Come, Follow Me
Julaị 21–27: Ebe “E Nyere Nnukwu ihe, Nnukwu ihe Ka A Chọrọ”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81–83


“Julaị 21–27: Ebe ‘E Nyere Nnukwu ihe, Nnukwu ihe Ka A Chọrọ’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81–83,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81–83,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Jizọs Kraịst na-agwa nwata nwoke ahụ bara ọgaranya okwu

Nkọwa sitere na Kraịst na Nwata Nwoke Onye ọchịchị Bara ụbasite n’aka Heinrich Hofmann

Julaị 21–27: Ebe “E Nyere Nnukwu ihe, Nnukwu ihe Ka A Chọrọ”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81–83

Na Maachị 1832, Onyenwe anyị kpọrọ Jesse Gause ị bụ onye ndụmọdụ nye Josef Smith niime Otu Ndịisi nke Ọkwa nchụaja Dị elu (a na-akpọ Otu Ndịisi Mbụ ugbu a). Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81 bụ mkpughe nye Nwanne nwoke Gause banyere ọkpụkpọ oku ọhụrụ ya. Mana Jesse Gause ejeghị ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, ya mere akpọọ Frederick G. Williams ịnọchi ya. Aha nwanne nwoke Williams nọchiri aha nke Nwanne nwoke Gause niime mkpughe ahụ.

Nke ahụ nwere ike dị ka obere uju na-adịghị mkpa, mana ọ na-egosi eziokwu pụtara ihe: ọtụtụ niime mkpughe ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile ka a na-agwa ndị a kpọrọ aha, mana anyị nwere ike mgbe niile chọọ ụzọ ndị esi etinye ha n’onwe anyị (lee 1 Nifaị 19:23). Mgbe anyị gụrụ ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nye Frederick G. Williams iji “gbaa ikpere na-adịghị ike ume,” anyị nwere ike chee maka ndị anyị nwere ike ịgba ume (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:5). Mgbe anyị gụrụ ọkpụkpọ oku nke Onyenwe anyị nye ndị otu nke United Firm iji “jikọta onwe unu site n’ọgbụgba ndụ nke a,” anyị nwere ike chee maka ọgbụgba ndụ nke onwe anyị. Ma anyị nwere ike gụọ nkwa Ya, “Mụ onwe m … ka a na-amanye mgbe unu mere ihe m kwuru,” dị nnọọ ka Ọ na-agwa anyị okwu (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:10, 15). Anyị nwere ike ime nke a niihi na, dị ka Onyenwe anyị mara ọkwa, “Ihe M kwuru nye otu onye ka M kwuru nye ndị niile” (amaokwu nke 5).

Lee “Newel K. Whitney na United Firm ahụ,” “Jesse Gause: Onye ndụmọdụ nye Onye Amụma,” niime Mkpughe ndị Dị n’ọnọdụ, 142–47, 155–57.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:4–5; 82:18–19

“I ga-eme ihe ọma kachasị ukwuu nye mmadụ ibe gị.”

Niime ọtụtụ edereede ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:83, Onyenwe anyị na-akpọku anyị inyere ndị nọ na mkpa gbara anyị gburugburu aka. Tulee ịkanye akara na edereede ndị ahụ dị ka ị na-achọta ha. Otu niime ọmụmaatụ nkọwa dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:4–5. Ndị a bụ ụfọdụ ajụjụ iji nyere gị aka tulee amaokwu ndị a:

  • Kedụ ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ nwere ike i si “ada mba”? Gịnị ka ọ pụtara “inyere ha aka”? Olee mgbe ije ozi dị ka Kraịst nye ndị ọzọ siworo nyere m aka mgbe m dịịrị ka m dara mba?

  • Gịnị nwere ike mee ka aka mmadụ n’ụzọ ihe atụ “a daa ala”? Kedụ otu m ga-esi “ebuli” aka ndị ahụ elu?

  • Gịnị ka “ikpere na-adịghị ike” pụtara? Kedụ otu esi agba ha ume?

Kedụ otu Onye Nzọpụta si emere gị ihe ndị a?

Ikekwe ịmụ amaokwu nke a ewetewo n’uche onye i nwere ike “inyere aka,” “bulie elu,” ma ọ bụ “gbaa ume.” Gịnị ka i ga-eme iji jee ozi nlekọta nye onye ahụ?

Kedụ ihe ọzọ ị na-amụta banyere ije ozi nye ndị ọzọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:18–19? I nwekwara ike lee vidiyo “Nkuzi niile nke Thọmas S. Monson: Ịnapụta Ndị Ahụ nọ na Mkpa” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kedụ otu ndị otu ngalaba nke Bishọp Monson si gosipụta ọmụmaatụ ihe amaokwu ndị a na-akuzi?

5:1

Teachings of Thomas S. Monson: Rescuing Those in Need

Bishop Thomas Monson and his ward welcome a poor German family into their community, providing them with housing, warmth, and food for Christmas.

Lee kwa Jekọb 2:17–19; Mozaya 18:8–9; “Ọrụ niile nke Chineke” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.

4:21

Works of God

Two families share how they have seen the works of God made manifest in their lives as ward members reach out in love and understanding.

Jizọs Kraịst n’ebe ọdọ mmiri Betesda

Carl Heinrich Bloch (1834–1890), Kraịst Na-agwọ Onye Ọrịa n’ebe Betesda, 1883, mmanụ n’elu canvas, 100 ¾ x 125 ½ inches. Mbarị Nkaọkpụ nke Mahadum Brigham Young, azụrụ jiri ego ndị Jack R. Na Meri Lois Wheatley wetere, 2001.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:3

Onye nzọpụta enyewo m ọtụtụ ihe ma na-achọ ọtụtụ ihe n’aka m.

Ị na-agụ amaokwu nke a nwere ike kpatee gị inyochagharị ihe Chineke nyeworo gị—ma ngozi nke anụ ahụ ma ngọzi nke ime mmụọ. Buru nke a n’uche dị ka ị na-agụ ndị fọdụrụ na nkeji 82. Gịnị ka i chere Chineke na-achọ n’aka gị?

Lee kwa “Niihi na E Nyewo M Ọtụtụ,” Abụ niile, no. 219.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:8-10

akara ngosi semịnarị
Iwu nsọ niile bụ ihe aka ebe nke ịhụnaanya Chineke nwere maka anyị.

Ọ bụrụ ma gị ma ọ bụ onye i maara echeworịị ihe mere Onyenwe anyị si enye ọtụtụ iwu nsọ, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:8–10 nwere ike inye aka. Olee nghọta ndị sitere na amaokwu ndị a nwere ike inyere gị aka kọwaara mmadụ ihe kpatara iji họrọ isoro iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe i nwere ike iji tụnyere iwu nsọ niile nke nwere ike inye aka? I nwere ike chọta nghọta ndị agbakwunyere niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:37–38; 130:20–21 na vidiyo “Ịdị Ngọzi na Inwe Ańụrị Bụ nke Ndị ahụ Na-edebe Iwu Nsọ niile nke Chineke” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kedụ nhụmiihe ndị kuziwooro gị ịhụ iwu nsọ niile dị ka ngọzi?

5:41

Blessed and Happy Are Those Who Keep the Commandments of God

Read Elder Keetch's full conference talk here: https://www.lds.org/general-conference/2015/10/blessed-and-happy-are-those-who-keep-the-commandments-of-god?lang=eng&_r=1

Chee banyere ụfọdụ niime iwu nsọ niile nke Chineke nyeworo gị. Kedụ ihe iwu nsọ niile kuziwooro gị banyere Ya na uche Ya? (lee amaokwu 8). Kedụ otu ndụ gị siworo nwee mmetụta site na-idebe iwu nsọ ndịa?

Kedụ ihe unu na-amụta banyere Onyenwe anyị site na amaokwu 10? Kedụ ihe i chere ọ pụtara nye Onyenwe anyị “ịmanye”? (lee kwa amaokwu 15).

Kedụ otu Onyenwe anyị si debe nkwa Ya niile niime ndụ gị? Kedụ ihe i nwere ike ịgwa onye na-adịghị enwe mkpali idebe iwu nsọ niile niihi na ha anatabeghị ngọzi ndị ha tụrụ anya? Ị na-achọta nghọta ọbụla ndị na-enye aka niime ozi nke Okenye D. Todd Christofferson “Mmekọrịta Anyị na Chineke”? (Liahona, Me 2022, 78–80).

Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Iwu nsọ niile,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:10

Onyenwe anyị na-agọzi anyị n’ụzọ Ya ndị nke dị ịtụnaanya.

Nwanne nwanyị Virginia H. Pearce, onye bubuuru onye otu Ndịisi Zuru ọha nke NdịInyom Nta, kwuru banyere otu nwanyị onye nwere chegburu nke ukwuu banyere ụmụ ya ndị na-eme nhọrọ ajọọ omume. N’ụjọ dị nso, ọ nwara ihe niile o nwere ike iche iji chọọ ngọzi niile nke Onyenwe anyị n’isi ha. Na mgbakwunye nye ekpere siri ike, o hiwere ebumnuche oké ọchịchọ nke ojije tempụl emelitere ma nwee mmetụta siri ike na Onyenwe anyị ga-anabata aja nke a dị ukwuu site na-ịgbanwe obi ụmụ ya. Nwanyị ahụ nyere nkọwa:

“Mgbe ojije tempụl bawanyere na ekpere mgbe niile n’afọ iri gasịrị, obi jọrọ m njọ i kwu na nhọrọ nke ụmụ m agbanwebeghị. …

“Mana agbanwewo m. A bụ m nwanyị dị iche. … E nwere m obi dị nro karịa. E jupụptara m na ọmịiko. E nwere m ike n’ezie mee karịa ma enweere m onwe site na-ịtụ egwu, obi nkorụpụ, ikpe ọmụma, ụta na ịtụ oke ụjọ. A hapụwo m oge niile m họpụtara ma e nwere m ike ichere Onyenwe anyị. Ma ana m enwe nhụmiihe ngosipụta nke ike nke Onyenwe anyị mgbe na mgbe. Ọ na-ezite ebere niile dị nro, obere ozi ndị na-anakwere ịhụnaanya ya maka mụ na ụmụ m. Atụmanya m niile agbanwewo. Kama ịtụanya na ụmụ m ga-agbanwe, ana m atụanya ebere ndị a dị nro na-abịakarị ma ejupụtara m n’obi ekele maka ha. …

“Ekpere m niile agbanwewo. Ana m ekwupụta ịhụnaanya karịa ma ejupụtara m n’ekele karịa. … Onyenwe anyị na-arụ ọrụ n’ụzọ ndị dị ịtụnaanya, ma ejupụtara m n’ezie n’udo nke gafere nghọta niile” (niime “Ekpere: Ihe Dị Ntakịrị ma Dị mfe,” N’ebe Ikpo okwu [2017], 288–89).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 83

“Ụmụnwanyị isimkpe na ndị na-enweghị nne na nna ka a ga-elekọta.”

Na Eprel 1832, dị ka Onyenwe anyị nyere iwu, Josef Smith gara njem ihe ruru maịlụ 800 ịga leta Ndị nsọ ndị gbakọtaworo na Missouri (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 78:9). Mgbe ọ nọ ebe ahụ, ọ letara obodo ebe ọtụtụ ụmụnwanyị isimkpe nọọrọ na-azulite ụmụ ha naanị ha. N’etiti ha bụụrụ Phebe Peck na Anna Rogers, ndị Onye Amụma maara n’onwe ya. Na Missouri niime afọ 1830 gbagoo, iwu siteeti nyere ụmụnwanyị isimkpe ikike belatara ebelata nye ihe onwunwe nke ndị di ha nwụrụ anwụ. Gịnị ka ị na-amụta site na nkeji 83 banyere otu Onyenwe anyị si eche maka ụmụnwanyị isimkpe na ndị na-enweghị nne na nna? Ị maara onye ọbụla nọ n’ọnọdụ nke a onye nwere ike irite uru site n’ịhụnaanya ma ọ bụ nlekọta gị? Gịnị bụ ụfọdụ ụzọ ndị i nwere ike i si kesaa ihe ndị i nwere nye ụmụnwanyị isimkpe, ndị na-enweghị nne na nna, ndị nne na-azụ ụmụ naanị ha, na ndị ọzọ nọ na mkpa?

Lee kwa Aịzaya 1:17; Jemis 1:27.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:3

E nwere m ike ikpe ekpere nye Chineke “n’olu ụda na niime obi [m].”

  • Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:3 gị na ụmụ gị, nyere ha aka chee maka ebe “ihu ọha” na ebe “nkeonwe” ha nwere ike ikpe ekpere. I nwekwara ike gee ntị ma ọ bụ gụọ egwu gị na ha otu abụ banyere ekpere, dị ka “Ekpere Nzuzo” (Abụ niile, no. 144) Kesaara onwe unu ihe sitere na abụ ahụ na-akuzi eziokwu dị mkpa banyere ekpere. I nwekwara ike kwuo banyere ịgwa Nna nke Eluigwe okwu na nsọpụrụ.

  • Ịgba ụmụ gị ume ikpe ekpere niime obi ha, i nwere ike nye ha obi eji akwụkwọ mee ma kpọkuo ha ise ihe ma ọ bụ ide ihe ha chọrọ ikpere Nna nke Eluigwe maka ya. Gbaa ama na Nna nke eluigwe maara ihe anyị na-eche na ihe na-emetụta anyị ma O nwere ike ịnụ ekpere anyị ọbụna ọ bụrụ anyị ekwupụtaghị ha n’olu dara ụda. I nwere ike kọọrọ ha otu nhụmiihe mgbe i kpere ekpere niime obi gị ma Nna nke Eluigwe anụ gị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:5

Onyenwe anyị chọrọ ka m nyere ndị nọ na mkpa aka.

  • Gị na ụmụ gị, see foto nke aka na ikpere, ma rịọ ụmụ gị ịchọta akụkụ ahụ ndị a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:5. Gịnị ka Onyenwe anyị na-arịọ anyị ime niime amaokwu nke a? I nwere ike kesaara onye ọbụla ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ siworo gbaa gị ume mgbe ọ dị gị ka “ịdara mba” ma ọ bụ “esighị ike.” Vidiyo ahụ “Pass It On” (ChurchofJesusChrist.org) nwere ike nye ụmụ gị nchepụta banyere otu ha si ejere ndị ọzọ ozi. Unu nwekwara ike gụọ otu egwu banyere ije ozi, dị ka “E Mewo M Ihe Ọbụla Dị Mma?” (Abụ niile, no. 223). Tulee inyere ụmụ gị aka mee atụmatụ inyere opekempe otu onye nọ na mkpa aka n’izu ụka nke a.

    2:3

    Pass It On

    Children around the world have taken President Thomas S. Monson's counsel to find a way to serve others.

  • Unu nwekwara ike jiri foto niile ma ọ bụ vidiyo niile iji kọọ akụkọ ndị dị mfe nke Jizọs Kraịst na-ejere ndị ọzọ ozi (lee foto ndị nọ niime ndepụta nke a; Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọmba nke 41, 42, 46, 47, 55; ma ọ bụ otu niime Vidiyo Baịbụl niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kedụ otu anyị ga-esi esoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta banyere inyere ndị ọzọ aka?

    Christ raising the daughter of Jairus
Jizọs Kraịst na nwanyị Ọ gwọrọ

Anyị nwere ike kpọtụrụ ndị nọ na mkpa dị ka Onye Nzọpụta mere.

Nyere ụmụ gị aka nata mkpate mmụọ nke onwe ha. Nkuzi pụtara karịa naanị ikesa eziokwu—ọ pụtara inyere ndị ọzọ aka bụrụ ndị na-amụ ihe n’onwe ha. Kama ị na-agwa ụmụ gị otu ha nwere ike i si jeere ndị ọzọ ozi, n’ịmaatụ, gbaa ha ume ịchọ odudu nke Onyenwe anyị iji mata onye ha nwere ike inyere aka.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:10

Nna nke Eluigwe na-ekwe nkwa ngọzi niile dị ka m na-agbalị irubere Ya isi.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike lee anya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 82:8–10 maka azịza niile nye ajụjụ ahụ “Gịnị kpatara Nna nke Eluigwe si enye anyị iwu nsọ niile?” I nwere ike nyere ụmụ gị aka chee maka iwu nsọ Ya niile (lee, n’ịmaatụ, Ọpụpụ 20:4–17; Matiu 22:37–39; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89:5–17). O nwere ike inye aka ma ọ bụrụ na gị na ụmụ gị chọọ ma ọ bụ see foto niile iji gosipụta ụfọdụ niime ha. Kedụ otu iwu nsọ niile nke Nna nke Eluigwe si egosipụta ịhụnaanya Ya maka anyị?

  • Ikekwe ihe egwuregwu dị mfe nwere ike nyere ụmụ gị aka hụta iwu nsọ niile nke Chineke dị ka ngọzi, na-abụghị ibu arọ. Otu onye nwere ike nye ntuziaka niile iji nyere onye ọzọ aka, onye ekechiri anya, ime ihe dị ka ime sandwich ma ọ bụ ise ihe osise foto. Chee maka ihe na-enye ọńụ na nke ekeere uche! Mgbe ahụ kwuo banyere otu iwu nsọ niile nke Chineke dị ka ntuziaka niile dị niime egwuregwu nke a.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Jizọs Kraịst na nwoke Ọ gwọrọ

Ngosipụta nke Jizọs na-agwọ otu nwoke, site n’aka Dan Burr

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị