Ọgbakọ Zuru ọha
Mgbam ume n’Ịma ọkwa Eziokwu
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


11:26

Mgbam ume n’Ịma ọkwa Eziokwu

Ozugbo anyị mụtara eziokwu, Onyenwe anyị na-enye anyị ohere ime ihe Ọ gaara eme ma ọ bụrụ na ọ nọ ebe a taa.

Na 1982, a naara m emecha associate digrii m na tọpọgrafị n’otu ụlọ akwụkwọ nke ọrụ aka.

Mgbe oruru ngwụcha nke afọ ahụ, otu onye otu klass m kpọkuru m ịbịa ka anyị kpaa nkata. E chetara m na anyị hapụrụ ndị otu klass ndị ọzọ ma gaa na mpaghara nọ n’azụ ebe a na-eme egwuregwu ahụ ike. Mgbe anyị rutere ebe ahụ, ọ gwara m okwu gbasara mkpebi okpukpere chi ya niile, ma ọ bụghị naanị na o gosịrị m otu akwụkwọ, kama o nyere m akwụkwọ ahụ. N’eziokwu, anaghị m echetacha okwu niile o kwuru, kama e chetara m oge ahụ nke ọma na ụzọ o siri metụta m mgbe ọ sịrị, “A chọrọ m ịgba ama m nye gị na akwụkwọ nke a bụ eziokwu, ma na-eweghachitewo ozi ọma nke Jizọs Kraịst.”

Mgbe anyị kpachara nkata, a lara m n’ebe obibi, sagharịa ibe ihu akwụkwọ ole ma ole dị niime akwụkwọ ahụ, ma tụkwasị ya n’elu ebe a na-edobe akwụkwọ. Niihi na anyị nọọrọ na ngwụcha nke afọ ahụ ma ọ bụụrụ ngwụcha afọ nke tọpọgrafị digrii m, enyeghị m akwụkwọ ahụ ezigbote ohere, ma ọ bụ onye otu klass m onye nke mụ na ya kparịtara nkata maka ya. Aha akwụkwọ ahụ bụ ihe i nwererịị ike chee maka ya. Ee, ọ bụụrụ Akwụkwọ nke Mọmọn.

Mgbe ọnwa ise gasịrị, ndị mgbasa ozi ọma bịara n’ụlọ m; ha naara ala ala dị ka m si ọrụ na-alọta n’ebe obibi. A kpọkuru m ha ịlọghachi bata n’ụlọ. Anyị nọdụrụ ọdọ n’obere obi nọ niihu ụlọ m, ma ha akuzierem ihe.

Na-ime nchọgharị m maka eziokwu, a jụrụ m ha olee nzukọ nsọ nke bụ eziokwu ma kedụ ka m ga-esi achọta ya. Ndị mgbasa ozi ọma ahụ kuziiri m na m nwere ike nwete ọsịsa n’onwe m. Site n’oke ọchịchọ na olileanya dị ukwuu, a nabatara m aka mgba ha ịgụ ọtụtụ nkeji sitere n’Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ. E kpere m ekpere, jiri ezigbo obi na ezigbo ebum n’obi (lee Moronaị 10:4–5). Azịza nye ajụjụ m doro anya, ma ka ọtụtụ ụbọchị gasịrị—ikwu ya kpọm kwem nụzọ kacha doo anya na Me 1,1983—e mere m baptizim ma mee m onye otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a.

Taa, mgbe m na-eche usoro nke mmemme ndị ahụ mere, ana m ahụta nke ọma otu mkpa agbam ume nke onye otu klass m dịịrị mgbe ọ gbara ama ya gbasara eziokwu ahụ eweghachitere ma nye m ihe mgba ama eji n’aka banyere Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, ọbụna Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ. Ihe omume ahụ dị mfe, mana bara nnukwu uru nye m, kewapụtara njikọ n’etiti mụ na ndị mgbasa ozi ọma ahụ mgbe m zutere ha.

Egosịwo m eziokwu ahụ, ma mgbe m mechara baptizim, a ghọrọ m onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. N’oge afọ ndị soterenụ, nakwa site na enyem aka nke ezi ndị pụrụ iche ndị dị ka ndị ndu, ndị nkuzi, na ndị enyi, nakwa site na ọmụmụ ihe nke mụ onwe m, a mụtara m na mgbe m kpebiri ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, anabatawo m ọrụ nke na-abụghị naanị ịkwado eziokwu ahụ kama kwa nke ịma ọkwa ya.

Mgbe anyị kwenyere ikwere n’eziokwu ma gbasoro ya, na mgbe anyị gbara mbọ ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, anyị anaghị anata asambodo na-ekwe nkwa na anyị agaghị emejọ, na agaghị anwa anyị ọnwụnwa ịdapụ site n’eziokwu, ma na-agaghị akatọ anyị, ma ọbụna na anyị agaghị enwete nhụmiihe ntaram ahụhụ. Mana ọmụmaihe nke eziokwu na-akụzi na mgbe anyị banyere n’ụzọ ahụ kwụ ọtọ ma dị wara wara nke ga-edughachi anyị niihu Nna nke Eluigwe, aga enwe ụzọ esi agbanarị nsogbu ndị a mgbe niile (lee 1 ndị Kọrịnt 10:13; a ga-enwe mgbe niile ikwe omume nke anyị ị nọ na nchekasị nke obi abụọ anyị tupu anyị a na-enwe obi abụọ n’okwukwe anyị (lee Dieter F. Uchtdorf, “Bịanụ, Sonyere Anyị,” LiahonaNọv. 2013, 21); ma n’ikpeazụ, a na-ekwe anyị nkwa na anyị enweghị ike a nọ naanị anyị mgbe anyị na-agabiga ntaram ahụhụ niile, niihi na Chineke na-eleta ndị Ya netiti mkpagbu ha niile (lee Mozaya 24:14

Ozugbo anyị mụtara eziokwu, Onyenwe anyị na-enye anyị ohere ime ihe Ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nọọrọ ebe a taa. N’ezie, O gosịwo anyị site na nkuzi Ya niile ihe anyị na-ahaghị ime: “Ma unu ga-apụ site n’ike nke Mmụọ m, na-ezisa ozi ọma m, abụọ na abụọ, n’aha m, na-ewelite olu unu elu dị ka eji ụda opi, na-ama ọkwa okwu m dị ka ndị mmụọ ozi nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:6). Ohere maka ije ozi mgbasa ozi ọma n’ebe ndị ntoroọbịa anyị nọ bụ ihe pụrụ iche!

Bikonụ ndị ndịikom nta, unu akpọlakwala nkwado unu iji jeere Onyenwe anyị ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma azụ. Dị ka unu na-ezute ọnọdụ ndị nwere ike mee mkpebi ije ozi mishọn a bụrụ ihe rara ahụ—ụdị ihe ndị dị ka ịkwụsịtụ ọmụmụ ihe gị nwa oge nta, ị sị enyi gị nwanyị baị baị na-enweghị ihe gosịrị na i nwere ike ime ya enyi ọzọ, ma ọ bụ ọbụna ịhapụ ọrụ—cheta ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta. N’oge Ọ na-eje ozi, O sitekwara otu ahụ zute ihe isi ike, tinyere nkatọ, mkpagbu, na nke bụ isi ya iko ilu nke aja mgbaghara mmehie Ya. Otu ọ dị niime ọnọdụ niile Ọ chọrọ ime uche Nna Ya ma nye Ya otuto. (Lee Jọn 5:30; 6:38–39; 3 Nifaị 11:11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18–19.)

Ndịiyom Nta, unu bụ ezi ndị anabatara nke ọma, ma ọ bụrụ na unu a chọọ, ịrụ ọrụ niime ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, ma dị ka unu na-akwado onwe unu ije ozi mgbasa ozi ọma n’uju, agaghị agụpụ unu site n’otu ụdị ihe aka mgba ndị ahụ.

N’ebe ndị niile mere mkpebi ijere Ya ozi nọ, ana m ekwe unu nkwa na ọnwa 24 ma ọ bụ18 nke ije ozi ga-agafe n’ubi ama mishọn dị nnọọ ka ha ga-agafe ma ọ bụrụ na unu nọdụrụ n’ebe obibi, mana ohere niile ndị ahụ chebiiri ndịikom nta na ndịinyom nta nke Nzuko nsọ n’ubi ama mishọn bụ ndị pụrụ iche. Ohere ọma nke ịnọchi anya Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na Nzukọ nsọ Ya abụghị ihe enwere ike ịgbanyere azụ. Isoro na-ekpe ekpere a na-apụghị ịgụta ọnụ, iwulite na ịgba ama gị ọtụtụ oge n’oge ụbọchị, ọtụtụ awa nke ịmụ akwụkwọ nsọ, na izute ndị na ịgaghị enwe ike izute ma ọ bụrụ na ị nọọrọ n’ebe obibi bụcha nhụmiihe ndị ọnụ na-apụghị ịkọwa. Otu ụdị ogo nhụmiihe ahụ ka edokwara maka ndị ntoroọbịa ndị nke Onyenwe anyị na-akpọ oku n’ije ozi mishọn niile. Ị bụ onye anabatara dị mkpa. Biko, ebelatala ịdị mkpa nke ije ozi mishọn, niihi na ije ozi mishọn niile nakwa eweta nhụmiihe ndị ọnụ apụghị ịkọwa. Uru nke ọtụtụ mkpụrụ obi bara dị ukwuu n’anya Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10), tinyere uru nke mkpụrụ obi gị bara.

Mgbe ị na-alọta site n’ije ozi gị, ikekwe enyi gị nwanyị ma ọ bụ enyi gị nwoke anọghịkwa na-eche gị, mana ọ ga-abụ na ịmụtara nke ọma otu esi eme mkpọtụrụ dị nkọ. Ọmụmụ ihe nke ụlọ akwụkwọ gị niile ga-aka baa uru site na nnyoba anya niile inwegoro niihe gbasara ịkwado nke ọma maka ebe a na-arụ ọrụ, ma n’ikpeazụ, ị ga-enwe eziokwu zuru oke na-ikwusawo ozi ọma nke udo na mgbam ume, na-agba ama banyere eziokwu ahụ eweghachitere.

Maka unu onwe unu ndị lụworo di na nwunye ma nọ n’ogo dị iche iche na ndụ unu, unu dị oke mkpa niime ọrụ nke Onyenwe anyị. Kwadoonụ onwe unu. Bienu ezi ndụ ahụ ike, na-achọ ndabere onwe nke ime mmụọ na nke anụ ahụ, niihi na ohere niile nke ime ihe Onyenwe anyị chọrọ imere ụmụ Ya abụghị ihe a hapụụrụ naanị otu otu ebiri. Nhụmiihe ndị kachasị enye obi ụtọ nke mụ na nwunyem nwegoro na nso nso afọ ndị a abịawo mgbe anyị n’eje ozi anyị na ndị di na nwunye pụrụ iche, na-eje ozi n’ebe ndị pụrụ iche, ma na-ejere ezi ndị pụrụ iche ozi.

Nhụmiihe m nwetere na ngwụcha nke tọpọgrafị digrii m kuziiri m na anyị na-akwado eziokwu mgbe niile mgbe anyị mara ọkwa ya ma na ịkwado eziokwu ahụ bụ ihe a na-adị mbụ eme njikere ya. Nchedo nke eziokwu bụ ihe a na-enweghị ike ime n’ụzọ dị ọkụ ọkụ kama ọ ka mma iji ezi mmasị nke ịhụnaanya, inwe mkparịta ụka, na ịkpọku ndị ahụ anyị na-agbara ama ihe banyere eziokwu ahụ, na-eche naanị maka ihe gbasara ọdịmma nke ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ụmụ Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya (lee Mozaya 2:41).

N’ọgbakọ zuru ọha nke Ọktoba 2021,Onyeisi Russell M. Nelson, onye amụmụa anyị hụrụ naanya, kụziri na na-adabaghị niihe ụfọdụ chere, e nwere nnọọ ihe anyị na-akpọ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Eziokwu kpoo bụ ezi ihe dị adị. Lee “Eziokwu Na-enweghị ntụpọ, Ozizi Na-enweghị ntụpọ, na Mkpughe Na-enweghị ntụpọ,” Liahona, Nov. 2021, 6.)

Akwụkwọ nsọ dị nsọ na-akụziri anyị na, “Eziokwu bụ ọmụma ihe nke ihe niile dị ka ha dị, na dị ka ha dịịrị, na dị ka ha ga-adị n’oge na-abịa abịa ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24).

Ọmụma ihe nke eziokwu anaghị eme anyị adị mma karịa ndị ọzọ, kama ọ na-akụziri anyị ihe anyị na-ahaghị ime iji lọghachi n’ebe Chineke nọ.

Dị ka ị na-aga a kwụsi ike niime Kraịst na mgbam ume na-abụghị naanị ịma ọkwa eziokwu ahụ kama ibi ndụ eziokwu ahụ, i ga-enweta nkasi obi na udo n’oge ọgba aghara nke ị ga-ezute niime ụbọchị ndị a.

Aka mgba ndị dị na ndụ nwere ike ịkụda anyị, kama mara na mgbe anyị tụkwasịrị okwukwe niime Jizọs Kraịst, mkpagbu “[anyị] niile ga-abụ mana nwa mgbe nta” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7) nogo atụmatụ ebighị ebi bu kpoo. Biko, ehiwekwala nkachi oge maka nsọtụ nke ihe isi ike na aka mgba gị niile. Tụkwasị obi na Nna nke Eluigwe ma adala mba, niihi na anyị daa mba, anyị enweghị ike ama otu ngwụcha njem anyị gaara adị niime alaeze Chineke.

Jidesie eziokwu ahụ ike, na-amụ ihe site na nsipụta niile nke eziokwu:

Ana m agba ama m banyere Jizọs Kraịst ma na nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Anyị nwere onye amụma dị ndụ taa, ma anyị ga-enwere onwe anyị mgbe niile mgbe anyị mara ọkwa eziokwu ahụ na mgbam ume. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen