N’Obi dum
Anyị kwesịrị ịbụ ndị na-eso Jizọs ndị jupụtara n’ọńụ ma jiri obi dum na nje nke onwe anyị nke ịbụ ndị na-eso ụzọ.
Mgbe ụfọdụ, ọ na-enye aka ịma ihe a na-atụ anya ya.
Nso na njedebe ije ozi Ya, Jizọs gwara Ndị Ozi Ya na oge ndị siri ike ga-abịa. Mana Ọ sịkwara, “Lezie anya na unu enweghị nsogbu.”1 Ee, Ọ ga-apụ, mana Ọ gaghị ahapụ naanị ha ịnọ.2 Ọ ga-eziga Mmụọ Ya inyere ha aka cheta, guzosie ike, ma chọta udo. Onye Nzọpụta na-emejupụta nkwa Ya ịnọnyere anyị, ndị na-eso ụzọ Ya, mana anyị ga-agarịrị niihu ile Ya inyere anyị aka mata ma ńụrịa n’ihu Ya.
Ndị na-eso ụzọ nke Kraịst na-ezute mgbe niile oge ndị siri ike.
Otu ezigbo enyi nke m ziteere m otu ederede ochie sitere na Nebraska Advertiser, akwụkwọ akụkọ ụwa nke Etiti Ọdịda anyanwụ United States, ụbọchị Julaị 9, 1857. Ọ gụrụ: “N’isi ụtụtụ a otu igwe ndị Mọmọn sitere n’ebe a gafee na njem ha ịga Salt Lake. Ndị inyom (na-adịchaghị ańaa) na-akpụ ụgbọ ala aka dị ka nnukwu anụ ọhịa, otu [onye inyom] dara n’ala n’ime apịtị ojii nke a nke mere e jiri kwụsitụ njem ahụ, obere ụmụ ntakịrị naara aga n’ihu n’uwe mba ofesi ha [dị mgbagwojuanya] na-enwe mkpebisiike dị ka ndị nne ha.”3
E chewo m ezigbo echiche banyere nwanyị a apịtị juru n’aha. Gịnị mere o ji na-akpụ naanị ya? Ọ bụ nne naanị ya? Gịnị nyere ya ume, obi, na ntachi obi ime ụdị nnukwu njem a site na apịtị, na-adọ arịa ya niile n’ụgbọala aka gaa n’ebe obibi dị na ọzara ana amaghị—oge ụfọdụ bụrụ onye akwara emo site naka ndị na-ekiri anya?4
Onyeisi Josef F. Smith kwuru maka ume dị niime nke ndịinyom mbute ụzọ, na-asị: “I nwere ike ibugharị echiche otu n’ime ndịinyom ndị a pụọ site na mkpebi ha n’ime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a? I nwere ike gbajie uche ha n’ihe gbasara ozi nke Onye amụma Josef Smith? I nwere ike kpuchie anya n’ihe nke ozi dị nsọ nke Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke? Mba, enweghị n’ụwa ka i nwere ike ime ya. Gịnị mere? N’ihi na ha maara ya. Chineke kpugheere ya ha, ma ha ghọtara ya, ma ọdịghị ike n’elu ụwa nwere ike ibugharị echiche ha pụọ site n’ihe ha maara ịbụ eziokwu ahụ.”5
Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ịbụ ụdị ndịikom na ndịinyom dị otu a bụ oku nke ụbọchị anyị—ndị na-eso ụzọ na-elezi anya nke ọma ịchọta ume iji gaaniihu na-adọkpụ mgbe a kpọrọ oku ịga ije site n’alaịkpa, ndị na-eso ụzọ nwere mkpebi nke ekpughewooro anyị site n’aka Chineke, ndị nsiso Jizọs jupụtara n’ọńụ ma n’eji obi ha niile na njem nke onwe ịbụ onye na-eso ụzọ. Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, anyị kwere ma nwere ike ito eto n’eziokwu atọ dị mkpa.
Nke mbụ, Anyị Nwere ike Debe Ọgbụgba ndụ Anyị, Ọbụna Mgbe Ọ Na-adịghị Mfe.
Mgbe okwukwe gị, ezi na ụlọ gị, ma ọ bụ ọdịniihu gị nwere aka mgba—mgbe ọ na-eju gị anya ihe kpatara ndụ si sie nnukwu ike mgbe ị na-eme ike gị kachasị ibi ndụ ozi ọma—cheta na Onyenwe anyị gwara anyị ịtụ anya nsogbu niile. Nsogbu niile bụ akụkụ atụmatụ ahụ ma ọ pụtaghị na a gbahapụwo gị; ha bụ akụkụ ihe ọ pụtara ị bụ nke Ya.6 Ọ bụ, ma emesịa, “nwoke nke mwute niile, ma ọ maara iru uju.”7
Ana m amụta na Nna nke Eluigwe nwere mmasị n’uto m dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst karịa O nwere na nkasị obi m. O nwere ike a gaghị m achọ ka ọ dị otu ahụ—mana ọ dị!
Ibi ndụ nwere ihe niile anaghị ewete ike. Ike anyị chọrọ iji nagide mkpom ọkụ nke ụbọchị anyị bụ ike nke Onyenwe anyị ma ike Ya na-asọpụta site na ọgbụgba ndụ anyị na Ya.8 Ịdabere niime jiri okwukwe anyị mgbe anyị na-agabiga ikuku isi siri ike—ịgbalịsi ike n’eziokwu ụbọchị ọbụla iji mee ihe anyị gbara ndụ ime anyị na Onye Nzọpụta anyị ga eme, ọbụna ma karịsịa mgbe ike gwụrụ anyị, na-echegbu onwe ya, ma na-agba mgba jiri ajụjụ na okwu ndị na-enye nsogbu—bụ ị ji nwayọ nata ìhè Ya, ume Ya, ịhụnaanya Ya, Mmụọ Ya, udo Ya.
Isi ihe nke ịga ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ịgarute Onye Nzọpụta nso. Ya nwa bụ isi ihe ahụ, ọbụghị ọganiihu anyị zuru oke. Ọ bụghị ọsọ, ma anyị agaghị ma ọlị atụnyere njem anyị nye ndị ọzọ’. Ọbụna mgbe anyị na-akpọbi ụkwụ, Ọ nọ n’ebe ahụ.
Nke abụọ, Anyị Nwere ike Mee ihe N’Okwukwe.
Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, anyị ghọtara na okwukwe n’ime Ya na-achọ ihe omume—kacha nke noge ihe isi ike ndị a.9
Ọtụtụ afọ gara aga, ndị nne na nna kpebiri imegharị kapeetị ụlọ. Abalị tupu kapeetị ọhụrụ ahụ abịaruo, nne m rịọrọ ụmụnne m nwoke ka ha wepụ oche ma dọkaa kapeetị dị n’ime ụlọ ka e nwee ike tinye kapeetị ohụrụ. Mgbe ahụ nwanne m nwanyị gbara afọ asaa, Emily, nọọrọ na ehi ụra. Ya mere, mgbe ọ nọ n’ụra, ha na-emeghị mkpọtụ jiiri nwayọ wepụ oche site n’ime ụlọ ya, ewezuga akwa ahụ, ma mesịa dọkapụ kapeetị ahụ. N’ezie, dị ka ụmụnne nwoke kacha mee okenye mgbe ụfọdụ na-eme, ha kpebiri igwuri egwu. Ha wepụrụ ihe ya ndị fọdụrụ site na kaboodu ya site na kaboodu ma pụọ mgbidi, hapụ ime ụlọ ahụ enweghị ihe nọ na ya. Emesịa ha dere ihe nakwụkwọ ma tapagide ya nelu mgbidi: “Ezi Emily, anyị kwapụrụ. Anyị ga-edere gị n’ụbọchị ole ma ole ma gwa gị ebe anyị nọ. Ịhụnaanya, ezi na ụlọ gị.”
Ụtụtụ echi ya mgbe Emily apụtaghị maka nri ụtụtụ, ụmụnne m nwoke a gaa ịchọ ya—ebe ahụ ka ọ nọ, na mwute ma nọrọ naanị ya n’azụ ọnụ ụzọ mechiri emechi. Emily tụgharịa uche na nhumiihe nke a: “Obi gbawara m. Mana gịnị gaara eme ma a sị na m meghere nnọọ ọnụ ụzọ ahụ? Gịnị ka m gaara anụ? Gịnị ka m gaara anụ isi ya? A gaara m a mata na m anọghị naanị m. A gaara m a mata na a hụrụ m naanya. Echiche ahụ enweghị mgbe ọ bịara m n’uche ime ihe banyere ọnọdụ m. A kwụsịrị m ma nọrọ nebe kabọọdụ m na-ebe akwa. Ma ọtụ ọ dị ọ bụrụ na m meghere nnọọ ọnụ ụzọ ahụ.”10
Nwanne m nwanyị mere mwere n’elu ihe nke ọ hụrụ, mana ọ bụghị nchezi ụzọ ihe niile dịịrị n’ezie. Ọ bụ na ọ dịghị mmasị na anyị, dị ka Emily, nwere ike nwee obi nkụda na mwute ma ọ bụ mmekụta ma ọ bụ ịda mba ma ọ bụ nchegbu ma ọ bụ owu ọmụma ma ọ bụ iwe ma ọ bụ obi nkoropụ na ọ naghị emetụ anyị ime nnọọ ihe, imepe ọnụ ụzọ ahụ, ime ihe nokwukwe nime Jizọs Kraịst.
Akwụkwọ nsọ jupụtara n’ọmụmaatụ nke ndịikom na ndịinyom, ndị na-eso ụzọ Kraịst, ndị, mgbe ha na-ezute ekweghị omume ahụ, naanị mere ihe—onye biliri n’okwukwe ma gaa ije.11
Nye ndị ekpenta chọrọ ọgwụgwọ, Kraịst kwuru: “Gaa gosi onwe gị nye ndị nchụaja. Ma o wee ruo, na, dị ka ha gara, ha nwetere nsachapụ.”12
Ha gara igosi onwe ha nye ndị nchụaja dị ka na ha enweteworịị ọgwụgwọ, ma n’usoro nke omume ihe, ha nwetere.
A chọkwara m ikwu ma ọ bụrụ ma echiche nke ime ihe n’etiti ihe mgbu gị dị ka o kweghị omume, biko kwe ka omume gị bụrụ iji nweta enyemaka—nye otu enyi, onye otu ezi na ụlọ, onye ndu Nzukọ nsọ, otu ọkachamara. Nke a nwere ike bụrụ nzọụkwụ nke mbụ inwe olileanya.
Nke atọ, Anyị Nwere ike Iji Obi Anyị Dum ma Jupụta N’Ọńụ n’ime Nraranye Anyị13
Mgbe oge siri ike bịara, ana m anwa icheta na m họọrọ isoro Kraịst tupu mụ a bịa n’ụwa ma na ihe ịma aka nye okwukwe m, ahụ isiike m, na nnagide m ha niile bụ akụkụ ebumnuuche m si nọrọ ebe a. Ma mụ n’ezie ekwesịghị iche na mnwale nke taa na-etinye ajụjụ n’ịhụnaanya nke Chineke maka m ma ọ bụ kwe ya ịtụgharị okwukwe n’ime Ya baa obi abụọ. Mnwale niile apụtaghị na atụmatụ ya na-ada ada; ha bụ akụkụ atụmatụ kwesịrị inyere m aka chọta Chineke. A bịara m dịrịzie ka Ya karịa mgbe m nagidere na ndidi, ma n’olileanya, dị ka Ya, mgbe n’ihe mgbu, ana m ekpesi ekpere ike karịa.14
Jizọs Kraịst bụ ọmụmaatụ ahụ zuru oke nke ịhụ Chineke naanya n’obi Ya niile—nke ime uche Ya, na-agbanyeghị ihe ọ pụtara.15 A chọrọ m iso ọmụmaatụ Ya site na-ime otu ahụ kwa.
Mmụọ kpalitere m site na ịbụ onye na-eso ụzọ nke nwanyị isimkpe ji obi ya dum, mkpụrụ obi ya dum onye tụbara àjà ya abụọ n’ime ụlọ akụ tempụl. O nyere ihe niile o nwere.16
Jizọs Kraịst matara uju niile nke ya ebe ndị ọzọ hụrụ naanị ihe ọ na-enweghị. Nke a bụkwa eziokwu maka onye ọbụla n’ime anyị. Ọ naghị ahụta ihe anyị na-enweghị dị ka ịda ada ma kama dị ka ohere inwe okwukwe na ito eto.
Mmechi
Ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ibem, n’obi m niile, a họọrọ m iguzogidere Onyenwe anyị. A họọrọ m iguzoro mụ na ndị odibo Ya a họpụtara—Onyeisi Russell M. Nelson na Ndị Ozi ibe ya—n’ihi na ha na-ekwutere Ya ma ha bụ ndị na-ahụ maka emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke kegidere m na Onye Nzọpụta.
Mgbe m sụrụ ngọngọ, aga m na-ebilite elu, na-adabere n’amara na ike nke Jizọs Kraịst na-enye ike. Aga m anọ n’ime ọgbụgba ndụ m na Ya ma zatazie ajụjụ m niile site na ọmụmụ ihe nke okwu Chineke, site n’okwukwe, na n’enyemaka nke Mmụọ Nsọ, onye m tụkwasịrị obi n’odudu ya. Aga m achọ Mmụọ Ya ụbọchị niile site na ime ụmụ ihe obere dị mfe.
Nke a bụ ụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ.
Ma tutu ruo ụbọchị agwọrọ ọnya nille kwa ụbọchị nke ndụ anụ ahụ, aga m echere Onyenwe anyị ma tụkwasị obi na Ya—oge Ya, amamiihe Ya, atụmatụ Ya.17
Aka na aka gị na ya, a chọrọ m isoro Ya guzoro ruo mgbe ebighị ebi. N’Obi dum. Ịmata na mgbe anyị hụrụ Jizọs Kraịst naanya jiri obi anyị niile, Ọ na-enye anyị niile n’aka.18 N’aha nke Jizọs Kraịst, amen