Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Ama niile nke “Ọhụ ahụ”


“Olu niile nke Mweghachite: Ama niile nke ‘Ọhụ ahụ’,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ama niile nke ‘Ọhụ ahụ’,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akara ngosi nke olu niile nke mweghachite

Olu niile nke Mweghachite: Ama niile nke “Ọhụ ahụ”

Wilford Woodruff

Portrait of Wilford Woodruff.

Wilford Woodruff sonyere Nzukọ nsọ na Dizemba 1833, ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo afọ abụọ mgbe Josef Smith na Sidney Rigdon natasịrị ọhụ edekọrọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76. O biiri na New York n’oge ahụ ma mata ihe banyere Ọhụ ahụ” site n’aka ndị mgbasa ozi ọma na-eje ozi na mpaghara ahụ. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, o kwuru maka mmetụta ya niile banyere mkpughe nke a:

“A kuziiri m site na oge nwata m na enwere otu Eluigwe na otu Ọkụ ala mmụọ, ma agwara m na ndị ajọọ omume niile nwere otu ntaram ahụhụ ma ndị ezi omume otu ebube. …

“… Mgbe m gụrụ ọhụ ahụ … , o mepere uche m ma nye m nnukwu ọńụ, o yiri m na Chineke onye kpughere ụkpụrụ ahụ nye mmadụ maara ihe, onye ezi omume ma bụrụ onye eziokwu, nwee niime ya ma njirimara ndị kachasị mma ma ezigbo akọ na uche na mmata ihe, ọ dịịrị m ka Ọ na-anọgide jiri ma ịhụnaanya, ebere, ikpe ziri ezi na ikpe, ma o metụrụ m ịhụ Onyenwe anyị naanya karịa ka m naara rịị eme niime ndụ m.”1

“Ọhụ ahụ [bụ] mkpughe nke nyere ìhè karịa, eziokwu karịa na ụkpụrụ karịa mkpughe ọbụla enwere niime akwụkwọ ọbụla ọzọ anyị gụworo na mbụ. Ọ na-eme ka anyị ghọta nụzọ doro anya ọnọdụ anyị nọ na ya ugbu a, ebe anyị si bịa, ihe kpatara anyị si nọrọ ebe a, na ebe anyị na-aga. Nwoke ọbụla nwere ike mara site na mkpughe ahụ ihe akụkụ nke ya na ọnọdụ ya ga-abụ.”2

“Tupu mụ ahụ Josef ekwuru m na ọ gbasaghị m afọ ole ọ gbara, ma ọ bụ otu o si bụrụ nwata; achọghị m ịma ihe o yiri—ma ntụtụ isi ya o toro ogologo ma ọ bụ dị mkpụmkpụ; nwoke ahụ hụrụ mkpuhe ahụ [ọhụ edekọrọ niime nkeji 76] bụ onye amụma nke Chineke. A maara m ya n’onwe m.”3

Phebe Crosby Peck

Mgbe Phebe Peck nụrụ Josef na Sidney kuziri maka “Ọhụ ahụ,” o biiri na Missouri ma na-azụlite ụmụ ise dị ka nne naanị ya. Ọhụ ahụ metụtara ya ma kpaliemmụọ ya nke ukwuu nke mere na o dere ihe ndị a sotere iji kesaa ihe ọ mụtaworo ya na ezi na ụlọ ukwu ya:

“Onyenwe anyị na-ekpughe ihe omimi niile nke Alaeze nke eluigwe nye Ụmụ ya. … Josef Smith na Sidney Rigdon bịara leta anyị oge spring gara aga, ma anyị nwere ọtụtụ nzukọ jupụtara n’ọńụ mgbe ha nọọrọ ebe a, ma anyị nwebuuru ọtụtụ ihe omimi ekpughere nye anya anyị, nke nyere m nnukwu nkasi obi. Anyị nwere ike ịhụ mgbadata nke Chineke n’ịkwado ọtụtụ nnukwu ụlọ nke udo maka ụmụ ya. Ma onye ọbụla na-agaghị anata uju nke ozi ọma ma guzoro dị ka dike ndị agha nihe nke Kraịst agaghị ebi niihu nke Nna na Ọkpara Mana enwere ebe akwadoro maka ndị niile ndị na-adịghị anata, mana ọ bụ ebe ebube kacha dị obere karịa ibi niime alaeze Selestịal. Agaghị m anwa ikwu ihe ọbụla ọzọ gbasara ihe ndị a ebe a na-ebipụtala ha ugbu a ma na-aganiihu irute ndị bi n’ụwa. Ma eleghị anya i ga-enwe ohere nke ịgụ ihe nye onwe gị, ma ọ bụrụ i mee otu a, olileanya m bụ na unu ga-agụ jiri obi kpachapụrụ anya na nke jupụtara n’ekpere, niihi ihe ndị a tozuru oke ịmata maka ha. Ma enwere m ọchịchọ na i nwere ike chọgharịa niime ha, niihi na ọ bụ ihe ahụ nke na-eduba anyị n’obi ụtọ ma n’ụwa nke a na niime ụwa nke na-abịa abịa.”4

Hụba ama

  1. “Okwu niile,” Deseret News, Me 27, 1857, 91.

  2. Deseret News, Aug. 3, 1881, 481; lee kwa Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Wilford Woodruff (2004), 120–21.

  3. “Okwu niile,” Deseret Kwa Izu ụka, Sept. 5, 1891, 322.

  4. “Leta Phebe Crosby Peck nye Anna Jones Pratt,” Aug. 10, 1832, Ọba akwụkwọ Agụgụala Nzukọ nsọ, Obodo ukwu Salt Lake; nsupe na akara edemede emelitere.