“Jun 30– Julaị 6: ‘Ọ dịghị Ngwa ọgụ ọbụla Nke a Kpụrụ imegide Gị Ga-eme nke ọma’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71–75,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71–75,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jun 30–Julaị 6: “Ọ dịghị Ngwa ọgụ ọbụla Nke a Kpụrụ imegide Gị Ga-eme nke ọma”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71–75
Kemgbe ọ bụ nwata nwoke, Josef Smith gabigara ndị nkatọ—ọbụna ndị iro—dị ka ọ nwara ịrụ ọrụ nke Chineke. Mana ọ kachasịrịrị sie ike na ngwụcha 1831 mgbe Ezra Booth malitere ikwutọ Nzukọ nsọ n’ọha, niihi n’ihe nke a onye nkwutọ ahụ bụ onye kwebuuru ekwe. Ezra ahụwo ka Josef jiri ike Chineke iji gwọọ otu nwanyị. A kpọkuwo ya isoro Josef na sọfịa mbụ nke ala Zayọn dị na Missouri. Mana okwukwe ya efunarịwo ya kemgbe ma, na mgbalị iji mebie aha Onye Amụma, o bipụtara akwụkwọ ozi dị iche iche na akwụkwọ akụkọ Ohio. Ma mgbalị ya dịịrị ka ọ na-arụ ọrụ, niihi na “mmetụta iro niile … epupụtawo megide Nzukọ nsọ” niime mpaghara ahụ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71, isi nkeji). Gịnị ka ndị kwere ekwe kwesịrị ime n’ihe dị ka nke ahụ? Ebe enweghị otu azịza ziri ezi maka ọnọdụ niile, ọ dịịrị ka mgbe na mgbe—gụnyekọta n’okwu nke a na 1831—akụkụ azịza nke Onyenwe anyị bụ ịma ọkwa eziokwu ma mezie ụgha niile site “n’ịma ọkwa ozi ọma [ahụ]” (amaokwu 1). Ee, ọrụ nke Onyenwe anyị ga na-enwekarị ndị nkatọ, mana na ngwụcha, “ọ dịghị ngwa ọgụ ọbụla a kpụrụ imegide [ya] ga-eme nke ọma” (amaokwu 9).
Lee “Ezra Booth na Isaac Morley,” niime Mkpughe niile dị na Ọnọdụ, 134.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Mmụọ ahụ ga-edu m dị ka m na-ama ọkwa ozi ọma nke Onye Nzọpụta.
O nwere ike nyee nsogbu mgbe ndị mmadụ na-akatọ ma ọ bụ kwaa okwukwe gị niime Onye Nzọpụta, ozi ọma Ya, ma ọ bụ Nzukọ nsọ Ya emu. Mgbe nke ahụ mere, kedụ ihe ị ga-eme? Ihe yiri nke a mere niime Ohio na 1831 (lee isi nkeji na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71). Gịnị ka Onyenwe anyị gwara Josef Smith na Sidney Rigdon ime banyere ya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71? Ikekwe i nwere ike depụta ntuziaka niile Onyenwe anyị nyere ha na ngọzi niile O kwere na nkwa.
Na mgbakwunye ịmụ nkeji 71, i nwekwara ike nyochagharịa otu Onye Nzọpụta si zaghachi ndị nkatọ Ya n’oge ije ozi na ndụ anụ ahụ Ya. Ebe a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ: Matiu 22:15–22; 26:59–64; Jọn 10:37–38. Kedụ ihe ị na-amụta site na Ya? Kedụ nghọta ndị agbakwunyere i na-enwete site na Matiu 18:15; Ndị Efesọs 4:31–32; 2 Timoti 3:12; Jemis 1:19?
Kedụ otu ndụmọdụ Ya ga-esi emetụta ọnọdụ ndị i na-ezute taa? I nwere ike tulee ụzọ niile eji emezi okwu asị niile n’ụzọ udo n’okwu nke onwe gị. N’ịmaatụ, i nwere ike malite site na-igosipụta nkwanye ùgwù maka echiche niile nke onye nke ọzọ, ma emesịa i nwere ike kesaa n’ụzọ dị umeala na n’obi ọma ihe i kwenyere banyere Jizọs Kraịst na nkuzi Ya niile. Ịkwado maka oge ndị a, ikekwe i nwere ike mụọ ụzọ nke a gị na ndị enyi ma ọ bụ ndị otu ezi na ụlọ.
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Inyere Ndị Ọzọ nwere Ajụjụ aka,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Dallin H. Oaks, “Ịhụ Ndị Ọzọ naanya na Ibi na Ndịiche niile,” Liahona, Nov. 2014, 25–28; Jörg Klebingat, “Ịbụ Ndị na-eso ụzọ Dị ike ọrụ n’Ụbọchi Ikpeazụ ndị a,” Liahona, Me 2022, 107–10.
Onyenwe anyị na-agọzi m site na-ije ozi nke ndị ndu dị ka ndị bishọp.
Mgbe akpọrọ Newel K. Whitney ije ozi dị ka onye bishọp, ọrụ ya niile dịịrị iche ntakịrị site na nke ndị bishọp ụbọchi taa. N’ịmaatụ, Bishọp Whitney lekọtara nnyefechasị nke arịa na inye ikike ibi n’ala nke Zayọn niime Missouri. Mana dị ka ị na-agụ banyere ọkpụkpọ oku ya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 72, i nwere ike mata ụfọdụ njikọ nye ihe ndị bishọp na-eme taa—ọbụrụgọdi niime mmụọ, ọbụghị ma ndị a kpọrọ aha, banyere ọrụ ha.
N’ịmaatụ, otu ole ka i si “enye nkọwapụta” n’aka bishọp gị? (amaokwu 5). N’ụbọchi anyị taa, “ụlọ nkwakọba ihe nke Onyenwe anyị” nwere ike gụnyekọta ụtụ niile, ije ozi, na onyinye niile si na chi nke ndị otu ngalaba ukwu (lee amaokwu 10, 12). Kedụ otu i nwere ike i si tụnye ụtụ na ụlọ nkwakọba ihe ahụ?
Olee otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị na ezi na ụlọ gị site na-ije ozi nke onye bishọp?
Lee kwa Quentin L. Cook, “Ndị Bishọp—Ndị Ọzụzụ atụrụ n’elekọta Igwe anụmamụ nke Onyenwe anyị,” Liahona, Me 2021, 56–60.
E nwere m ọtụtụ ohere ikesa ozi ọma nke Onye Nzọpụta.
Mgbe Josef Smith na Sidney Rigdon lọghachiri site n’ọrụ mgbasa ozi ọma (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71), Onyenwe anyị gwara ha ịganiihu na ntụgharị asụsụ nke Baịbụlụ ha (lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ntụgharị asụsụ nke Josef Smith (JST),” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Mana nke ahụ apụtaghị na Ọ chọrọ ka ha kwụsị ikesa ozi ọma. Otu ọbụla o si dị, ọ bụ akụkụ ndụ nke onye na-eso ụzọ.
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 73, tulee otu i nwere ike iji mee nkesa ozi ọma ihe na-aganiihu, “kwere ime eme” (amaokwu 4)—ma ọ bụ ihe ezi uche dị na ya—akụkụ nke ndụ gị n’etiti ọrụ gị ndị ọzọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 75:1–16
“Jiri ike gị rụọ ọrụ … na-ama ọkwa eziokwu.”
Mkpughe dị niime nkeji 75 ka enyere maka ndị “nyeworo aha [ha] ịga ịma ọkwa ozi ọma [nke Onye Nzọpụta]” (amaokwu 2). Otu ụzọ esi amụ mkpughe nke a bụ idepụta ihe ụzọ abụọ: (1) otu esi ekesa ozi ọma n’ụzọ dị nkọ na (2) otu Onyenwe anyị na-esi agọzi ma kwadoo anyị dị ka anyị na-eme ya.
Kedụ ihe i chere ọ pụtara “ịnọtụ ogologo oge” ma ọ bụ “ịnọdụ nkịtị” na-ikesa ozi ọma? Kedụ ihe o yiri ka ya “iji ike gị arụ ọrụ”? (amaokwu 3).
Lee kwa “Aga M Aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa,” Abụ niile, no. 270.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
E nwere m ike igbachitere eziokwu site na-ikesa ama m.
-
I nwere ike iji isi nkeji maka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 71 ma ọ bụ “Isi nke 25: Josef Smith na Sidney Rigdon A Gaa Mishọn” (niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 96, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma) iji kuziere ụmụ gị banyere ọnọdụ niile nke kpalirimmụọ nkeji 71. Mgbe ahụ nyere ha aka chọpụta niime amaokwu 1 ihe Onyenwe anyị chọbuuru Josef na Sidney ime banyere “mmetụta iro niile” n’ebe Nzukọ nsọ nọ. Kedụ otu O siri kwuo Ọ ga-eji nyere ha aka? Kedụ otu anyị nwere ike i si dị ka Josef na Sidney?
-
I nwekwara ike kwe otu ukwe na-akpalimmụọ ụmụ gị izi ezi nye Onye Nzọpụta, ụdị dị ka “Nọrọ maka nke ahụ Ziri ezi” (Akwụkwọ egwu nke Ụmụntakịrị, 159) Nyere ụmụ gị aka mụọ otu esi ekesa ihe ha maara banyere Jizọs Kraịst.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 72:2
Onyenwe anyị akpọwo onye bishọp inyere m aka.
-
Ịgụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 72:2 ọnụ nwere ike kewapụta ohere iji kparịta nkata ihe mere Onyenwe anyị si enye anyị ndị bishọp (lee kwa “Isi nke 17: Ndị Bishọp Mbụ nke Nzukọ nsọ,” niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 64–66, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Gị na ụmụ gị nwere ike chọta foto niile ma ọ bụ ụmụ ihe na-anọchite oke na ọrụ niile nke onye bishọp. Foto ahụ na ihu akwụkwọ ihe omume dị na ngwụcha ndepụta nke ihe a edepụtara na-ewete ụfọdụ nchepụta. Emesịa i nwere ike kwuo okwu gị na ụmụ gị banyere ndị bishọp i maararịị na otu Onyenwe anyị siworo gọzie ezi na ụlọ gị site na ije ozi ha.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 75:3
E nwere ike inye Onyenwe anyị mgbalị m kacha ibe ya.
-
Ikwu okwu banyere ndịiche dị n’etiti ịnọ “nkịtị” na “iji ume [anyị] [na-arụ] orụ,” ikekwe i nwere ike họrọ ụfọdụ omume niile nke ije ozi ma ọ bụ ọrụ ime ụlọ ma kpọkuo ụmụ gị igosipụta ime ha n’ume ngwụ na ijizi ume ha niile. Dị ka ị na-agụ “ọ bụghị ma ịnọ nkịtị” niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 75:3, ụmụ gị nwere ike gosi otu ha ga-esi arụ ọrụ ụlọ niile n’ume ngwụ. Mgbe ị na-agụ “mana jiri ike gị rụọ ọrụ,” ha nwere ike gosi otu ha ga-esi arụsị ọrụ ike. Gịnị mere o ji dị mkpa na anyị ga-eme ole kacha mma mgbe anyị na-ejere Onyenwe anyị ozi?
-
Niime ozi ya “Ụkpụrụ Abụọ maka Akụ na ụba Ọbụla” (Liahona, Nov. 2009, 55–58), Onyeisi Dieter F. Uchtdorf kọrọ akụkọ abụọ banyere ọrụ. Ikekwe i nwere ike kesaara ha ụmụ gị ma kwuo banyere mmetụta niile iji mara na anyị arụsịwo ọrụ ike ma emewo ike anyị.