“Julaị 7–13: ‘Ukwuu Ka Ụgwọ ọrụ Ha Ga-adị ma Ebighị ebi Ka Ebube Ha Ga-adịkwa’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Julaị 7–13: “Ịdị Ukwuu Ka Ụgwọ ọrụ Ha Ga-adị ma Ebighị ebi Ka Ebube Ha Ga-adịkwa”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76
“Gịnị ga-eme m mgbe m nwụchara?” Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọbụla na-ajụ ajụjụ nke a n’ụzọ dị ańaa ma ọ bụ ụzọ ọzọ. Ruo ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ omenaala ndị otu Kraịst, dabeere na nkuzi niile nke baịbụl, akuziwo banyere eluigwe na ọkụ ala mmụọ, banyere paradaịs maka ndị ezi omume na ntaram ahụhụ maka ndị ajọọ omume. Mana ezi na ụlọ nke mmadụ dum ha nwere ike n’ezie kewaa nụzọ siri ike otu a? Na Febrụwarị 1832, Josef Smith na Sidney Rigdon naara eche ma enwere ihe ndị ọzọ e kwesịrị ịma banyere isiokwu ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76, isi nkeji).
Enwere n’ezie. Ebe Josef na Sidney naara atule ihe ndị a, Onyenwe anyị “metụrụ anya nke nghọta [ha] aka ma emeghere ha” (amaokwu 19). Ha natara mkpughe dị oke ịtụnaanya, sara oke mbara, na-enye oke ìhè nke mere na Ndị nsọ kpọrọ ya nnọọ “Ọhụ ahụ.” O meghere mpio niile nke eluigwe ma nye ụmụ Chineke nghọta na-adọtị uche banyere ebighị ebi. Ọhụ ahụ kpughere na eluigwe ka ukwuu ma ka saa mbara ma ka na-agụnye karịa otu ọtụtụ mmadụ chebuuru na mbụ. Chineke kacha dị obi ebere ma zie ezi karịa otu anyị nwere ike ịghọta. Ma ụmụ Chineke nwere akara aka dị ebighị ebi dị ebube karịa otu anyị nwere ike iche.
Lee Ndị Nsọ, 1:147–50; “Ọhụ Ahụ,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 148–54.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi nakwa na Nzukọ nsọ
Nzọpụta na-abịa site na Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
Nkeji 76 kpughere eziokwu ndị dị mkpa banyere akara aka ebighị ebi anyị, mana ọ gaghị ezu oke ikwu na mkpughe nke a bụ banyere alaeze nke ebube atọ ma ọ bụna nnọọ banyeree atụmatụ nke nzọpụta. Ebe ọ kacha mma karịa, nkeji 76 bụ banyere Jizọs Kraịst, onye na-eme atụmatụ nke Chineke maka nzọpụta na ebube ebighị ebi anyị kwe omume. Dị ka ị na-agụ, i nwere ike chọọ maka mkpụrụ okwu niile ma ọ bụ nkebiokwu niile na-akọwa mmekọrịta dị n’etiti Jizọs Kraịst na ndị mmadụ ndị ketara alaeze nke ebube dị iche iche. Eleghị anya tebụlụ dị ka nke na-esote nwere ike nyere gị aka dekọọ ihe ị chọpụtara.
Alaeze nke ebube |
Mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst |
Ngọzi Ebighị ebi niile |
---|---|---|
Alaeze nke ebube Selestịal (amaokwu 50–70, 92–96) | Mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst
| Ngọzi Ebighị ebi niile
|
Alaeze nke ebube Terestrịal (amaokwu 71–79, 97) | Mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst | Ngọzi Ebighị ebi niile |
Alaeze nke ebube Telestịal (amaokwu 81–90, 98–106, 109–12) | Mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst | Ngọzi Ebighị ebi niile |
Kedụ mmetụta i na-enwe mkpatemmụọ ime iji kwadosie ike mmekọrịta gị na Onye Nzọpụta?
Mgbe Wilford Woodruff gụrụ ọhụ nke a, o kwuru, “E nwetere m mmetụta inwe ịhụnaanya n’ebe Onyenwe anyị nọ karịa ka m nwetụworo mbụ na ndụ m” (lee “Olu niile nke Mweghachite: Ama niile nke ‘Ọhụ ahụ’”) Kedụ ihe ị na-amụ banyere Jizọs Kraịst sitere na amaokwu ndịa 1–5, 20–24, 39–43, 107–8 nke na-eme gị ahụ Ya naanya karịa?
Lee kwa 1 Pita 3:18–19; 4:6; Dallin H. Oaks, “Gịnị Ka Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?,” Liahona, Me 2021, 75–77; “E Guzooro M N’ịtụnaanya Niile,” Abụ niile, no. 193.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:5–10, 114–18
E nwere m ike ịghọta uche nke Chineke “site n’ike nke Mmụọ Nsọ.”
Ọbụghị ndị otu Nzukọ nsọ niile nabatara mkpughe ahụ dị niime nkeji 76 n’ụzọ dị mfe, niihi na ọ kuziri na ihe gaara eru mmadụ niile ka a ga-azọpụta ma nata ụfọdụ ogo nke ebube. N’ịmaatụ, Brigham Young kwuru: “Omenaala m bụụrụ otu a, na mgbe Ọhụ ahụ buuru ụzọ rute m, o megidere ma guzogide nnọọ ihe akuziiri m tupu oge a. E kwuru m, Chere nwa oge. Ajụghị m ya; mana e nweghị m ike ịghọta ya.” Ọ kọwara na ọ bịaziri “chee echiche ma kpee ekpere, iji gụọ ma chee, tutu ruo mgbe m matara ma ghọta ya n’uju n’onwe m” (niime “Ọhụ Ahụ,” niime Mkpughe dị N’ọnọdụ, 150) Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe ya nke nwere ike inyere gị aka mgbe Chineke kpughere ihe ndị gbara iche site na nghọta gị nke ugbu a? Kedụ ihe ị na-amụta banyere Chineke niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:5–10, 114–18? Kedụ ihe amaokwu ndị a na-akuzi banyere otu i nwere ike i si ghọta “obi ụtọ ịdị mma uche nke [Chineke]”? (amaokwu 7).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:39–44, 50–70
Mbuli elu bụ ụdị nzọpụta kachasị elu.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:39–44 na-akọwa ihe niile banyere nzọpụta. Amaokwu 50–70 na-akọwa mbuli elu, ụdị nzọpụta nke akpọrọ aha kpọmkwem. Kedụ otu ị ga-esi akọwa ndịiche dị n’etiti nzọpụta na mbuli elu? Gịnị bụ ọrụ nke Onye Nzọpụta niime ha abụọ? Gịnị ka ị na-ahụta niime amaokwu ndị a na-akpatemmụọ gị ịchọ mbuli elu?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:50–70, 92–95
Nna m nke Eluigwe chọrọ ka m nata ndụ ebighị ebi niime alaeze selestịal.
Ịtụgharịtuwo uche mgbe ọbụla—ma ọ bụ nwee nchegbu—banyere ma ị ga-aghọ ụdị onye ahụ ga-anata ebube selestịal, dị ka akọwara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:50–70, 92–95? Ebe ọ dị mkpa ịmara ihe Chineke na-achọ n’aka anyị, tuleekwa ịchọ niime amaokwu ndị a maka ihe Chineke mewooro anyị—ma ka na-eme—iji nyere anyị aka bịa dị ka Ya. Gịnị mere iji na-eche na mgbalị gị dị Ya mkpa?
Kedụ otu ọhụ nke ebube selestịal nke a si emetụta ụzọ ịchọrọ iji bie ndụ gị kwa ụbọchị?
Lee kwa Moses 1:39; J. Devn Cornish, “A Dị mma Zuru M Oke? Aga M Emeri?,” Liahona, Nov. 2016, 32–34.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:24
Anyị niile bụ ụmụ Chineke.
-
Iji nyere ụmụ gị aka ghọta ike ha sinachi, i nwere ike gosi ha foto nke ụmụntakịrị na ndị nne na nna ha. I nweziri ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:24 ma kesaara ibe unu ihe mere obi ji atọ gị ụtọ ịmara na anyị niile bụ “ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị nye Chineke.”
-
Unu nwekwara ike gụkọọ “A Bụ M Nwa Chineke” ọnụ (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 2-3) ma kpọkuo ụmụ gị ịtụ onwe ha aka mgbe ha na-agụ “M.” Mgbe ahụ kwee ọzọ, na-edochi “A bụ m” jiri “ị bụ” dị ka ha na-atụ onye ọzọ aka.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:5, 41–42, 69
Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta m.
-
Tulee ijije gị na ụmụ gị otu ihe atụ niime nke otu onye jụrụ ajụjụ, “Gịnị ka Jizọs Kraịst mewooro m?” Gị na ụmụ gị nwere ike chọọ azịza ndị nwere ike ịdị niime amaokwu 5, 41–42, ma ọ bụ 69 niime nkeji 76. I nwekwara ike kwee “O Zigara Ọkpara Ya,” Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 34–35. Kedụ otu anyị nwere ike isi gosi obi ekele anyị niihi ihe Onye nzọpụta mewooro anyị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:62
Nna nke Eluigwe chọrọ ka m lọghachi ka mụ na Ya biri ruo mgbe ebighị ebi.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike gụọ ma ọ bụ lere akụkụ ma ọ bụ ihe niile nke “Isi nke 26: Alaeze nke Eluigwe Atọ” (niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 97–103, ma ọ bụ vidiyo kwekọtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma) ma kesaara ya onye ọbụla ihe masịrị gị banyere ọhụ Josef Smith nwetere. Kwee ka ụmụ gị kesaa echiche ha na mmetụta ha banyere ihe ọ ga-adị ka ya ibinyere Nna nke Eluigwe niime alaeze selestịal.
-
I nwekwara ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:62 ma kpọkuo ụmụ gị ise foto nke onwe ha na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist niime alaeze selestịal (lee ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:12, 15–19, 114–16
Ịmụ akwụkwọ nsọ nwere ike nyere m aka “ghọta ihe niile banyere Chineke.”
-
I nwere ike kpọkuo ụmụ gị ịgụ amaokwu 15-19 iji chọta ihe Josef Smith na Sidney Rigdon naara eme mgbe ha nwetere ọhụ ahụ dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76. Gwa ụmụ gị banyere oge mgbe ị natara mkpatemmụọ dị ka ị na-agụ akwụkwọ nsọ, ma jụọ ụmụ gị ma ha enwetewo ụdị nhụmiihe yiri ya.