“Julaị 14–20: ‘Aga M Edu Gị Na-aga’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77–80,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77–80,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Julaị 14–20: “Aga M Edu Gị Na-aga”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77–80
Ihe na-erughị afọ abụọ mgbe eweghachitesịrị Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst, o nwebuuru karịa ndị otu 2,000 ma naara eto ọsọ ọsọ. Na Maachị 1832, Josef Smith zutere ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ “ịkpa nkata azụmahịa Nzukọ nsọ”: mkpa ọ dị ibipụta mpughe niile, ịzụta ala a ga-agbakọ na ya, ma lekọta ndị dara ogbenye (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78, isi nkeji). Izute mkpa ndịa, Onyenwe anyị kpọrọ ntakịrị ọnụọgụgụ ndị ndu Nzukọ nsọ ihiwe United Firm, otu ga-ejikọta mbọ ha iji “melite ọrụ” nke Onyenwe anyị (amaokwu 4) niime mpaghara ndị a. Mana ọbụna niime ụdị okwu nchịkwa ndị a, Onyenwe anyị lekwasịrị anya nihe niile nke ebighị ebi. N’ikpeazụ, ebumnuche nke ụlọ ọrụ mbipụta ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe—dị ka ihe ndị ọzọ dị niime alaeze nke Chineke—bụ iji kwadoo ụmụ Ya ịnata “ọnọdụ n’ụwa selestịal” na “akụ na ụba nke ebighị ebi” (amaokwu 7, 18). Ma ọ bụrụ ma ngọzi ndị ahụ rara ahụ ịghọta ugbu a, n’etiti oke ọrụ nke ndụ kwa ụbọchị, Ọ masigharịrị anyị obi ike, “Nwee ezi obi ụtọ, niihi na aga M edu gị na-aga” (amaokwu 18).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Chineke na-enye mmata ihe n’aka ndị na-achọ ya.
Dị ka Josef Smith na Sidney Rigdon rụrụ ọrụ na ntụgharị asụsụ Baịbụl mmụọ kpatere, ha nwererịị ajụjụ ndị gbasara akwụkwọ nke Mkpughe, dị ka ọtụtụ ndị nwere. Ma dị ka Josef maara nke ọma, mgbe amamiihe kọrọ ya, o nwere ike ịjụ Chineke. Nghọta ndị o nwetere dịcha niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77. Dị ka ị na-agụ nkeji nke a, tulee idekọ nghọta gị niime isi ndị dị mkpa niime akwụkwọ nke Mkpughe. Kedụ ihe ị na-amụta site n’ọmụmụ ihe gị banyere ịnata mkpughe?
Gịnị bụ United Firm?
United Firm ka ehiwere iji jikwaa mbipụta na ihe niile gbasara azụmahịa nke Nzukọ nsọ niime Ohio na Missouri. Ọ gụnyere Josef Smith, Newel K. Whitney, na ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ ndị tikọtara akụrụngwa ha iji zute mkpa anụ ahụ niile nke Nzukọ nsọ na-eto eto. Dị mwute, United Firm dabara niime ụgwọ ma ekposaa ya na 1834 mgbe ụgwọ ndị ahụ bịara karịa enweghị njikwata.
Lee kwa “Newel K. Whitney na the United Firm,” na Mkpughe ndị dị n’Ọnọdụ, 142–47; Isiokwu niile nke Agụgụala Nzukọ nsọ, “United Firm (‘United Order’),” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:1–7
E nwere m ike inye aka “melite ọrụ” nke Kraịst na Nzukọ nsọ Ya.
Onyenwe anyị gwara Josef Smith na ndị ndu Nzukọ nsọ na ijikwa ụlọ nkwakọba ihe na ụlọ ọrụ mbipụta ga-enye aka “melite ọrụ, nke i kwadoro” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:4). Gịnị ka i ga-ekwu bụ “ọrụ” nke Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta? Tulee nke a dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:1–7. Kedụ ụfọdụ ụzọ ndị dị iche iche i nwere ike iji nye aka melite ọrụ ahụ—tinyekwara niime ezi na ụlọ gị?
Lee kwa Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 1.2.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:17–18
Onyenwe anyị ga-edu m na-aga.
Gịnị mere i jiri chee na Onyenwe anyị mgbe ụfọdụ na-akpọ ndị na-eso Ya “obere ụmụntakịrị”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:17). Olee mgbe i chere ịdị ka obere nwantakịrị, ikekwe niihi otu ihe na ị “ka aghọtabeghị” ma ọ bụ “enweghị ike idi”? (amaokwu 17-18). Kedụ ihe ị na-ahụ niime amaokwu ndị a nke nwere ike inyere gị aka “nwee ezi obi ụtọ” (amaokwu 18) n’ụdị oge ndị ahụ? Tulee ịchọta otu foto nke onwe gị mgbe ị bụụrụ nwantakịrị, tụgharịa uche otu i si wee tolitewo na ime mmụọ kemgbe ahụ. Ma ọ bụ chee maka otu ihe nke rara gị ahụ mgbe ị dịịrị nta mana karịa dị mfe ugbu a. Kedụ ụzọ ndị Nna nke Eluigwe kachọkwara ka ị dịrị ka nwantakịrị? (lee Mozaya 3:19). Kedụ otu O si “[na-edu] gị na-aga”?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:19
E nwere m ike ịnata ihe niile n’obi ekele.
Iji kwadoo ịmụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:19, i nwere ike depụta ihe niile dị mma nke na-emeworo gị taa. Emesịa depụta ihe niile nke na-eyighị ngọzi nye gị. Tulee ndepụta ndị a dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:19. Kedụ ndịiche ọ na-eme niime ndụ gị ọ bụrụ ma ị nata ihe niile n’obi ekele—ọbụna ihe ndị na-adịghị ka ha yiri ngọzi?
Iji mụkwuo banyere otu inye Chineke ekele nwere ike iji metụta ndụ gị, nyochaa akwụkwọ nsọ ndị a ma depụta eziokwu ndị ị chọtara: Abụ ọma 107:8–9; Luk 17:11–19; Ndị Filipii 4:6–7; Mozaya 2:19–24; Alma 34:38; 37:37; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:32; 59:7, 15–21.
Tulee ịchọgharị ozi nke Onyeisi Dieter F. Uchtdorf “Inwe Obi Ekele niime Ọnọdụ niile Ọbụla” (Liahona, Me 2014, 70–77) maka ndụmọdụ banyere otu esi enwe obi ekele. I nwere ike chọọ ndụmọdụ yiri nke a niime vidiyo “Onyeisi Russell M. Nelson nọ na Ike Ọgwụgwọ nke Obi ekele” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kedụ otu obi ekele si emetụta mmekọrịta gị na Jizọs Kraịst?
Lee kwa“Gụkọọ Ngọzi Gị niile,” Abụ niile, no. 241; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Obi ekele,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 79–80
Ọkpụkpọ oku ijere Chineke ozi dị mkpa karịa ebe m na-eje ozi.
Gbasara Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 80, Okenye Devid A. Bednar kuziri, “Elemaanya otu niime ihe ọmụmụ Onye Nzọpụta kuziiri anyị niime mkpughe nke a bụ na ọrụ ekenyere ịrụ ọrụ n’ebe akpọrọ aha dị oke mkpa ma dịkwa mkpa mana bụ nke abụọ nye ọkpụkpọ oku n’ọrụ ahụ” (“Akpọrọ N’ọrụ ahụ,” Liahona, Me 2017, 68). Kedụ nhụmiihe ndị nyewooro gị aka mụọ na okwu niile nke Okenye Bednar bụ eziokwu? Kedụ ihe ọmụmụ ndị agbakwunyere ka i nwere ike ịchọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 79-80 nke nwere ike inyere otu onye aka onye nke ka natara ọkpụkpọ oku?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77:2
Chineke kere ihe niile ekereeke dị n’ụwa.
-
Dị ka gị na ụmụ gị na-agụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 77:2, i nwere ike lee anya na foto niile nke ụmụ anụmanụ, gụnyekọta ụmụ ahụhụ na ụmụ nnụnụ. Ụmụ gị nwere ike rụtụ aka na foto ahụ niile mgbe ị na-agụ mkpụrụokwu “anụ ọhịa,” “ihe ndị na-akpụakpụ,” na “anụ ufe niile nke eluigwe.” Kesaara onye ọbụla otu ihe okike niile nke Chineke si enyere gị aka nwete mmetụta ịhụnaanya Ya.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:4
E nwere m ike inye aka “mee ka ọrụ” nke Jizọs Kraịst na-aganiihu.
-
Iji nyere ụmụ gị aka chee banyere ọrụ ha nwere ịrụ niime ọrụ nke Onyenwe anyị, tulee iso ha agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:4 iji chọpụta “ọrụ” nke anyị “kwadoro” (anabatara ma ọ bụ a họọrọ ikwado) mgbe e mere anyị baptizim. Nyere ha aka chọọ niime edereede akwụkwọ nsọ dị ka ndị a maka azịza ndị kwere omume: Mozaya 18:8–10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37; Moses 1:39. Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ijije otu ha nwere ike i si nyee aka n’ọrụ nke Onyenwe anyị. N’ịmaatụ, gịnị ka o yiri ka ya “ibukọrịta ibu onye n’ibe ya” ma ọ bụ “iwekwasị [n’onwe anyị] aha nke Jizọs Kraịst”? Kedụ otu nke a si “eme ka ụzọ” nke Kraịst na-aganiihu?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:6
E nwere m ike ikesa ihe m nwere mụ na ndị ọzọ.
-
Ikuzi ihe ọ pụtara “ịha nhatanha nihe niile nke ụwa” (amaokwu 6), i nwere ike nye ụmụ gị foto ndị nọ na mkpa (agụụ na-agụ, merụrụ ahụ, ma ọ bụ oyi na-atụ) na ihe ndị ga-enyere ha aka (dị ka nri, bandage, ma ọ bụ balanketị). Mgbe ahụ ụmụ gị nwere ike hakọta foto ndị ahụ ya na ihe ndị ahụ. Kedụ ihe anyị nwere ike ikesa iji nyere ndị nọ na mkpa aka?
-
Inwete ọnọdụ ole ma ole maka nkeji 78, soro ụmụ gị gụọ ahịrịokwu ndị nọ n’okpuru foto abụọ ndị mbụ banyere Isi nke 28: Onye Amụma Josef Agaa Missouri Ọzọ” (niime Akụkọ ndị nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 108, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Mgbe ahụ ụmụ gị nwere ike mee ka aga asị na ha na-enyere mmadụ aka iwu ụlọ, i ke nri, ma ọ bụ ije ozi n’ụzọ ọzọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:18
Jizọs Kraịst ga-edu m na-aga.
-
O nwere ike bụrụ ihe ọńụ nye ụmụ gị ikwu banyere ihe ọ pụtara ị bụ onye ndu ma emesịa duo otu ihe omume. Mgbe unu gụkọchara ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:18, unu nwere ike kparịta ụka maka oge niile mgbe anyị nwere mkpa Jizọs Kraịst idu anyị. Tulee ịgụ otu egwu dị ka “Aga M Eso Jizọs Eje ije” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:19
E nwere m ike “ịnata ihe niile n’obi ekele.”
-
Soro ụmụ gị gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:19 iji chọpụta ihe Onyenwe anyị kwere nkwa inye ndị nwere obi ekele. Nyere ụmụ gị aka ghọta ihe “narị okpukpu” pụtara, ikekwe site na-igosi ha obere ihe ma emesịa 100 nke otu ihe ahụ kwa. Ikekwe ha nwere ike see foto nke ihe ha nataworo site n’aka Chineke “n’obi ekele.”