“Jun 23–29: ‘Uru … Akụ na ụba nke Ụwa Dum’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67–70,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67–70,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jun 23– 29: “Uru … Akụ na ụba nke Ụwa Dum”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67–70
Site na 1828 ruo 1831, Onye Amụma Josef Smith natara ọtụtụ mkpughe sitere n’aka Onyenwe anyị, gụnyekọta ndụmọdụ sinachi maka ndị mmadụ, ntuziaka niile maka ịchị Nzukọ nsọ, ọhụ niile nke ụbọchi ikpeazụ ndị a, na ọtụtụ eziokwu dị ebighị ebi na-akpatemmụọ. Mana ọtụtụ Ndị nsọ agụbeghị ha. Akabeghị ebipụta mkpughe ndị ahụ, ma kọpị ole ma ole dị adị bụ nke eji aka dee na mpempe akwụkwọ gbara otu otu nke ekesasịrị n’etiti ndị otu ma ndị mgbasa ozi ọma bugharịa ya gburugburu.
Emesịa, na Nọvemba 1831, Josef akpọọ kansụl nke ndị ndụ Nzukọ nsọ ịkparịta ụka ibipụta mkpughe niile ahụ. Mgbe ha chọsịrị uche nke Onyenwe anyị, ndị ndu ndị a tụrụ atụmatụ iji bipụta Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile—ihe mbute ụzọ nye Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nke taa. Mgbe na-eteghị anya onye ọbụla ga-enwe ike ịgụ nye onwe ha okwu nke Chineke ekpughere site n’aka onye amụma dị ndụ, ihe aka ebe doro anya na “ọtụghe niile nke ihe omimi niile nke alaeze nke Onye Nzọpụta anyị ka enyefekwara n’aka mmadụ ọzọ.” Maka ndị a na ọtụtụ ebumnuche ndị ọzọ, Ndị nsọ mgbe ahụ na ugbu a weere mkpughe ndị a ịbụ “uru … akụ na ụba nke Ụwa dum” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 70, isi nkeji).
Lee Ndị Nsọ, 1:140–43.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67:1–9; 68:3–6
Ụmụ odibo nke Onyenwe anyị na-ekwu uche Ya mgbe Mmụọ Nsọ kwalitere ha.
Mkpebi nke ibipụta mkpughe niile anatara site n’aka Josef Smith dịịrị ka ihe dị mfe, mana ụfọdụ ndị ndu isimbụ Nzukọ nsọ ejighị n’aka na ọ bụ nchepụta dị mma. Otu nchegbu bịara gbasara ezughị okè ndị nọ n’ụzọ Josef Smith si dee mkpughe niile ahụ. Mkpughe dị niime nkeji 67 bịara na nzaghachi nye nchegbu ahụ. Kedụ ihe ị na-amụ banyere onye amụma nke Onyenwe anyị na mkpughe sitere na amaokwu 1-9? Kedụ nghọta ndị agbakwunyere i na-enwete site na 68:3–6?
Kedụ otu i siworo bịa mata n’onwe gị na mkpughe niile Chineke nyere ụmụ odibo Ya bụ eziokwu? I nwekwara ike tụgharịa uche na nhụmiihe niile mgbe ọ dịịrị gị ka Onyenwe anyị na-agwa gị okwu site n’ọnụ otu niime ụmụ odibo Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:4). Kedụ mgbe ọ dịworo gị ka “Mmụọ Nsọ kwalitere” (amaokwu 3) gị ikwu ihe? Kedụ otu Onyenwe anyị si “guzoro n’akụkụ gị”? (amaokwu 6).
Tupu ebipụta Akwụkwọ nke Iwu nsọ niile, ọtụtụ ndị ndu Nzukọ nsọ bịanyere aka na ama edere ede na mkpughe niile dị niime akwụkwọ ahụ bụ eziokwu. Ịhụta kọpị nke ama ha, lee “Testimony, circa 2 November 1831,” Akwụkwọ Mkpughe 1, 121, josephsmithpapers.org.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67:10–14
“Na-aganiihu na ndidi.”
Kedụ otu ekworo, ịtụ egwu, na mpako na-esi egbochi anyị site na-ịgaru Onyenwe anyị nso? Kedụ otu anyị si emeri “mmadụ eke” ma ọ bụ “uche anụ ahụ” ka anyị wee nwee ike “hụ [Ya] ma mara na Ọ dị]”? (amaokwu 12; lee kwa Mozaya 3:19). Kedụ ihe ị na-achọta niime amaokwu ndị a na-akpatemmụọ gị “ịganiihu na ndidi tutu ruo mgbe unu tozuru oke”? (amaokwu 13).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–31
E nwere m ike inye aka hikwasị ebe obibi m n’elu Jizọs Kraịst.
Okwu niile nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–31 rụtụrụ aka kpọmkwem na ndị nne na nna, mana ma ọ bụ na ị bụ onye nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ na ịbụghị, i nwere ike iji ndụmọdụ Ya ji rụọ ọrụ gị iji hikwasị ebe obibi gị n’elu ozizi nke Jizọs Kraịst. N’okpuru ka edepụtara ụfọdụ ụkpụrụ ndị nke Onyenwe anyị kwuru kwesịrị ka akuzie n’ebe obibi. Tulee otu i nwere ike i si mee nke ọbụla niime ndị a akụkụ ntọala nke ebe obibi dabeere na Kraịst—ebe obibi i bi ugbu a ma ọ bụ ebe obibi gị nọdịniihu. Akụrụngwa niile na ajụjụ niile ewetere nwere ike inye aka.
-
Nchegharị: Mụọ Alma 36:17–20, ma mata otu esi gọzie Alma n’oge dị egwu niihi na nna ya akuziworo ya banyere ozi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Kedụ otu i nwere ike i si nye aka kpaliemmụọ ezi na ụlọ gị ichigharị n’ebe Jizọs Kraịst nọ ma chegharịa? (Lee kwa 2 Nifaị 25:26).
-
Okwukwe niime Kraịst: Gụọ ntụpụta ero ise nke Onyeisi Russell M. Nelson maka iwulite okwukwe niime “Kraịst Ebiliwo; Okwukwe na Ya Ga-ebupụ Ugwu ukwu niile” (Liahona, Me 2021, 103). Tụgharịa uche otu ntụpụta ero ndị a nwere ike emepụta omenaala nke okwukwe niime ezi na ụlọ gị.
-
Baptizim: Nyochagharịa ọgbụgba ndụ nke baptizim dị ka akọwara niime Mozaya 18:8–10, 13. Kedụ otu mgbalị unu n’idebe ọgbụgba ndụ nke a si agba ezi na ụlọ gị ume?
-
Onyinye nke Mmụọ Nsọ: Mụọ ikpọ oku niile na ihu akwụkwọ 17–19 nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile. Kedụ ihe na-akpalimmụọ gị ime iji kpọbata mmetụta nke Mmụọ Nsọ niime ebe obibi gị?
-
Ekpere: Kedụ ihe ị na-amụ banyere ike nke ekpere niime ebe obibi dị niime “A Na-ekwu maka Ịhụnaanya Ebe a”? (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 190– 190). Kedụ ngọzi ndị nke Onye Nzọpụta na-ekwe nkwa ha niime 3 Nifaị 18:15–21?
-
Ụkpụrụ ndị ọzọ ị na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–31:
Kedụ ndụmọdụ ị ga-enye onye nke ndị otu ezi na ụlọ ya na-anaghị akwado mgbalị ha na-iwulite okwukwe niime Kraịst?
Lee kwa “Ezi na ụlọ: Ọkwa A Mara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịzụ Ụmụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Dieter F. Uchtdorf, “Jizọs Kraịst Bụ Ume Ndị nne na nna,” Liahona, Me 2023, 55–59.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 69:1
Ndị enyi “ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi” na-enyere m aka soro Jizọs Kraịst.
Gịnị mere iji chee na ọ bụ “amamiihe niime [Onyenwe anyị]” maka onye “ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi” isoro Oliver Cowdery n’ọrụ enyere akọwara niime amaokwu nke a? Kedụ otu ụkpụrụ nke a si tụnyere gị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 70:1–4
Ọ dị m n’aka inye nkọwapụta maka mkpughe niile Onyenwe anyị nyeworo.
Onyenwe anyị nyere ụfọdụ ndị okenye oke na ọrụ ịhụ maka mbipụta nke mkpughe niile. Ọbụna na-agbanyeghị na i nweghị oke na ọrụ akpọrọ aha, gịnị bụ nlekọta ma ọ bụ oke na ọrụ gị “banyere mkpughe niile na iwu nsọ niile ahụ”? (amaokwu 3).
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile na-akuziri m banyere Jizọs Kraịst.
-
Gwa ụmụ gị banyere otu esi bipụta mkpughe nke Josef Smith niime otu akwụkwọ (lee “Isi nke 23: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile,” dị niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 90–92, ma ọ bụ vidiyo dakọtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Nyere ha aka cheta ụfọdụ niime ihe ndị ị mụtaworo banyere Jizọs Kraịst sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile kemgbe afọ nke a. I nwekwara ike kesaara ibe unu ụfọdụ amaokwu ndị kachasị masị gị sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile.
-
I nwekwara ike gosi ụmụ gị Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, na Pel nke Oke Ọnụ ahịa ma kwuo okwu gị na ha banyere otu ha si dị iche na otu ha si yie onwe ha (lee nkọwa niile nke akwụkwọ ndị a niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ). Kedụ otu anyị nwere ike i si mara na akwụkwọ nsọ bụ eziokwu? Kedụ ihe anyị na-amụ site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 67:4, 9 banyere mkpughe niile Onyenwe anyị nyere Josef Smith?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:25–31
E nwere ike ime m baptizim mgbe m gbara afọ asatọ.
-
Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ 68:27, Onyenwe anyị kwuru kpọmkwem afọ ole mmadụ ga-agbarịrị iji mee baptizim. Nyere ụmụ gị aka chọpụta ihe O kwuru. Gịnị mere Jizọs si na-achọ ka anyị mee baptizim? Otu egwu dị ka “Baptizim” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 100–101) nwere ike inye aka. Ijiri foto niile ma ọ bụ amaokwu 25–31 (ma ọ bụ ha abụọ), na-enyere ụmụ gị aka chọpụta ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ụmụntakịrị ịmụta.
-
Gụọ gị na ụmụ gị banyere ọrụ Onyenwe anyị nyere Oliver Cowdery dị niime isi nkeji maka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 69. Kedụ ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nyere niime amaokwu 1? Gịnị mere o ji dị mkpa ịnọrọ gị na “ndị ga-ezi ezi ma kwesị ntụkwasị obi”? Ikekwe ụmụ gị nwere ike kọọ banyere onye ha maara “ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi.” Gụkọtanụ ọnụ otu egwu nke na-agba ụmụntakịrị ume izi ezi ma kwesị ntụkwasị obi dị ka Onye Nzọpụta, ụdị dị ka “Ana m Anwa Ịdị ka Jizọs” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 78–79). Kedụ otu anyị nwere ike i si hụ na anyị ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị? Kedụ otu O nwere ike i si jiri anyị gọzie ndị ọzọ mgbe anyị ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi?