma a pụta … ọ bụghị nanị site na ihe ndị ịgaziri anyị kamakwa site na ọdịda anyị na ọdịda nke ndị ọzọ na-akpatara anyị ihe mgbu. Chineke dị mma otua ma dị ike.”22

A na m agba ama na ihe atụmatụ kachasị ukwuu nke ịhụnaanya na mgbaghara bụ nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, onye sịrị nime oke mwute, “Nna gbaghara ha; n’ihii ha amaghị ihe ha n’eme.”23

A maara m na Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ịdị mma na olile anya maka ụmụ Ya ọ bụla. Na Jeremaya ka anyị guru, “N’ihi na amawo M echiche nile nke Mụ n’eche n’ebe unu nọ, ka Onyenwe anyị kwuru, echiche nke udo.”24

Jizọs Kraịst bụ Mezaya nke gị, Onye Mgbapụta na Onye Nzọpụta gị hụrụ gị n’anya, onye maara arịrịọ nile nke obi gị. Ọ chọrọ ọgwụgwọ na obi ụtọ gị. Ọ hụrụ gị na anya. Ọ na eso gị ebe akwa na mwute gị ma na-ańụrịkwa ọńụ ime ka ahụ dị gị mma. Ka anyị were obi ma were aka ịhụnanya Ya nke na-esetipụ25 dịka anyị na-eje ije n’ụzọ ọgwụgwọ nke mgbaghara bụ ekpere m n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta