Ọgbakọ Zuru ọha
Yikwasị Ume Gị, O Zayọn
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


13:57

Yikwasị Ume Gị, O Zayọn

Onye ọbụla nime anyị ga-atule ihe ndị dị anyị mkpa n’ụwa na nime mmụọ n’eziokwu site n’oke ekpere.

Nkọniilu niile bụ atụmatụ nkọwa nke ọmarịcha ụzọ nkuzi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Naanị na nkọwa, nkọniilu niile nke Onye Nzọpụta bụ akụkọ ndị eji tulerịta ezi okwu ime mmụọ ya na ihe nke ụwa na nhumiihe anụ ahụ niile. N’ịmaatụ, ozi ọma Agba Ọhụrụ jupụtara na nkuzi niile atụnyeere alaeze nke Eluigwe na mkpụrụ akụkụ ubi mọstadị,1 nye pel dị oke ọnụ ahịa,2 nye onye ezi na ụlọ na ndị ọrụ n’ime ubi vaịnị ya,3 nye agbọghọ iri na-amaghị nwoke,4 ma nye ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’oge akụkụ ije ozi Galilean nke Onyenwe anyị, akwụkwọ nsọ rụtụrụ aka na “na-enweghị nkọniilu o kwughịrị ha okwu.”5

Mpụtara ma ọ bụ ozi e bu nuuche nke nkọniilu ka a na-akọwaghị nke ọma. Kama, akụkọ ahụ naanị na-ebuga ezi okwu dị nsọ nye onye nnabata otu okwukwe ya n’ime Chineke ha, nkwado ime mmụọ nke onwe, na ịdị njikere ịmụ ihe. Ya mere, mmadụ aghaghị itinye n’ọrụ ezi nhọrọ ma rụsie ọrụ ike “ịjụ ajụjụ, ịchọ, na ịkụ aka”6 ịmata eziokwu niile dị n’ime nkọniilu ahụ.

Ana m ekpesi ekpere ike na Mmụọ Nsọ ga-eme ka anyị ghọta dị ka anyị na-atule ugbua mkpa nkọniilu nke oriri alụm di na nwunye nke eze.

Oriri Alụm Di na Nwunye nke Eze

“Ma Jizọs … gwara ha okwu ọzọ site na nkọniilu, ma sị,

“Alaeze Eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro alụm di na nwunye maka nwa ya nwoke,

“Ma zipụ ndị odibo ya ịkpọ ndị niile akpọrọ maka alụm di na nwunye ahụ: ma ha achọghị ịbịa.

“Ọzọ, o zigara ndị odibo ndị ọzọ, na-asị, Gwa ha ndị akpọrọ, Lee, a kwadowo m nri abalị m: ehi m na abụba m niile ka egburu, ma ihe niile ka akwadoro: bịakwute alụm di na nwunye.

“Mana enweghị ihe ha kpọrọ ya, ma gaa ụzọ ha, otu a gaa n’ubi ya, onye ọzọ a gaa ebe ọrụ ya.”7

N’oge ochie, otu n’ime oge kachasị enye ọṅụ na ndụ ndị Juu bụ mmemme alụm di na nwunye—mmemme nke ga-agbatị ruo otu izu ma ọ bụ ọbụna abụọ. Ụdị mmemme a chọrọ nnukwu atụmatụ, ma a na-agwa ndị ọbịa n’ọdịnihu dị anya, ebe e a na-ezigara ha ihe ncheta n’ụbọchi mmepe nke ememe ndị ahụ. Oku sitere n’aka onye eze ruo ndị nọ ya n’okpuru maka alụm di na nwunye ụdị dị otu a ka ewere n’ezie dị ka iwu. Otu ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị ọbịa akpọrọ nime nkọniilu a abịaghị.8

“Ọjụjụ ahụ ịbịa oriri nke eze bụ [omume] nnupụisi akpachapụrụanya mee megide … ikike nke eze na mkparị onwe megide ma onye na-achị achị ma nwa ya nwoke. … Ọpụpụ nke otu nwoke gawa n’ubi ya na onye ọzọ gawa [ebe ahịa] ya”9 na-egosipụta nduhie ihe ndị dị mkpa na enweghị nsọpụrụ kpamkpam nye uche nke onye eze.10

Nkọniilu ahụ a gaaniihu:

“Mgbe ahụ ọ gwara ụmụ odibo ya sị, e doziela oriri alụm di na nwunye a, mana ndị a kpọrọ oku ekwesịghị ekwesị.

“Ugbua, gaanụ n’akụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa oriri alụm di na nwunye a.

“Ya mere ụmụ odibo ahụ pụrụ gaa n’okporo ụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ, ma ndị ọjọọ ma ndị ọma: ma alụm di na nwunye ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.”11

Omenaala n’ụbọchi ndị ahụ bụ maka onye nnabata oriri alụm di na nwuye ahụ—nime nkọniilu nkea, onye eze ahụ—iwete uwe niile maka ndị ọbịa alụm di na nwunye ahụ. Ụdị uwe alụm di na nwunye a dịịrị mfe, uwe mwụda na-enweghị ihe e dere ya nke ndị niile bịara na-eyi. N’ụzọ a, ọkwa na ọdụ ka ewepụrụ, ma onye ọbụla bịara oriri ahụ nwere ike ịgwakọta dị ka hà nhata.12

Ndị akpọrọ oku site n’okporo ụzọ ịbịa alụm di na nwunye ahụ nwere ike ha enweghị ohere ma ọ bụ ego iji zụta uwe kwesịịrị nkwado nke mmemme ahụ. Ya mere, onye eze ahụ dị ka ọ nyere ndị ọbịa uwe sitere na uwe akwa nke onwe ya. Onye ọbụla ka e nyere ohere iyiwe onwe ha uwe dị ka eze.13

Dị ka eze ahụ na-abanye họọlụ alụm di na nwunye ahụ, o leruru ndị ọbịa anya ma ozugbo mata na otu onye ọbịa pụtara ìhè eyighị uwe alụm di na nwunye ahụ. Nwoke ahu ka a kpọtara niihu, ma eze ahụ jụrụ, “Enyi, kedụ otu i siri bata ebe a na-eyighị uwe alụm di na nwunye? Ma o kwughị okwu.”14 N’ezie, eze ahụ jụrụ, “Gịnị mere i yighị uwe alụm di na nwunye, ọbụladị na eweteere gị otu?”15

O doro anya na nwoke ahụ eyighị uwe kwesịrị ekwesị maka mmemme ahụ pụrụ iche, ma nkebiokwu ahụ “Ma o kwughị okwu” gosipụtara na nwoke ahụ enweghị ngọpụ.16

Okenye James E. Talmage wetere nkọwa nkuzi nke a banyere mkpa omume nke nwoke ahụ: “Na ọbịa ahụ na-eyighị uwe ahụ ka ikpe nleghara anya mara, enweghị nkwanye ugwu akpachapụrụ anya mee, ma ọ bụ ụfọdụ mmejọ ọzọ, doro anya n’ọnọdụ ahụ. Eze ahụ na mbụ n’amara chebaara ya echiche, na-achọ ịmata naanị otu nwoke ahụ si bata na-eyighị uwe alụm di na nwunye. A sị na ọbịa ahụ jisiri ike kọwaa ọdịdị ya pụrụiche, ma ọ bụ nwee ngọpụ bara uru inye, ọ gaara ekwu okwu n’ezie; mana a gwara anyị na ọ nọgidere na-ekwughị okwu. Ịkpọ oku nke eze ahụ ka esetipụworo n’efu nye ndị niile ndị odibo ya hụrụ; mana onye ọbụla n’ime ha aghaghị ịbanye obi eze ahụ site n’ọnụ ụzọ; ma tupu irute ime ụlọ nke oriri, n’ebe eze ahụ ga-apụta na mmadụ, onye ọbụla ga-eyi uwe kwesịrị ekwesị; mana onye nke na-eyighị, site n’ụzọ ụfọdụ abanyewo n’ụzọ ọzọ; ma na-agafeghị ndị nche nlekọta dị n’ọnụ ụzọ ahụ, ọ bụ onye ohi.”17

Onye odee christi, Jọn O. Reid, dere na ngọpụ nke nwoke ahụ iyi uwe alụm di na nwunye ahụ mara atụ “enweghị nkwanye ùgwù maka ma eze ahụ na nwa ya nwoke.” Ọ bụghị na o nweghị uwe alụm di na nwunye; kama, ọ họọrọ na ọ gaghị eyi ya. Na nnupụ isi ọ jụrụ iyi uwe kwesịrị ekwesị maka mmemme ahụ. Agwa eze ahụ kpara dịịrị ngwa ngwa ma nwee mkpebi: “Kechie ya ụkwụ na aka, ma kpọpụ ya, tụba ya n’ime ọchịchịrị nke ezi; a ga-enwe iti mkpu na ịta ikikere eze.”18

Ikpe nke eze ahụ maka nwoke ahụ abụghị nke dabeere n’elu enweghị uwe alụm di na nwunye—kama na “o kpebiri, n’ezie, na ọ gaghị eyi ya. Nwoke ahụ … chọrọ ùgwù nke ịga oriri alụm di na nwunye, mana … ọ chọghị isoro omenaala nke eze ahụ. Ọ chọrọ ime ihe niile n’ụzọ nke onwe ya. Eyighị uwe kwesịrị ekwesị gosiri nnupụ isi nke obi ya megide eze ahụ na ntụziaka ya niile.”19

Ọtụtụ Ka Akpọrọ, mana Ole na ole Ka A Họọrọ.

Nkọniilu ahụ mgbe ahụ jiri akwụkwọ nsọ nkea na-abanye abanye mechie, “N’ihi na ọtụtụ ka a kpọrọ, mana ole na ole ka a họọrọ.”20

Nke na-akpali mmasị, Josef Smith mere mgbanwe a na amaokwu nke a sitere na Matiu nime ntụgharị asụsụ ya mmụọ kpaliri nke Baịbụl: “N’ihi na ọtụtụ ka akpọrọ, mana ole na ole kaa họọrọ; ya mere onye ọbụla eyighị uwe alụm di na nwunye.”21

Ọkpụkpọ oku ahụ ịga oriri alụm di na nwunye na nhọrọ irite nime oriri ahụ bụ ihe yiri onwe ha mana ha dị iche. Ọkpụkpọ oku ahụ bụ nye ụmụ nwoke niile na ụmụ nwanyị niile. Otu onye nwekwara ike ịnabata ọkpụkpọ oku ma nọdụ n’oriri ahụ---ma agaghị a họrọ ya irite n’ihi na ya nwoke ma ọ bụ ya nwanyị enweghị uwe alụm di na nwunye dabara adaba maka ntụgharị okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs na amara Ya dị nsọ. Site otu a, anyị nwere ma oku nke Chineke ma nzaghachi anyị n’otu n’otu nye oku ahụ, ma enwere ike kpọọ ọtụtụ mana ole ma ole ka a ga-ahọrọ.22

Ị bụ ma ọ bụ ịbụrụzi onye a họọrọ abụghị ọkwa pụrụiche enyere anyị n’isi. Kama, mụ na gị kacha nke nwere ike họrọ ị bụ onye a họọrọ site na mkparam agwa ezi omume nke ezi nhọrọ anyị.

Biko hụba ama otu e si ede okwu ahụ a họọrọ n’ime amaokwu ndịa ama ama sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile:

“Lee, ọtụtụ ka akpọrọ mana ole na ole ka a họọrọ. Ma gịnị mere eji a họrọghị ha

“N’ihi obi ha nọ karịa n’ihe niile nke ụwa nke a, ma na-achọ nnukwu ugwu niile nke ụmụ mmadụ.”23

E kwere m na ihe pụtara n’amaokwu ndịa kwụ ọtọ n’ezie. Chineke nwere ndepụta aha nke ndị kachasị amasị ya nke anyị aghaghị inwe olileanya na aha anyị ka a ga-agbakwunye otu ụbọchi. Ọ naghị ebelata ndị “a họọrọ” nye ole na ole amachibidoro. Kama, obi anyị, ọchịchọ anyị, nkwanye ugwu anyị nke ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nke ozi ọma dị nsọ, nrube isi anyị nye iwu nsọ niile, ma kacha mkpa, amara mgbapụta nke Onye Nzọpụta na-ekpebi ma agụnyere anyị dị ka ndị nke Chineke a họọrọ.24

“N’ihi na anyị na-arụsi ọrụ ike idepụta, ikuziri ụmụ anyị, nakwa ụmụnne anyị, ka ha kwere na Kraịst, ma mee udo n’ebe Chineke nọ; n’ihi na anyị ma na ọ bụ site n’amara ka a ga-azọpụta anyị, mgbe anyị mesịworo ihe niile anyị nwere ike ime.”25

Nime oke ịgba mbọ kwa ụbọchị ndụ anyị na n’ime ọgba aghara nke ụwa a dị ndụ nke anyị bi n’ime ya, e nwere ike dọpụ uche anyị n’ihe ndị dị ebighị ebi dịkasịchara mkpa site na-ime ihe ụtọ, ụba, iwu ewu, na ịbụ onye a ma ama bụrụ ihe ndị kachasị dị anyị mkpa. Obere oge itinye uche anyị “n’ihe ndị nke ụwa a” na “nkwanye ugwu nke ụmụ mmadụ” nwere ike duba anyị itufu nketa ime mmụọ anyị n’ihi ihe kachasị peempe karịa nri emejasịrị emeja.26

Nkwa na Ama

Ana m ekwugharị ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nyere ndị Ya ewetere site n’aka onye amụma Agba Ochie Haggai: “Ugbu a ya mere otu a ka Onyenwe anyị nke Ụsụụ niile nke ndị agha kwuru; Tulee ụzọ gị niile.”27

Onye ọbụla n’ime anyị kwesịrị inyocha ihe anụ ahụ na ime mmụọ ndị kacha dị anyị mkpa n’ezie ma jiri nnukwu ekpere iji mata ihe ndị nọ n’ime ndụ anyị nke nwere ike igbochi ngọzi niile bara ụba Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta dị njikere idokwasị n’isi anyị. Ma n’ezie n’ezie Mmụọ Nsọ ga-enyere anyị aka ịhụta onwe anyị dị ka anyị dị n’ezie.28

Dị ka anyị na-achọ nke ọma onyinye ime mmụọ nke anya ịhụ ụzọ na ntị iji nụ ihe,29 ana m ekwe nkwa na a ga-agọzi anyị jiri ike na ikpe iji agba njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Onyenwe anyị dị ndụ ume. Anyị gakwa anata ike nke ịsọpụrụ Chineke n’ime ndụ anyị30—ma n’ikpeazụ bụrụ onye akpọrọ oku ma họrọ maka oriri nke Onyenwe anyị.

“Teta, teta; yịkwasị ume gị, O Zayọn.”31

“N’ihi na Zayọn aghaghị ịmụba n’ịma mma, ma n’ịdị nsọ; oke ala ya niile aghaghị ibuwanye ibu; stek ya niile aghaghị inwe mgbam ume; ee, n’ezie a sị m unu, Zayọn aghaghị iteta ma yiri uwe mwụda ya niile mara mma.”32

E ji m ọṅụ na-ama ọkwa akaebe m nke isi na chi na ịdị ndụ n’ezie nke Chineke, Nna anyị nke Ebighị ebi, na maka Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, Jizọs Kraịst. Ana m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, ma na Ọ na-adị ndụ. Ma ana m agbakwa akaebe na Nna na Ọkpara ahụ pụtakwutere nwantakịrị nwoke Josef Smith, site otu ahụ bido Mweghachite nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta n’ụbọchị ikpeazụ a. Ka onye ọbụla n’ime anyị chọọ ma nwete ngọzi nke anya iji hụ ụzọ na ntị iji nụ ihe, ka m na-ekpe n’aha nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.